Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2026 › 3 Novemba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 3 Novemba 2026
Tiuzdee · Izu nke 31 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Tiuzdee nke izu nke 31 nke Oge Nkịtị
Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Onye nsọ Matin de Porres, Onye okpukpe · Ncheta a na-ahọrọ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
5Na mmekọrịta unu na ibe unu, nweenụ ụdị uche ahụ nke dị nʼime Jisọs Kraịst: 6Onye ọ bụ ezie na o nwere ụdịdị Chineke site na mmalite ma ọ gụghị ụdịdị ya dị ka Chineke dị ka ihe ọ ga-ejidesi aka ike. 7Kama, ọ gụrụ onwe ya dị ka ihe efu, site na ịnara ụdịdị nke onye bụ ohu, onye nke a mụrụ dị ka mmadụ. 8Ebe ahụrụ ya ka ọ dịka mmadụ nʼoyiyi, o wedakwara onwe ya ala, site nʼirube isi ruo ọnwụ, bụ ọnwụ nke obe. 9Ọ bụ nʼihi nke a ka Chineke ji bulie ya elu nʼebe kachasị elu, nyekwa ya aha kachasị aha niile elu. 10Ka ọ ga-abụ mgbe ọbụla a kpọrọ aha Jisọs ka ikpere niile ọbụla gbuo nʼala, ihe niile dị nʼeluigwe, ndị niile bi nʼụwa, na ndị bi nʼokpuru ụwa. 11Ka ire niile ọbụla kwupụta na Jisọs Kraịst bụ Onyenwe anyị, maka inye Chineke bụ Nna, otuto.
Abụ Ọma nzaghachi
25Isiokwu otuto m nʼetiti ọha mmadụ sitere na gị; aga m emezukwa nkwa niile m kwere gị nʼihu ndị ahụ na-atụ egwu gị. 26Ndị ogbenye ga-eri nri, rijuo afọ ha, ndị niile na-achọ Onyenwe anyị ga-eto ya ka mkpụrụobi unu dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. 27Nsọtụ elu ụwa niile ga-echeta, ma laghachikwute Onyenwe anyị. Ezinaụlọ nke mba niile dị iche iche ga-akpọ isiala nʼihu ya. 28Nʼihi na ike ọchịchị bụ nke Onyenwe anyị, ọ na-achịkwa mba niile. 29Ndị ọgaranya niile nke elu ụwa ga-eri oriri ma fee ya; ihe niile na-anwụ anwụ ga-akpọ isiala nʼihu ya; ndị na-apụghị idebe onwe ha ndụ. 30Agbụrụ anyị ga-ejere ya ozi; a ga-akọrọ ọgbọ ndị na-abịa nʼihu ihe banyere onyenwe anyị. 31Ha ga-ekwusa ezi omume ya nye ọgbọ niile na-abịa nʼihu, bụ ndị a na-amụbeghị nʼihi na o meela ya.
Oziọma
15Mgbe otu nʼime ndị a kpọrọ oriri nụrụ nke a, ọ sịrị ya, “Ngọzị ga-adịrị onye ga-eso rie oriri nʼalaeze Chineke.” 16Ma ọ sịrị ya, “Otu onye na-akwado oke oriri kpọkwa ọtụtụ mmadụ oku. 17Mgbe oge oriri ahụ ruru, o zipụrụ ohu ya ka ọ ga gwa ndị ahụ ọ kpọrọ sị, ‘Bịanụ, nʼihi na e dozichaala ihe niile.’ 18“Ma ha niile nʼotu nʼotu malitere inye ọsịsa. Onye nke mbụ sịrị, ‘Azụrụ m iberibe ala ọhụrụ, ọ dịkwa mkpa na m ga-eje hụ ya, biko gbaghara m, agaghị m abịa.’ 19“Onye nke ọzọ sịrị, ‘Azụrụ m ehi e ji arụ ọrụ ubi, iri e jikọrọ abụọ abụọ. Ana m aga ugbu a ka m nwalee ha, biko gbaghara m, agaghị m abịa.’ 20“Ma onye ọzọ sịkwara, ‘Alụrụ m nwunye ọhụrụ, nʼihi nke a agaghị m abịa.’ 21“Ohu ahụ lọtara, kọọrọ nna ya ukwu ihe ndị ahụ a kpọrọ oriri kwuru. Mgbe ahụ, iwe dị ukwuu were nna ya ukwu, nke a mere ka o zipụ ohu ya sị ya, ‘Gaa ngwangwa nʼokporoụzọ ukwu na nʼokporoụzọ nta dị nʼobodo a, kpọbata ndị ogbenye, na ndị ụkwụ rụrụ, na ndị ìsì na ndị ngwụrọ.’ 22“Ohu ahụ sịrị, ‘Nna m ukwu, emeela m ihe i kwuru, ma ohere ka fọdụrụ.’ 23“Nna ukwu ahụ sịrị ohu ahụ, ‘Gaakwa nʼokporoụzọ ukwu na okporoụzọ nta, mee ka ndị mmadụ bata nʼụlọ m, ka ụlọ m jupụta na mmadụ. 24Nʼihi na agwa m unu, ọ dịghị otu onye nʼime ndị ahụ a kpọrọ oriri ga-edetụ nri m ọnụ.’ ”
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Matin de Porres, Onye okpukpe
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde A, afọ ụbọchị izu II.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike