Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2026 › 11 Novemba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 11 Novemba 2026

Wenezdee · Izu nke 32 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Wenezdee nke izu nke 32 nke Oge Nkịtị

Ncheta · Agba ofufe: ọcha

Onye nsọ Matin nke Tours, Bishọp · Ncheta

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Taị 3:1–7

1Chetara ndị nke gị ka ha doo onwe ha nʼokpuru ndịisi na ndị ọchịchị, ka ha rubere ha isi, dịkwa njikere ịrụ ọrụ ọma ọbụla. 2Gwa ha ka ha ghara ikwulu onye ọbụla, ka ha gharakwa ịlụ ọgụ, kama, ka ha bụrụ enyi mmadụ niile, na-egosikwa ịdị nwayọọ ha nʼebe mmadụ niile nọ. 3Nʼihi na mbụ, anyị onwe anyị bụ ndị nzuzu, ndị na-enupu isi, na ndị na-enweghị uche. Anyị bụ ohu agụụ ihe ọjọọ, na ihe ụtọ dị iche iche. Anyị biri ndụ obi ọjọọ na ekworo, na ịkpọrịta onwe anyị asị. 4Ma mgbe obiọma na ịhụnanya Chineke Onye nzọpụta anyị pụtara ihe, 5ọ zọpụtara anyị, ma ọ bụghị nʼihi ezi ihe ndị anyị mere, kama ọ bụ site nʼebere ya. Ọ zọpụtara anyị site na nsacha nke ịmụ ọzọ na nnwogharị nke Mmụọ Nsọ, 6onye ọ wụsara anyị nʼuju site nʼOnye nzọpụta anyị bụ Jisọs Kraịst, 7ka ọ bụrụ na ebe e sitere nʼamara gụọ anyị dịka ndị ezi omume, anyị ga-abụ ndị nketa, ndị nwere olileanya ndụ ebighị ebi.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 23:1–6

1Abụ Ọma Devid. Onyenwe anyị na-azụ m dịka atụrụ, ọ dịghị ihe akọrọ m. 2Ọ na-eme ka m dinaa ala nʼebe ahịhịa ndụ na-eto, ọ na-edugharị m nʼakụkụ mmiri dị jụụ, 3ọ na-atụte mkpụrụobi m. Ọ na-edu m nʼụzọ niile nke ezi omume nʼihi aha ya. 4A sịkwarị na m na-aga ije, na ndagwurugwu nke ọchịchịrị ọnwụ, agaghị m atụ egwu ihe ọjọọ ọbụla; nʼihi na ị nọnyeere m, mkpọrọ gị na mkpanaka gị na-akasị m obi. 5Ị na-akwado tebul nʼihu m, nʼanya ndị iro m. I tere isi m mmanụ iko m na-ejubiga oke. 6Nʼezie, ịdị mma na ebere ga-agbaso m ogologo ụbọchị niile nke ndụ m, m ga-ebikwa nʼụlọ Onyenwe anyị mgbe niile ebighị ebi.

Oziọma

Luk 17:11–19

11Ka ọ na-aga Jerusalem, o sitere nʼụzọ dị nʼagbata Sameria na Galili. 12Mgbe ọ banyere nʼotu obodo nta, ndị ekpenta iri sitere nʼebe dị anya zute ya. 13Ha tiri mkpu nʼoke olu sị, “Jisọs nna anyị ukwuu, mere anyị ebere.” 14Mgbe ọ hụrụ ha, ọ sịrị ha, “Gaanụ gosi ndị nchụaja onwe unu.” Dị ka ha na-aga, e mere ka ha dị ọcha. 15Mgbe otu nʼime ha chọpụtara na a gwọọla ya, ọ laghachiri azụ, jiri oke olu na-eto Chineke. 16Ọ dara nʼala nʼụkwụ ya, kelee ya. Ọ bụ onye Sameria. 17Jisọs jụrụ sị, “Ọ bụghị mmadụ iri ka e mere ka ha dị ọcha, ebeekwanụ ka itoolu ndị ọzọ nọ? 18Ọ bu naanị onye mba ọzọ a lọghachiri inye Chineke otuto?” 19Mgbe ahụ, ọ sịrị ya, “Bilie, laa, okwukwe gị agwọọla gị.”

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde A, afọ ụbọchị izu II.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike