Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2026 › 13 Novemba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 13 Novemba 2026

Fraịdee · Izu nke 32 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Fraịdee nke izu nke 32 nke Oge Nkịtị

Ụbọchị izu · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Obubu ọnụ na nchegharị

Ụbọchị nchegharị

Fraịdee ọ bụla bụ ụbọchị nchegharị; ọgbakọ ndị bishọp ọ bụla na-ekpebi otú a ga-esi debe ya: izere anụ ma ọ bụ omume nchegharị ọzọ. Obubu ọnụ na-ejikọ ndị dị afọ 18 ruo 59, izere anụ site nʼafọ 14.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

2Jọn 1:4–9

4Apụghị m ịkọ ụdị aṅụrị m nwere mgbe m hụrụ na ụfọdụ ụmụ gị na-ebi ndụ ịgbaso eziokwu dịka ihe Nna nyere anyị nʼiwu. 5Ma ugbu a, ezi nwanyị, ọ bụghị iwu ọhụrụ ka m na-edere gị kama nke ahụ e nyere anyị site na mmalite. Ana m arịọ ka anyị hụrịta ibe anyị nʼanya. 6Nke a bụ ịhụnanya ahụ: ka anyị na-ejegharị nʼirube isi nʼiwu ya niile. Dịka unu si nụ ya site na mmalite, unu ahapụkwala ijegharị nʼime ya. 7Nʼihi na ọtụtụ ndị nduhie apụọla baa nʼụwa, bụ ndị na-adịghị ekwenye na Jisọs Kraịst bịara nʼoyiyi mmadụ. Onye ọbụla dị otu a bụ onye nduhie bụrụkwa onye na-emegide Kraịst. 8Lezienụ anya, ka unu ghara itufu ụgwọ ọrụ nke anyị dọgburu onwe anyị nʼọrụ maka ya, kama ka unu nata ụgwọ ọrụ unu nʼuju. 9Onye ọbụla na-adịghị anọgide nʼozizi Kraịst, nke na-esite na ya na ewezuga onwe ya, enweghị Chineke. Ma onye ọbụla na-anọgide nʼozizi ahụ nwere Nna na Ọkpara ya.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 119:1–2, 10–11, 17–18

1Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị ụzọ ha na-enweghị ihe ịta ụta ọbụla, ndị na-ejegharị dịka iwu Onyenwe anyị si dị. 2Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị na-edebe ụkpụrụ ya ma jirikwa obi ha niile na-achọsi ya ike. 10Eji m obi m niile na-achọsi gị ike. Ekwela ka m kpafuo site nʼihe niile i nyere nʼiwu. 11Ezoola m okwu gị niile nʼobi m, igbochi m imehie imegide gị. 17Meere ohu gị ihe ọma, ka m nwe ike dị ndụ; aga m erubere okwu gị isi. 18Kpughee anya m abụọ ka m hụ oke ihe ebube niile dị iche iche dị nʼime okwu gị.

Oziọma

Luk 17:26–37

26“Dị ka ọ dị nʼụbọchị Noa, otu a ka ọ ga-adịkwa nʼụbọchị Nwa nke Mmadụ. 27Ha nọ na-eri na-aṅụ, na-alụ nwunye na-ekekwa ụmụ ha di, ruo mgbe Noa banyere nʼụgbọ mmiri. Oke iju mmiri ahụ bịakwara laa ha nʼiyi. 28“Otu a ka ọ dịkwa nʼoge Lọt. Ha nọ na-eri, na-aṅụ, na-azụrịtakwa ahịa, na-akụ mkpụrụ, na-arụkwa ụlọ. 29Ma nʼụbọchị ahụ Lọt si nʼobodo Sọdọm pụta, ọkụ na nkume dị ọkụ sitere nʼeluigwe zoo ka mmiri, laa ha niile nʼiyi. 30“Otu a ka ọ ga-adịkwa nʼụbọchị a ga-eme ka Nwa nke Mmadụ pụta ìhè. 31Nʼụbọchị ahụ, onye ọbụla nọ nʼelu ụlọ, ma ihe ya dị nʼime ụlọ, arịtukwala ịba nʼime ụlọ iburu ngwongwo ndị ahụ. Nʼotu aka ahụ, onye ọbụla nọ nʼubi, ya ghara ịlọghachita. 32Chetakwanụ nwunye Lọt. 33Onye ọbụla chọrọ iche ndụ ya nche ka ọ ga-efunarị, ma onye ọbụla na-atụfu ndụ ya ga-echebe ya. 34Asị m unu, nʼanyasị ahụ mmadụ abụọ ga-edina nʼotu akwa, a ga-ewepụ otu nʼime ha hapụ onye nke ọzọ. 35Ụmụ nwanyị abụọ ga na-akwọ ọka nʼotu ebe, a ga-ewere otu ma hapụ nke ọzọ.” 36Ụmụ nwoke abụọ ga-anọ nʼubi, a ga-ewere otu onye hapụ nke ọzọ. 37Ha jụrụ ya sị, “Olee ebe, Onyenwe anyị?” Ọ sịrị ha, “Ebe ọbụla ozu dị, ka udele na-ezukọta.”

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde A, afọ ụbọchị izu II.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike