Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2026 › 10 Novemba
Kalenda Ọtọdọks · 28 Ọktoba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 10 Novemba 2026
Tiuzdee · Izu nke 24 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 6
Mmemme na ndị nsọ
Great Martyr Paraskeva (Piatnitsa) of Iconium (3rd C)
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
9Olee ụdị ekele anyị pụrụ ikele Chineke nʼihi akụkọ nyere anyị ọṅụ nʼihu Chineke anyị nʼihi unu. 10Ehihie na abalị niile, anyị na-arịọ ka anyị hụ unu ihu na ihu, ka anyị nwee ike tinyezuo ihe fọdụrụ nʼokwukwe unu. 11Ugbu a, ka Chineke Nna anyị na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst megheere anyị ụzọ ịbịakwute unu. 12Ka Onyenwe anyị meekwa ka unu baa ụba, ka unu babiga ụba oke nʼịhụnanya unu nwere nye ibe unu, na ndị ọzọkwa, dị ka ịhụnanya anyị si dị ukwuu nʼebe unu nọ. 13Ka ọ mee ka obi unu guzosie ike nʼịdị nsọ, na-enweghị ịta ụta ọbụla, nʼihu Chineke na Nna anyị, nʼọbịbịa nke Onyenwe anyị Jisọs ya na ndị nsọ ya niile.
Oziọma
1Ọ nọ nʼotu ebe na-ekpe ekpere, mgbe o kpesịrị ekpere, otu nʼime ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya, “Onyenwe anyị, kuziere anyị ikpe ekpere, dị ka Jọn kuziri ndị na-eso ụzọ ya.” 2Ọ sịrị ha, “Mgbe unu na-ekpe ekpere, sịnụ: “ ‘Nna, ka e doo aha gị nsọ ka alaeze gị bịa. 3Nye anyị taa nri nke ụbọchị anyị. 4Gbaghara anyị mmehie anyị, nʼihi na anyị na-agbaghara onye ọbụla mehiere megide anyị. Ekwela ka anyị daba nʼime ọnwụnwa.’ ” 5Ọ sịrị ha, “Onye nʼime unu nwere enyi, ga-agakwuru ya nʼetiti abalị sị ya, ‘Enyi m, biko gbazinye m ogbe achịcha atọ, 6nʼihi na otu enyi m bịara nʼụlọ m, ma enweghị m nri ọbụla nʼụlọ m nke m ga-enye ya.’ 7Ma ọ ga-esi nʼime ụlọ zaghachi sị, ‘Enyela m nsogbu, emechiela m ụzọ, mụ na ụmụ m alakpuola, enweghị m ike ibili ugbu a inye gị ihe ọbụla.’ 8Agwa m unu, ọ bụ ezie na ọ gaghị ebili nye ya ihe ọbụla nʼihi na ọ bụ enyi ya, kama nʼihi nsogbu ya, ọ ga-ebili nye ya ihe ọbụla dị ya mkpa. 9“Ya mere, agwa m unu, rịọọnụ, unu ga-arịọta, chọọnụ, unu ga-achọta, kụọkwanụ aka, a ga-emeghekwara unu ụzọ. 10Nʼihi na onye na-arịọ na-arịọta, onye na-achọ na-achọta, onye na-akụ aka nʼụzọ ka a ga-emeghekwara ụzọ.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 28 Ọktoba na kalenda nzukọ bụ 10 Novemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike