Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2026 › 24 Ọktoba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 24 Ọktoba 2026

Satọdee · Izu nke 29 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Satọdee nke izu nke 29 nke Oge Nkịtị

Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Onye nsọ Antoni Meri Claret, Bishọp · Ncheta a na-ahọrọ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Efe 4:7–16

7Ma e nyere onye ọbụla amara dịka oke onyinye nke Kraịst siri dị. 8Nʼihi nke a, e kwuru, “Mgbe ọ rigoro gaa nʼelu, o duuru igwe ndị a dọtara nʼagha, nyekwa ụmụ mmadụ onyinye dị iche iche.” 9(E kwuru, “Ọ rigoro,” gịnị ka ọ pụtara ma ọ bụghị na o buru ụzọ rịdaa nʼime ala mmụọ? 10Onye ahụ si nʼelu rịdata bụkwa otu onye ahụ rigoro nʼeluigwe, ka o nwee ike mejuo ihe niile.) 11O nyekwara ụfọdụ onyinye ị bụ ndị ozi, ụfọdụ ndị amụma, ụfọdụ ndị nkwusa oziọma, ụfọdụ ndị ụkọchukwu na ndị nkuzi. 12Nke a bụ maka ikwadobe ndị nsọ maka ọrụ nke ije ozi, iji wulite ahụ nke Kraịst; 13tutu anyị niile abịa na nkwekọta banyere okwukwe anyị, na ọmụma ihe banyere ọkpara Chineke, bụrụ onye tozuru oke, ruo ọtụtụ nke ogogo na ozuzu oke nke Kraịst. 14Mgbe ahụ anyị agaghị abụkwa ụmụntakịrị, ndị ikuku ozizi ọhụrụ dị iche iche na-ebugharị ihu na azụ dị ka ebili mmiri, na ịgha ụgha nke mmadụ, bụ ozizi na-esite nʼime aghụghọ nke ha ji echepụta nduhie. 15Kama nʼikwu eziokwu site na mmụọ ịhụnanya, anyị ga-eto bụrụ ndị tozuru oke nʼakụkụ niile nʼime ya, bụ onye ahụ bụ isi, nke bụ Kraịst. 16Onye anụ ahụ niile, jikọtara ọnụ ma bụrụ otu, site na nkwonkwo niile nke na-enyezu ya nkwado, dịka akụkụ niile ọbụla na-arụ ọrụ ya nke ọma, na-esite nʼụzọ ahụ enyere akụkụ ndị ọzọ aka, ime ka ha too, nakwa iwuli ha elu site nʼịhụnanya.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 122:1–5

1Abụ nrigo, nke Devid. Aṅụrịrị m ọṅụ mgbe ha sị m, “Ka anyị gaa nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.” 2Ụkwụ anyị eguzola ugbu a nʼọnụ ụzọ ama gị niile, gị obodo Jerusalem. 3E wuru Jerusalem dịka obodo a chịkọtara ọnụ nke ọma. 4Ọ bụ ebe ahụ ka ebo niile na-arịgo, bụ ebo niile nke Onyenwe anyị, ịbụku aha Onyenwe anyị abụ dịka iwu o nyere ndị Izrel si dị. 5Nʼebe ahụ ka ocheeze niile nke ikpe ikpe dị, bụ ocheeze niile nke ezinaụlọ Devid.

Oziọma

Luk 13:1–9

1Mgbe ahụ, ụfọdụ ndị nọ nʼebe ahụ gwara ya banyere ndị Galili ahụ Pailet jiri ọbara ha gwakọta nʼaja ha chụrụ. 2Ọ zara sị ha, “Unu chere na ndị Galili a tara ụdị ahụhụ a bụ ndị mmehie karịa ndị Galili niile? 3Mba! Asị m unu, ọ bụrụ na unu echegharịghị, unu niile ga-esi otu ahụ laa nʼiyi. 4Ka unu chere na mmadụ iri na asatọ ahụ, ndị mgbidi aja ụlọ elu Sailọm dagburu bụ ndị ikpe mmehie mara karịa ndị niile bi na Jerusalem? 5Mba! Asị m unu, ọ bụrụ na unu echegharịghị, unu niile ga-ala nʼiyi dị ka ha.” 6Ya mere, ọ tụụrụ ha ilu a sị, “Otu nwoke kụrụ osisi fiig nʼubi vaịnị ya, ma mgbe ọ bịara chọọ nʼelu ya, ma ọ hụghị mkpụrụ ọbụla. 7Ya mere, ọ gwara onye ọrụ ubi ya sị, ‘Nʼime afọ atọ ndị a ka m bịara ka m ghọrọ mkpụrụ site nʼosisi fiig a, ma ahụghị m mkpụrụ ọbụla. Gbutuo ya! Gịnị mere ọ ga-eji na-erikọ nri dị nʼala ubi a?’ 8“Ọ zara sị ya, ‘Nna m ukwu, hapụkwa ya nʼafọ a, ka m gwuo ala gburugburu, hinye ya aja nri ala nʼukwu. 9Ọ bụrụ na ọ mịa mkpụrụ nʼafọ ọzọ, ọ dị mma, ọ bụrụkwa na ọ mịghị, i nwere ike gbutuo ya. ’ ”

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde A, afọ ụbọchị izu II.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike