Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2026 › 12 Novemba

Kalenda Ọtọdọks · 30 Ọktoba (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 12 Novemba 2026

Tọọzdee · Izu nke 24 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 6

Mmemme na ndị nsọ

Hieromartyr Zenobios, Bishop of Aegea, and his sister Zenobia in Cilicia († 285)

Obubu ọnụ

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

1Te 5:1–8

1Ugbu a, ụmụnna, banyere oge na mgbe ihe ndị a ga-emezu. Echeghị m na ọ dị mkpa i degara unu akwụkwọ. 2Dị ka unu maara nke ọma na ụbọchị Onyenwe anyị ga-abịa dị ka onye ohi si abịa nʼabalị. 3Mgbe ha ga na-asị udo, na nchekwa dị, mgbe ahụ, na mberede, mbibi ga-abịakwasị ha dị ka ihe mgbu sị adakwasị nwanyị ime na-eme, nke ga-eme ka onye ọbụla ghara inwe ike ịgbapụ. 4Ma unu onwe unu, ụmụnna, anọghị nʼọchịchịrị, nke ụbọchị ahụ ga-abịakwasị unu na mberede dịka onye ohi. 5Unu niile bụ ụmụ nke ìhè na ụmụ nke ehihie, anyị abụkwaghị nke ọchịchịrị maọbụ nke abalị. 6Nʼihi nke a, ka anyị ghara ịdị na-arahụ ụra dị ka ndị ọzọ, kama ka anyị mụrụ anya ka anya dokwaa anyị. 7Nʼihi na abalị bụ mgbe ndị na-arahụ ụra ji arahụ ụra. Ọ bụkwa nʼabalị ka ndị mmanya na-egbu na-aṅụbiga mmanya oke. 8Ma ebe anyị niile bụ ndị nke ihe, ka anyị bụrụ ndị anya doro, ndị yi okwukwe na ịhụnanya dịka ihe ikpuchi obi, yikwasịkwa olileanya nke nzọpụta dị ka okpu igwe.

Oziọma

Luk 11:14–23

14Otu mgbe, ọ na-achụpụ mmụọ ọjọọ nke dara ogbi, mgbe mmụọ ọjọọ ahụ pụrụ, onye ogbi ahụ kwuru okwu. Nke a juru igwe mmadụ ahụ anya. 15Ma ụfọdụ nʼime ha sịrị, “Ọ bụ site nʼike Belzebub eze ndị mmụọ ọjọọ ka o ji achụpụ mmụọ ọjọọ.” 16Ndị ọzọ, iji nwalee ya, sị ya gosi ha ihe ịrịbama nke si nʼeluigwe. 17Ma ebe ọ bụ na ọ maara ihe ha na-eche, ọ sịrị ha, “Alaeze ọbụla kewaranụ megide ibe ya, ga-atọgbọrọ nʼefu, ezinaụlọ ọbụla nke kewakwara megide ibe ya ga-adakpọ. 18Ọ bụrụ na ekwensu ekewa megide onwe ya, alaeze ya ọ ga-esi aṅaa guzosie ike? Unu na-asị na m na-achụpụ mmụọ ọjọọ site nʼike Belzebub. 19Ugbu a, ọ bụrụ na m sitere nʼike Belzebub na-achụpụ mmụọ ọjọọ, ọ bụ site nʼike onye ka ụmụ unu ji na-achụpụ ha? Ya mere, ha ga-abụ ndị ikpe unu. 20Ma ọ bụrụ na m ji ike mkpịsịaka Chineke na-achụpụ mmụọ ọjọọ, mgbe ahụ alaeze Chineke abịarutela nʼebe unu nọ. 21“Mgbe nwoke siri ike ji ngwa agha chekwa obi ya, ihe o nwere ga-adịgidere ya nʼudo. 22Ma ọ bụrụ na onye ọzọ ka ya ike alụso ya ọgụ merie ya, ọ ga-anara ya ngwa agha niile bụ ihe ntụkwasị obi ya, kesakwaa ihe ọ kwatara nʼụlọ dike ahụ. 23“Onye ọbụla na-adịnyeghịrị m na-emegide m. Onye ọ bụlakwa na-adịghị eso m ekpokọta, na-ekposa ekposa.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 30 Ọktoba na kalenda nzukọ bụ 12 Novemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike