Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2026 › 25 Ọktoba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 25 Ọktoba 2026
Sọnde · Izu nke 30 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Sọnde nke 30 nke Oge Nkịtị
Sọnde · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
21“Ọ kwesighị ka mmadụ ọbụla mesie onye ọbịa ihe ike nʼụzọ ọbụla. Unu aghaghị icheta na unu bụ ndị ọbịa nʼala Ijipt. 22“Unu emegbula nwanyị ọbụla di ya nwụrụ, maọbụ onye ọbụla na-enweghị nne na nna. 23Unu megbuo ha, mee ka ha tikuo m, aga m anụ mkpu akwa ha, nyere ha aka. 24Mgbe ahụ, iwe m dị oke ọkụ ga-eripịa unu. Aga m ejikwa mma agha tigbuo unu. Ndị nwunye unu ga-aghọkwa ndị inyom na-enweghị di, ụmụ unu ga-abụkwa ndị na-enweghị nna. 25“Ọ bụrụ na ị gbazinyere onye Hibru ego, onye bụ nwa mgbei, ị gaghị anara ya ọmụrụnwa. 26Ọ bụrụ na ị nara ya uwe ya nʼihi ego ahụ ị gbazinyere ya, ekwela ka uwe ahụ nọgide nʼaka gị ruo mgbe anwụ dara. 27Nʼihi na uwe ahụ nwere ike bụrụ naanị ihe o nwere, maọbụ uwe ọ ga-eji rahụ ụra. Ọ bụrụ na i zighachighị ya, o tikuo m site nʼịkwa akwa, aga m anụrụ mkpu akwa ya, nʼihi na abụ m onye obi ebere.
Abụ Ọma nzaghachi
1Abụ ọma Devid. Abụ Devid ohu Onyenwe anyị. Ọ bụụrụ Onyenwe anyị okwu niile nke abụ a mgbe Onyenwe anyị napụtara ya site nʼaka ndị iro ya niile, nakwa nʼaka Sọl. Ọ sịrị: O Onyenwe anyị, ahụrụ m gị nʼanya, gị bụ ike m. 2Onyenwe anyị bụ oke nkume m, na ebe mgbaba m e wusiri ike, na onye nnapụta m. Chineke m bụ oke nkume m, onye m gbabara nʼime ya. Ọ bụ ọta m, na mpi nzọpụta m, na oke nkume m nke onye ọbụla na-apụghị ịba nʼime ya. 3Akpọkuru m Onyenwe anyị, onye e kwesiri inye otuto, ọ zọpụtara m site nʼaka ndị iro m. 46Onyenwe anyị na-adị ndụ! Otuto dịrị oke nkume m! Mbuli elu dịrị Chineke, Onye nzọpụta m. 50Ọ na-enye eze ya mmeri dị ukwuu; Ọ na-egosikwa onye ya onye e tere mmanụ ịhụnanya na-adịghị ada ada, nye Devid na ndị agbụrụ ya ruo mgbe ebighị ebi.
Ihe ọgụgụ nke abụọ
5Nʼihi na ọbụghị naanị nke okwu ọnụ ka oziọma anyị rutere unu, kama ọ bụkwa nʼike, na nʼime Mmụọ Nsọ nakwa mmetụta nke dị omimi. Unu maara ụdị ndụ anyị biri nʼetiti unu nʼihi unu. 6Nke a mere unu ji bụrụ ndị na-eṅomi anyị na Onyenwe anyị. Nʼihi na unu jiri ọṅụ nke Mmụọ Nsọ na-enye nabata oziọma ahụ, nʼagbanyeghị ọtụtụ ahụhụ dị ukwuu nke o wetaara unu. 7Nʼụzọ dị otu a, unu ghọrọ ihe ilere anya nye ndị niile kwere ekwe nọ na Masidonia na Akaịa. 8Ugbu a, e sitela na ndụ unu mee ka oziọma Onyenwe anyị gbasaa gabiga Masidonia na Akaịa. Nʼihi na a na-anụ ihe banyere okwukwe unu nwere na Chineke nʼebe niile. Ya mere, ọ dịkwaghị mkpa ka anyị kwuo ihe banyere ya. 9Nʼihi na ha onwe ha na-ebu ụzọ gwa anyị ihe banyere nnabata unu nabatara anyị, na otu unu si site nʼikpere arụsị tụgharịa, bido ife Chineke dị ndụ, onye bụkwa ezi Chineke, 10na i chere Ọkpara ya onye ga-esi nʼeluigwe, onye o sitere na ndị nwụrụ anwụ kulite, Jisọs, onye na-anapụta anyị nʼiwe nke na-abịa.
Oziọma
34Ma mgbe ndị Farisii nụrụ na ọ emeela ka ndị Sadusii mechie ọnụ ha, ha gbakọtara otu ebe. 35Otu onye nʼime ha, bụ onye ozizi iwu bịara jụọ ya ajụjụ iji nwaa ya: 36“Onye ozizi, olee iwu nke kachasị mkpa nʼime iwu niile?” 37Ọ zara sị ya, “ ‘Hụ Onyenwe gị bụ Chineke gị nʼanya site nʼobi gị niile na site na mkpụrụobi gị niile, na site nʼuche gị niile.’ 38Nke a bụ iwu nke mbụ, bụrụkwa iwu kachasị iwu niile. 39Iwu ọzọ na-eso nke a nʼịdị mkpa bụ nke a, ‘Hụ onye agbataobi gị nʼanya dị ka i si hụ onwe gị nʼanya.’ 40Iwu ndị ọzọ niile na ihe niile ndị amụma kwuru dabeere nʼebe iwu abụọ ndị a nọ.”
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde A, afọ ụbọchị izu II.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike