Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2026 › 9 Novemba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 9 Novemba 2026
Mọnde · Izu nke 32 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Nraranye Basilika Lateran
Mmemme · Agba ofufe: ọcha
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
ma ọ bụ: 1Kọ 3:9–11, 16–17
1Mgbe ahụ, nwoke ahụ mere ka m lọghachikwa nʼọnụ ụzọ ụlọnsọ ukwu ahụ. Ahụrụ m iyi nke na-asọ na-aga nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ (nʼihi na ihu ụlọnsọ ahụ chere ihu nʼọwụwa anyanwụ). Mmiri ahụ si nʼokpuru ụlọnsọ ukwu ahụ nʼakụkụ aka nri nke ebe ịchụ aja, nʼakụkụ ndịda ya na-asọpụta, 2O mere ka m si nʼọnụ ụzọ dị nʼugwu pụta, ma gaa nʼọnụ ụzọ nke ọwụwa anyanwụ, ebe m hụrụ mmiri ahụ ka o si na ndịda na-asọpụta. 8Ọ sịrị, “Iyi a na-asọ na-aga akụkụ ọwụwa anyanwụ, sọbanye nʼime Araba, tutu bịa sọbanye nʼosimiri nnu ahụ. Mgbe ọ sọbanyere nʼosimiri nnu ahụ, mmiri ya na-aghọ mmiri dị mma ọṅụṅụ 9Ọtụtụ ihe e kere eke dị ndụ ga-ebi nʼebe ọbụla mmiri a na-asọ aga. Azụ dị ukwuu ga-ejupụta nʼebe ahụ, nʼihi na mmiri a na-asọbanye nʼebe ahụ, na-eme ka mmiri osimiri ghọọ mmiri dị mma ịṅụ aṅụ. Ya mere, ihe niile dị nʼebe ọbụla mmiri a sọjere ga-adị ndụ. 12Mkpụrụ osisi dị iche iche ga-eto nʼakụkụ abụọ nke iyi ahụ. Akwụkwọ ha agaghị akpọnwụ akpọnwụ, mkpụrụ ga-adị nʼelu ha mgbe niile. Mkpụrụ ọhụrụ ga-adị nʼọnwa ọbụla, nʼihi na ọ bụ mmiri si nʼebe nsọ ahụ na-agba ha mmiri. Mkpụrụ ha ga-abụ nri, akwụkwọ ha ga-abụkwa maka ịgwọ ọrịa.”
Abụ Ọma nzaghachi
1Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ụmụ Kora. Nʼusoro olu abụ alamot. Otu Abụ. Chineke bụ ebe mgbaba anyị, na ike anyị, onye inyeaka anyị ka ọ bụ nʼoge nsogbu. 2Nʼihi ya, anyị agaghị atụ egwu, ọ bụladị mgbe ụwa niile na-emebi, maọbụ mgbe a na-ewezuga ugwu nʼọnọdụ ha, mee ka ha daba nʼoke osimiri. 3Nʼagbanyeghị na mmiri ya na-agba aghara, na-asụkwa ụfụfụ, maọbụ na ugwu niile na-eme mkpọtụ site nʼoke mbili elu ha. Sela 4Otu iyi dị nke na-asọbata na-eweta ọṅụ nʼime obodo Chineke, nʼime ebe obibi dị nsọ nke Onye kachasị ihe niile elu. 5Chineke bi nʼime ya, ọ gaghị ada; Chineke ga-enyere ya aka mgbe chi bọrọ. 7Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile nọnyere anyị; Chineke nke Jekọb bụ ebe mgbaba anyị e wusiri ike. Sela 8Bịa, hụrụ ihe ebube niile Onyenwe anyị mere, lee oke ịla nʼiyi niile o webatara nʼelu ụwa.
Oziọma
13Mgbe mmemme oriri Ngabiga nke ndị Juu na-abịaru nso, Jisọs gara Jerusalem. 14Nʼime ụlọnsọ ukwu, ọ hụrụ ndị na-ere ehi, na atụrụ na nduru. Hụkwa ndị nọdụrụ na tebul na-agbanwe ego. 15Ya mere, o jiri eriri mere ụtarị chụpụsịa ndị niile nọ na-ere ahịa nʼụlọnsọ ukwu ahụ, tinyekwara ehi na atụrụ ha. Ọ kwafusịrị mkpụrụ ego ndị ahụ na-agbanwe ego, kpugharịakwa tebul ha ihu. 16Ọ sịrị ndị ahụ na-ere nduru, “Wepụnụ ihe ndị a nʼebe a. Kwụsịnụ ime ụlọ Nna m ka ọ bụrụ ebe a na-azụ ahịa.” 17Ndị na-eso ụzọ ya chetara na e dere ya rịị nʼakwụkwọ nsọ, “Ihe banyere ụlọ gị na-anụ m ọkụ nʼobi.” 18Ma ndị Juu sịrị ya, “Olee ihe ịrịbama ị pụrụ igosi anyị na ikike i ji eme ihe ndị a.” 19Jisọs zara sị, “Kwatuonụ ụlọnsọ ukwu a, aga m ewughachikwa ya nʼabalị atọ.” 20Ndị Juu kwuru, “Ụlọnsọ ukwu a were anyị iri afọ anọ na isii ịrụ ya, ị ga-ewughachi ya nʼabalị atọ?” 21Ma ụlọnsọ o kwuru maka ya bụ ahụ ya. 22Ndị na-eso ụzọ ya chetara okwu ya a mgbe o siri nʼọnwụ bilie. Mgbe ahụkwa, ha kweere akwụkwọ nsọ ya na okwu niile Jisọs kwuru.
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde A, afọ ụbọchị izu II.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike