Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2026 › 14 Novemba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 14 Novemba 2026
Satọdee · Izu nke 32 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Satọdee nke izu nke 32 nke Oge Nkịtị
Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Ncheta Satọdee nke Nwaagbọghọ Meri Agọziri Agọzi · Ncheta a na-ahọrọ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
5Onye m hụrụ nʼanya, i kwesiri ntụkwasị obi nʼihe ọbụla nke ị na-emere ụmụnna, ọ bụ ezie na ha bụ ọbịa nye gị. 6Ha akọọlara nzukọ banyere ịhụnanya gị. Biko, mgbe ha na-apụ, nyekwara ha aka nʼije ha nʼụzọ ga-enye Chineke otuto. 7Ọ bụ nʼihi aha ahụ ka ha biliri ije, na-anaraghị enyemaka ọbụla site nʼaka ndị na-ekweghị ekwe. 8Nke a mere o ji kwesi ekwesi na anyị ga-elekọta ndị dị otu a anya ka anyị bụrụ ndị so ha na-ejikọta aka nʼotu nʼọrụ eziokwu ahụ.
Abụ Ọma nzaghachi
1Toonu Onyenwe anyị. Onye a gọziri agọzi ka nwoke ahụ bụ onye na-atụ egwu Onyenwe anyị; onye na-enwe oke mmasị idebe iwu ya niile. 2Ụmụ ya ga-abụ ndị dị ike nʼala ahụ; ọgbọ ndị na-eme ihe ziri ezi ga-abụ ndị a gọziri agọzi. 3Akụnụba na-adịgide nʼụlọ ya; ezi omume ya na-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi. 4Ìhè na-enwuru ndị na-eme ihe ziri ezi, ọ bụladị nʼime ọchịchịrị, nyekwa ndị na-eme amara, ndị obiọma na ndị ezi omume. 5Ihe ọma ga-abịara onye ahụ na-eme ebere na-ejikwa obi ya agbazinye ndị mmadụ ihe, onye na-eji ikpe ziri ezi arụ ọrụ ya niile. 6Nʼezie, agaghị ewezuga ya nʼọnọdụ ya; a ga-echeta onye ezi omume ruo mgbe ebighị ebi.
Oziọma
1Mgbe ahụ ọ tụụrụ ha ilu a iji gosi ha mkpa ọ dị ikpe ekpere na-esepụghị aka, 2ọ sịrị, “O nwere otu ọkaikpe bi nʼotu obodo ma ọ naghị atụ egwu Chineke. Ọ naghị asọpụkwara mmadụ. 3Nʼobodo ahụkwa, e nwere otu nwanyị di ya nwụrụ anwụ nke na-abịakwute ya, na-asị ya, ‘Kpepụta m nʼaka ndị na-emegide m.’ 4“Na mmalite, ọ chọghị, ma nʼikpeazụ, ọ gwara onwe ya sị, ‘Ọ bụ eziokwu na anaghị m atụ egwu Chineke maọbụ sọpụrụ mmadụ. 5Ma nʼihi na nwanyị a di ya nwụrụ anwụ nọgidere na-enye m nsogbu, aga m ahụ na o nwetara ikpe ziri ezi, ka ọ kwụsị inye m nsogbu site na ọbịbịa ọ na-abịa.’ ” 6Ya mere Onyenwe anyị sịrị, “Gerenụ ihe ọkaikpe nke na-eme ajọ omume na-ekwu. 7Ọ bụ na Chineke agaghị ekpepụta ndị ahụ ọ họpụtara, bụ ndị na-akpọku ya ehihie na abalị? Ọ ga-anọ tee anya nʼinyere ha aka? 8Asị m unu, ọ ga-eme ngwangwa hụ na ha nwetara ikpe ziri ezi. Ma otu ọ dị, mgbe Nwa nke Mmadụ ga-abịa, ọ ga-ahụkwa ndị nwere okwukwe nʼime ụwa?”
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde A, afọ ụbọchị izu II.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike