Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2026 › 10 Novemba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 10 Novemba 2026
Tiuzdee · Izu nke 32 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Tiuzdee nke izu nke 32 nke Oge Nkịtị
Ncheta · Agba ofufe: ọcha
Onye nsọ Leo Onye Ukwu, Pope na Onye nkuzi nke Chọọchị · Ncheta
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
1Nʼakụkụ nke gị, na-akụzi ihe kwesiri eziokwu nke okwukwe. 2Gwa ndị okenye nwoke ka ha nwee anya udo, ka ha nwee akọnuche zuruoke, ka ha bụrụ ndị kwesiri nsọpụrụ, ndị okwukwe ha siri ike, ndị na-ahụ ibe ha nʼanya, na ndị nwekwara ntachiobi. 3Nʼotu aka ahụ, gwa ndị okenye nwanyị ka ha na-eme omume dị ka ụmụ nwanyị dị nsọ. Ka ha ghara ịbụ ndị na-agba asịrị maọbụ ohu nke ịṅụbiga mmanya oke. Kama ha na-akụzi ihe dị mma. 4Ha ga-esi otu a kuziere ụmụ agbọghọ ka ha ga-esi hụ di ha na ụmụ ha nʼanya. 5Ka ha bụrụkwa ndị akọnuche ha zuruoke, ndị dị ọcha nʼobi, ndị na-edozi ezinaụlọ di ha, ndị na-eme ebere, ndị na-edo onwe ha nʼokpuru di ha, ka onye ọbụla ghara ikwulu okwu Chineke. 6Nʼotu ụzọ ahụ kwa, gbaakwa ụmụ okorobịa ume ka ha jide onwe ha. 7Nʼihe niile ị na-eme, mee onwe gị ihe ịma atụ ndị ọzọ ga na-eṅomi nʼime ezi omume. Na nkuzi gị niile, gosikwa izuoke na ikwesi ntụkwasị obi. 8Ka ozi gị bụrụ nke kwụ ọtọ mmadụ apụghị ịma ikpe, ka ihere mee onye na-agbagha gị okwu, ebe ọ bụ na onweghi ihe ọjọọ ọ ga-ekwu gbasara anyị. 11Nʼihi na Chineke emela ka amara ya nke wetaara mmadụ niile nzọpụta pụta ìhè. 12Ọ bụkwa amara a na-akụziri anyị ka anyị jụ ndụ asọpụrụghị Chineke na nke ịgbaso ọchịchọ ọjọọ dị nʼụwa, kama ka anyị bie ndụ dị ka ndịisi zuruoke na ndụ ezi omume, nakwa ịtụ egwu Chineke nʼọgbọ nke oge a. 13Otu a ka anyị ga-esi na-eche olileanya anyị dị ngọzị bụ ọbịbịa nke otuto nke Chineke anyị dị ukwuu, na Onye nzọpụta anyị bụ Jisọs Kraịst. 14Ọ bụ ya jiri onwe ya chụọ aja nʼihi anyị, ka ọ gbapụta anyị site nʼajọ omume anyị niile, na ido ndị ga-abụ ndị nke ya ọcha nye onwe ya, ndị ọ na-agụ agụụ ime ihe dị mma mgbe niile.
Abụ Ọma nzaghachi
3Tụkwasị Onyenwe anyị obi meekwa ihe ziri ezi; biri nʼala na nchebe, rijuokwa afọ. 4Ka ihe Onyenwe anyị tọọ gị ụtọ. Ọ ga-enyekwa gị ihe niile bụ ọchịchọ nke obi gị. 18Ndị na-enweghị ịta ụta na-ebi ndụ ha nʼokpuru nlekọta Onyenwe anyị, ihe nketa ha ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 23Ọ bụrụ na Onyenwe anyị nwere mmasị na ndụ mmadụ, ọ ga-eme ka nzọ ụkwụ ya guzosie ike; 27Site nʼihe ọjọọ pụọ, mee ezi ihe, mgbe ahụ, i ga-ebi nʼala a ruo mgbe ebighị ebi. 29ndị ezi omume ga-eketa ala ahụ dịka ihe nketa ha, ha ga-ebikwa nʼime ya ruo mgbe ebighị ebi.
Oziọma
7“Ọ bụ onye nʼime unu nke nwere ohu onye si ebe ọ gara rụọ ọrụ maọbụ ịzụ atụrụ lọbata, ga-asị ya, ‘Mee ngwangwa nọdụ ala rie nri’? 8Ọ gaghị asị ya, ‘Siere m nri ọsịịsọ, kwadoo onwe gị jere m ozi ka m na-eri na aṅụkwa ihe ọṅụṅụ; emesịa ị ga-eri nri ma ṅụọ ihe ọṅụṅụ nke gị’? 9Ọ ga-ekele ohu ahụ nʼihi na ọ rụrụ ọrụ o kwesiri ịrụ? 10Nʼotu aka ahụ, mgbe unu rụchara ọrụ niile unu kwesiri ịrụ, ihe unu ga-ekwu bụ, ‘Anyị bụ ụmụ ohu na-ekwesighị ekwesi, anyị emeela ihe anyị kwesiri ime.’ ”
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Leo Onye Ukwu, Pope na Onye nkuzi nke Chọọchị
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde A, afọ ụbọchị izu II.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike