Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2026 › 12 Novemba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 12 Novemba 2026

Tọọzdee · Izu nke 32 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Tọọzdee nke izu nke 32 nke Oge Nkịtị

Ncheta · Agba ofufe: uhie

Onye nsọ Josafat, Bishọp na Onye nwụrụ nʼihi okwukwe · Ncheta

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Flm 1:7–20

7Ịhụnanya gị na-enye m oke ọṅụ na ịgbaume, ezi nwanna m, nʼihi na emeela ka ndị nsọ nwee ume ọhụrụ site nʼinyeaka gị. 8Ọ bụ ezie na-enwere m ike nʼime Kraịst inye gị iwu banyere ihe kwesiri ka i mee, ma agaghị m eme otu a. 9Kama, ọ kaara m mma site na ndabere nke ịhụnanya, ịrịọ gị ya dị ka arịrịọ. Ee, ọ bụ mụ Pọl, agadi nwoke ahụ na onye mkpọrọ nʼihi Kraịst Jisọs na-arịọ gị arịrịọ a. 10Biko, arịọ m gị nʼisi Onisimọs, onye e mere ka ọ bụrụ nwa m oge m nọ nʼụlọ mkpọrọ. 11Na mbụ, o nweghị uru ọbụla ọ baara gị, ma ugbu a, ọ baara mụ na gị uru. 12Ana m ezighachiri gị ya ugbu a, ya bụ, onye bụ obi m ka m na-ezitere gị. 13Ọ gụsịrị m agụụ ike ime ka mụ na ya nọdụ nʼebe a, ka o were ọnọdụ gị na-ejere m ozi ọ bụladị dị ka m nọ na mkpọrọ nʼihi oziọma. 14Ma, a chọghị m ime ihe ọbụla na-enwetaghị nkwenye gị, ka ọ ghara ịdị ka i mere obiọma gị na mmanye. Kama, achọrọ m ka i mee ihe si gị nʼobi pụta. 15Ma eleghị anya, ọ bụ nʼihi nke a ka eji kewapụ ya nwa oge nta site nʼebe ị nọ, bụ ka i mesịa nweghachi ya ebighị ebi. 16Ọ bụghịkwa ohu ọzọ, kama ọ karịrị ohu, maka ọ dịka nwanna a hụrụ nʼanya, ọkachasị nʼebe mụ onwe m nọ, ma ọ ga-abụkwara gị karịchasịa, ma nʼanụ ahụ nakwa nʼime Onyenwe anyị. 17Nʼihi nke a, ọ bụrụ na ị gụrụ m dị ka onye nnwekọ ihe, nabata ya dị ka ị ga-esi nabata m. 18Biko, ọ bụrụ na o mejọrọ gị nʼụzọ ọbụla, ọ bụrụkwa na o ji ụgwọ ọbụla, gụọ ya dị ka ụgwọ m ji gị. 19Mụ bụ Pọl ji aka m dee nke a; aga m akwụghachi gị. Ọ bakwaghị uru ichetara gị ụgwọ i ji m. Nʼihi na ụgwọ i ji m bụ gị onwe gị. 20Nwanna m, mere m ihe a m na-arịọ gị nʼihi Onyenwe anyị. Mekwa ka obi m dị ọhụrụ nʼime Kraịst.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 146:7–10

7Ọ na-ekpe ikpe ziri ezi nye ndị a na-akpagbu na-enyekwa ndị agụụ na-agụ nri. Onyenwe anyị na-eme ka ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ nwere onwe ha, 8Onyenwe anyị na-emeghe anya ndị kpuru ìsì, Onyenwe anyị na-akwagide ndị niile dara mba, Onyenwe anyị hụrụ ndị ezi omume niile nʼanya. 9Onyenwe anyị na-echebe ndị ọbịa, na-elekọtakwa ndị na-enweghị nna na ndị di ha nwụrụ anwụ, ma ọ na-eme ka ihe ghara ịgara ndị ajọ omume nke ọma. 10Onyenwe anyị na-achị ruo ebighị ebi, Chineke gị, o Zayọn, site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. Toonu Onyenwe anyị.

Oziọma

Luk 17:20–25

20Ma mgbe ndị Farisii jụrụ ya sị, Olee mgbe alaeze Chineke ga-abịa? O kwuru, “Ọbịbịa alaeze Chineke agaghị a bụ nʼụzọ a ga-eji anya efu hụ ya. 21Ha agaghịkwa asị, ‘Lee, ọ nọ nʼebe a,’ maọbụ, ‘nʼebe ahụ,’ nʼihi nʼezie, alaeze Chineke nọ nʼetiti unu. ” 22Mgbe ahụ, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, “Oge na-abịa mgbe ọ ga-agụsi unu agụụ ike ịhụ otu nʼime ụbọchị nke Nwa nke Mmadụ, ma unu agaghị ahụ ya. 23Ha ga-asị unu, ‘Lee, nʼebe ahụ,’ maọbụ, ‘Lee, nʼebe a,’ unu agala, unu esokwala ha. 24Nʼihi na Nwa nke Mmadụ nʼụbọchị ya ga-adị ka amụma nke eluigwe nke na-enye ìhè na mbara eluigwe site nʼotu ebe ruo nʼebe nke ọzọ. 25Ma ọ ghaghị ibu ụzọ hụọ ọtụtụ ahụhụ, ọgbọ a ga-ajụkwa ya.

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde A, afọ ụbọchị izu II.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike