Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2026 › 7 Novemba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 7 Novemba 2026
Satọdee · Izu nke 31 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Satọdee nke izu nke 31 nke Oge Nkịtị
Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Ncheta Satọdee nke Nwaagbọghọ Meri Agọziri Agọzi · Ncheta a na-ahọrọ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
10Ana m aṅụrị ọṅụ dị ukwuu nʼime Onyenwe anyị nʼihi na unu mechara malite iche echiche ọzọ banyere m. Unu bu m nʼobi nʼeziokwu ma unu enwetaghị ohere izipụta ya. 11Ọ bụghị na m nọ nʼọnọdụ oke mkpa na ụkọ. Nʼihi na amụtala m otu m ga-esi jiri ọṅụ nọrọ nʼọnọdụ ọbụla. 12Amụtala m otu m ga-esi nọrọ mgbe ihe siri ike na mgbe ihe bara ụba. Amụtakwala m otu m ga-esi nwee afọ ojuju nʼọnọdụ ọbụla, maọbụ mgbe m na-anọ agụụ, maọbụ mgbe m rijuru afọ, maọbụ mgbe m nwere ihe dị ukwuu maọbụ nʼoge ụkọ. 13Nʼihi na apụrụ m ime ihe niile site nʼinyeaka onye na-enye m ike. 14Ma unu mere nnọọ nke ọma inyere m aka nʼọnọdụ nsogbu nke m nọ nʼime ya. 15Unu onwe unu ndị Filipai maara na mbido nke oziọma a, mgbe m hapụrụ Masidonia, na o nweghị nzukọ ọzọ nyere m aka nʼinye maọbụ ịnabata onyinye, ma e wezuga unu. 16Ọ bụladị mgbe m nọ na Tesalonaịka, unu ziteere m onyinye ihe karịrị otu ugbo, inyere m aka na mkpa m. 17Ọ bụghịkwa na m chọrọ onyinye unu, kama ana m achọ ka mkpụrụ unu ga-amịta baa ụba, bara unu uru. 18Ugbu a, enweela m ihe niile na-akpa m mkpa, nʼezie, enweela m karịa ihe na-akpa m. Onyinye unu nyere m, nke Epafroditọs wetara, egboola mkpa m niile. Onyinye ndị a dị ka aja na-esi isi ụtọ a chụụrụ Chineke, nke ọ na-anabatakwa nke ọma. 19Ọ bụ Chineke m ga-egboro unu mkpa unu niile, site nʼụlọakụ ebube ya nke eluigwe, nʼihi Kraịst Jisọs.
Abụ Ọma nzaghachi
1Toonu Onyenwe anyị. Onye a gọziri agọzi ka nwoke ahụ bụ onye na-atụ egwu Onyenwe anyị; onye na-enwe oke mmasị idebe iwu ya niile. 2Ụmụ ya ga-abụ ndị dị ike nʼala ahụ; ọgbọ ndị na-eme ihe ziri ezi ga-abụ ndị a gọziri agọzi. 5Ihe ọma ga-abịara onye ahụ na-eme ebere na-ejikwa obi ya agbazinye ndị mmadụ ihe, onye na-eji ikpe ziri ezi arụ ọrụ ya niile. 6Nʼezie, agaghị ewezuga ya nʼọnọdụ ya; a ga-echeta onye ezi omume ruo mgbe ebighị ebi. 8Obi ya siri ike, ọ gaghị atụ egwu ihe ọbụla; nʼikpeazụ, ọ ga-ele ndị na-akpọ ya asị anya na mmeri. 9Ọ gbasapụrụ aka ya nye ndị ogbenye onyinye dị iche iche, ezi omume ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi; a ga-ewere nsọpụrụ welie mpi ya elu.
Oziọma
9Agwa m unu, jirinụ akụnụba nke ajọ omume metara onwe unu ndị enyi, ka ọ ga-abụ na mgbe ọ na-adịghịkwa akụ unu nwere, ha ga-anabata unu nʼụlọ obibi ha ebighị ebi. 10“Onye ọbụla kwesiri ntụkwasị obi nʼihe dị ntakịrị, ga-ekwesikwa ntụkwasị obi nʼihe dị ukwuu. Onye na-ekwesikwaghị ntụkwasị obi nʼihe dị ntakịrị, agaghịkwa ekwesi ntụkwasị obi nʼihe dị ukwuu. 11Ọ bụrụ na unu abụghị ndị kwesiri ntụkwasị obi nʼakụ mmehie nke ụwa, onye ga-enyekwa ezi akụ nʼaka unu na ntụkwasị obi idebe? 12Ọ bụrụkwa na unu abụghị ndị kwesiri ntụkwasị obi nʼakụ onye ọzọ, onye ga-enye unu ihe nke bụ nke unu? 13“Ọ dịghị onye ọbụla pụrụ ife nna ukwu abụọ, nʼihi na ọ ga-achọ ịhụ otu nʼime ha nʼanya, kpọkwa nke ọzọ asị, maọbụ, sọpụrụ otu ma lelịa nke ọzọ anya. Otu a kwa i nweghị ike ife Chineke na akụ otu mgbe ahụ.” 14Mgbe ndị Farisii, bụ ndị hụrụ ego nʼanya nụrụ ihe ndị a, ha jiri ya mee ihe ọchị. 15Ọ sịrị ha, “Unu na-egosi onwe unu dị ka ndị ezi omume nʼihu ndị mmadụ ma Chineke maara obi unu. Nʼihi na ihe ndị mmadụ na-akpọ ihe dị oke mkpa bụ ihe rụrụ arụ nʼanya Chineke.
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde A, afọ ụbọchị izu II.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike