Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2026 › 2 Novemba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 2 Novemba 2026
Mọnde · Izu nke 31 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Ncheta ndị kwesịrị ntụkwasị obi niile nwụrụ anwụ (Ụbọchị Mkpụrụ obi niile)
Ncheta nkenke · Agba ofufe: odo odo
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
17Enweghị m udo, echezọkwaala m ihe ọganihu bụ. 18Nʼihi ya, ana m ekwu, “Ịma mma m ọbụla adịghịkwa. Agaghị m enwetakwa ihe ndị ahụ m lere anya na m ga-esi nʼaka Onyenwe anyị nweta.” 19Ana m echeta ahụhụ m, na mwagharị m, ya na ihe ilu na oluilu. 20Mgbe m na-echeta ya, obi m na-ada mba nʼime m. 21Ma ọ dị ihe m na-echeta nʼobi m nke na-eme ka m nwee olileanya. 22Ọ bụ nʼihi ịhụnanya dị ukwuu nke Onyenwe anyị na-emeghị ka anyị gwụsịa, nʼihi na obi ebere ya adịghị agwụ agwụ. 23Ha na-adị ọhụrụ ụtụtụ niile; ikwesi ntụkwasị obi gị bụ ihe kwudosiri ike. 24Mkpụrụobi m na-ekwu, “ Onyenwe anyị bụ oke m, nʼihi ya, aga m enwe nchekwube na ya.” 25Onyenwe anyị dị mma nʼebe ndị olileanya ha dị nʼime ya, e, nʼebe obi ahụ dị, nke na-achọsi ya ike. 26Ọ bụ ihe dị mma iji nwayọọ chere nzọpụta nke Onyenwe anyị.
Abụ Ọma nzaghachi
8Onyenwe anyị nwere obi ọmịiko na-emekwa amara. Ọ dịghị ewe iwe ọsịịsọ, o jupụtara nʼịhụnanya. 10ọ bụghị dịka mmehie anyị si dị ka ọ na-emeso anyị, ọ dịghị akwụghachi anyị dịka ajọ omume anyị si dị. 13Dịka nna si enwe obi ebere nʼebe ụmụ ya nọ, otu a ka Onyenwe anyị si enwe obi ebere nʼebe ndị na-atụ egwu ya nọ, 14nʼihi na ya onwe ya maara otu e si kpụọ anyị, ọ na-echeta na anyị bụ aja. 15Ebe mmadụ nọ, ụbọchị ya niile dị ka ahịhịa, ọ na-etopụta, na-awasa dịka okoko osisi ọhịa, 16ifufe na-efesi ya ike, ọ na-adakwa, adịghị echetakwa ya nʼọnọdụ mbụ ya. 17Ma ịhụnanya Onyenwe anyị na-adịgide site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi nʼetiti ndị na-atụ egwu ya. Ezi omume ya na-adịgidekwara ụmụ ụmụ ha,
Ihe ọgụgụ nke abụọ
51Ma geenụ ntị ka m gwa unu ihe omimi a! Ọ bụghị anyị niile na-aga ịnwụ, kama, a ga-enye anyị anụ ahụ ọhụrụ nke pụrụ iche. 52Nʼotu mgbe, nʼotu ntabi anya, mgbe a ga-afụ opi ike ikpeazụ. Nʼihi na opi ga-ada, a ga-eme ka ndị nwụrụ anwụ si nʼọnwụ bilite na-ereghị ure. A ga-agbanwekwa anyị. 53Nʼihi na a ghaghị ịgbanwe anụ ahụ anyị a nke na-anwụ anwụ, nyekwa anyị ahụ nke na-agaghị anwụ ọzọ. 54Mgbe ahụ nke a pụrụ ire ure ga-eyikwasị ereghị ure, nke a pụrụ ịnwụ anwụ ga-eyikwasị anwụghị anwụ. Mgbe ahụ, okwu ahụ e dere nʼakwụkwọ nsọ ga-emezu, okwu ahụ sịrị, “Elomiela ọnwụ, meriekwa ike ya niile.” 55“Ọnwụ, olee ebe mmeri gị dị? Ọnwụ, olee ebe ihe ụfụ gị dị?” 56Nʼihi na ihe ahụ ọnwụ ji agbata mmadụ bụ mmehie, ma ihe na-enye mmehie ike bụ iwu. 57Ka ekele dịrị Chineke onye na-enye anyị mmeri site nʼOnyenwe anyị Jisọs Kraịst.
Oziọma
ma ọ bụ: Jọn 12:23–26
25Nʼoge ahụ, Jisọs kwuru sị, “Nna, Onyenwe eluigwe na ụwa, ana m ekele gị, nʼihi na ị zonarịrị ndị ọkachamara eziokwu ahụ, ma kpughee ya nye ụmụntakịrị. 26E, Nna m, ọ tọrọ gị ụtọ ime ya nʼụzọ dị otu a. 27“Nna m enyefeela m ihe niile nʼaka. Ọ dịghị onye maara Ọkpara ahụ ma ọ bụghị Nna ya. Ọ dịkwaghị onye maara Nna karịa Ọkpara ahụ na ndị Ọkpara ahụ kwadoro igosi Nna ya. 28“Bịakwutenụ m unu niile ndị na-adọgbu onwe unu nʼọrụ, ndị e bokwasịrị ibu dị arọ. Aga m enyekwa unu izuike. 29Nyaranụ yoku nke m nʼolu unu, mụtakwanụ ihe site nʼaka m. Nʼihi na adị m nwayọọ, bụrụkwa onye dị umeala nʼobi. Unu ga-achọtakwara mkpụrụobi unu izuike. 30Nʼihi na yoku m dị mfe, ibu m adịghịkwa arọ.”
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde A, afọ ụbọchị izu II.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike