Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2026 › 1 Novemba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 1 Novemba 2026
Sọnde · Izu nke 31 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Ndị nsọ niile
Mmemme ukwu · Agba ofufe: ọcha
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
2Mgbe ahụ, ahụkwara m mmụọ ozi ọzọ ka o si nʼọwụwa anyanwụ na-apụta, akara Chineke dị ndụ dịkwa nʼaka ya. O tikuru ndị mmụọ ozi anọ ahụ mkpu, bụ ndị ahụ e nyere ike imekpa ụwa ahụ, ya na oke osimiri, 3na-asị, “Unu emebila ụwa maọbụ oke osimiri maọbụ osisi ọbụla tutu ruo mgbe anyị kachara ndị ohu niile nke Chineke anyị akara nʼegedege ihu ha.” 4Mgbe ahụ anụrụ m ọnụọgụgụ ndị a kara akara ahụ, ha dị narị puku mmadụ, na iri puku mmadụ anọ na anọ, bụ ndị sitere nʼebo niile nke Izrel. 9Mgbe ihe ndị a gasịrị, ahụrụ m oke igwe mmadụ, ndị dị ọtụtụ nʼọnụọgụgụ nke onye ọbụla na-apụghị ịgụta ọnụ. Ha sitere na mba dị iche iche na ebo dị iche iche na ndị niile na asụsụ dị iche iche, na-eguzo nʼihu ocheeze ahụ na nʼihu Nwa Atụrụ ahụ. Ha yikwasịrị onwe ha uwe ọcha, jirikwa igu nkwụ nʼaka ha. 10Ma ha ji oke olu na-eti mkpu na-asị, “Nzọpụta dịrị Chineke anyị, onye na-anọkwasị nʼocheeze ahụ, dịkwara Nwa atụrụ ahụ.” 11Ndị mmụọ ozi niile ahụ guzoro ocheeze ahụ gburugburu, ha na ndị okenye ahụ na anụ anọ ahụ dị ndụ. Ha dara, kpuo ihu ha nʼala nʼihu ocheeze ahụ feekwa Chineke ofufe, 12na-asị, “Amen! Ngọzị niile na otuto niile, na amamihe niile na ekele niile na nsọpụrụ niile na ike niile na ume niile, dịrị Chineke anyị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen.” 13Mgbe ahụ, otu nʼime ndị okenye ahụ zara m sị, “Ị maara ndị ahụ, ndị a e gbokwasịrị uwe ọcha ahụ, ebee ka ha siri pụta?” 14Asịrị m, “Onyenwe m, ọ bụ gị maara.” Ọ sịrị m, “Ndị a bụ ndị sitere nʼime oke mkpagbu ahụ pụta. Ha bụ ndị sachara uwe ha, mee ha ka ha dịrị ọcha site nʼọbara Nwa Atụrụ ahụ.
Abụ Ọma nzaghachi
1Abụ Ọma Devid. Ụwa na ihe niile dị nʼime ya bụ nke Onyenwe anyị; ụwa na ndị niile bi nʼime ya. 2Ọ tọrọ ntọala ya nʼime oke osimiri niile, o mekwara ka o guzosie ike. 3Onye bụ onye ahụ nwere ike irigo nʼelu ugwu Onyenwe anyị? Onye nwere ike ịbata guzo nʼime ụlọnsọ ya? 4Ọ bụ onye aka ya emeghị ihe ọjọọ, obi ya dịkwa ọcha, onye na-adịghị atụkwasị obi na chi arụsị, maọbụ ṅụọ iyi aghụghọ. 5Ha ga-anata ngọzị site nʼaka Onyenwe anyị, natakwa mkpepụta site nʼaka Chineke Onye nzọpụta ha. 6Otu a ka ọ ga-adịrị ọgbọ ndị ya, bụ ndị na-achọ ihu gị, Chineke nke Jekọb. Sela
Ihe ọgụgụ nke abụọ
1Lee ụdị oke ịhụnanya nke Nna ahụ nwere nʼebe anyị nọ, na-aga akpọ anyị ụmụ Chineke. Nʼezie, nke a bụ ihe anyị bụ. Ihe mere na ụwa amaghị anyị bụ nʼihi na ọ maghị ya. 2Ndị hụrụ nʼanya, ugbu a anyị abụrụla ụmụ Chineke. Ọ bụ ezie na anyị enweghị ike ịghọta ihe ọnọdụ anyị ga-abụ nʼoge dị nʼihu, ma anyị maara nke ọma na mgbe a ga-eme ka ọ pụta ìhè, a ga-emekwa ka anyị bụrụ ndị yiri ya, nʼihi na anyị ga-ahụ ya dịka ọ dị. 3Onye ọbụla nwere olileanya dị otu a kwesiri idebe onwe ya ọcha, dị ka ya onwe ya dị ọcha.
Oziọma
1Mgbe Jisọs hụrụ igwe mmadụ ahụ, ọ rigooro nʼelu ugwu. Mgbe ọ nọdụrụ ala, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya, 2o bido ikuziri ha ihe. Ọ sịrị: 3“Ngọzị na-adịrị ndị bụ ogbenye nʼime mmụọ, nʼihi na alaeze eluigwe bụ nke ha. 4Ngọzị na-adịrị ndị na-eru ụjụ, nʼihi na a ga-akasị ha obi. 5Ngọzị na-adịrị ndị dị nwayọọ nʼobi, nʼihi na ha ga-eketa ụwa. 6Ngọzị na-adịrị ndị agụụ ezi omume na-agụ, nʼihi na ndị ahụ ka afọ ga-eju. 7Ngọzị na-adịrị ndị na-eme obi ebere, nʼihi na ha ka a ga-emere ebere. 8Ngọzị na-adịrị ndị dị ọcha nʼobi, nʼihi na ha ga-ahụ Chineke anya. 9Ngọzị na-adịrị ndị na-eme ka udo dị nʼetiti mmadụ na ibe ya, nʼihi na a ga-akpọ ha ụmụ Chineke. 10Ngọzị na-adịrị ndị a na-emegbu nʼihi ezi omume, nʼihi na alaeze eluigwe bụ nke ha. 11“Ngọzị na-adịrị unu mgbe ndị mmadụ na-akọcha unu, na-emegbu unu, ma na-ekwukwa okwu ọjọọ na ụgha niile dị iche iche megide unu nʼihi m. 12Ṅụrịanụ ọnụ, nwekwanụ obi ụtọ, nʼihi na ụgwọ ọrụ unu dị ukwuu nʼeluigwe. Nʼihi na nʼụzọ dị otu a ka ha sogburu ndị amụma ndị buru unu ụzọ.
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde A, afọ ụbọchị izu II.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike