Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2026 › 2 Novemba

Kalenda Ọtọdọks · 20 Ọktoba (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 2 Novemba 2026

Mọnde · Izu nke 23 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 5

Mmemme na ndị nsọ

Great Martyr Artemius of Antioch († 362)

Obubu ọnụ

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

1Te 1:1–5

1Akwụkwọ ozi a si nʼaka Pọl, Saịlas na Timoti. Na-abịara nzukọ dị na Tesalonaịka, ndị e jikọtara ha na Chineke Nna, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. Ka amara na udo dịrị unu. 2Anyị na-ekele Chineke ekele mgbe niile, na-echetakwa unu nʼekpere anyị. 3Mgbe niile ka anyị na-echeta nʼekpere nye Chineke bụ Nna, ihe gbasara ọrụ unu nke sitere nʼokwukwe, ya na ịrụsị ọrụ ike unu nke sitere nʼịhụnanya, na iguzosi ike unu nke sitere nʼolileanya unu nwere nʼOnyenwe anyị Jisọs Kraịst. 4Ụmụnna anyị, anyị maara na Chineke hụrụ unu nʼanya nke ukwuu, họpụta unu. 5Nʼihi na ọbụghị naanị nke okwu ọnụ ka oziọma anyị rutere unu, kama ọ bụkwa nʼike, na nʼime Mmụọ Nsọ nakwa mmetụta nke dị omimi. Unu maara ụdị ndụ anyị biri nʼetiti unu nʼihi unu.

Akwụkwọ ozi (maka Onye nsọ Atemiọs)

2Tm 2:1–10

1Ya mere, nwa m, bụrụ onye dị ike site nʼamara ahụ Kraịst Jisọs na-enye. 2Ihe niile nke ị nụrụ nʼọnụ m nʼihu ọtụtụ ndị ama ka ị ga-enyefe nʼaka ndị kwesiri ntụkwasị obi, bụ ndị nwekwara ike izi ndị ọzọ ihe ndị a. 3Soro m kere oke nʼahụhụ dị ka ezi onye agha Jisọs Kraịst. 4Ọ dịghị onye agha ọbụla na-ekekọta onwe ya nʼihe nke ụwa a, kama ọ na-achọ ime ihe ga-atọ onye họpụtara ya dị ka onye agha ụtọ. 5Otu aka ahụ, onye na-agba ọsọ agaghị enweta okpu mmeri, ma ọ bụrụ na ọ gbaghị ọsọ ya dịka usoro iwu ịgba ọsọ si dị. 6Onye ọrụ ubi na-adọgbu onwe ya nʼọrụ kwesiri ịbụ onye ga-ebu ụzọ rie mkpụrụ sitere nʼubi ya. 7Na-atụgharị uche nʼihe m kwuru, nʼihi na Onyenwe anyị ga-enye gị nghọta nʼime ha niile. 8Echefula Jisọs Kraịst, onye a kpọlitere site nʼọnwụ, onye sikwa nʼagbụrụ Devid, nke a bụ oziọma m. 9Ọ bụ nʼihi na m na-ekwu eziokwu ndị a ka m ji nọọ na-ahụ ahụhụ dị otu a dị ka onye ọjọọ, ma otu ọ dị, ekeghị okwu Chineke agbụ. 10Ya mere, ana m anagide ihe niile nʼihi ndị a họpụtara, ka ha bụrụkwa ndị ga-anata nzọpụta dị nʼime Kraịst Jisọs, na ebube ebighị ebi.

Oziọma

Luk 9:18–22

18Otu ụbọchị mgbe ọ nọ naanị ya na-ekpe ekpere, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya. Ọ jụrụ ha sị, “Onye ka igwe mmadụ na-asị na m bụ?” 19Ha zara sị, “Ụfọdụ na-asị na ị bụ Jọn omee baptizim, ndị ọzọ sị na ị bụ Ịlaịja, ndị ọzọkwa, sị na ị bụ otu nʼime ndị amụma ochie ahụ si nʼọnwụ bilie.” 20Ma ọ jụrụ ha, “Unu onwe unu, ọ bụ onye ka unu na-asị na m bụ?” Pita zara sị, “Ị bụ Kraịst nke Chineke.” 21Ma ọ dọrọ ha aka na ntị, nyesiekwa ha iwu ike ka ha ghara ịgwa onye ọbụla nke a, 22na-asị, “Nwa nke Mmadụ aghaghị ịhụ ọtụtụ ahụhụ dị iche iche. Ndị okenye na ndịisi nchụaja, na ndị ozizi iwu ga-ajụ ya. Aghaghị igbu ya, ma nʼụbọchị nke atọ, a ga-eme ka o site nʼọnwụ bilie.”

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 20 Ọktoba na kalenda nzukọ bụ 2 Novemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike