Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2026 › 26 Ọktoba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 26 Ọktoba 2026

Mọnde · Izu nke 30 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Mọnde nke izu nke 30 nke Oge Nkịtị

Ụbọchị izu · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Efe 4:32–5:8

32Nʼọnọdụ ihe ndị a niile, nweenụ obi ebere nʼebe ibe unu nọ. Gbagharanụ ibe unu dịka Chineke sitere nʼamara ya gbaghara unu nʼihi na unu bụ nke Kraịst. 5:1Ya mere bụrụnụ ndị na-eṅomi Chineke, dị ka ụmụ a hụrụ nʼanya. 2Na-agakwanụ nʼime ịhụnanya, dịka Kraịst siri hụ anyị nʼanya ma were ndụ ya nye Chineke maka anyị dịka aja na onyinye nke isi ụtọ. 3Ma nʼetiti unu, ka a ghara ịkpọta mmehie ịkwa iko, maọbụ nke adịghị ọcha, maọbụ nke inwe anya ukwu aha, nʼihi na ihe ndị a ekwesighị nʼetiti ndị nsọ. 4Ọ dịkwaghị mma ka unu na-ekwu okwu rụrụ arụ maọbụ okwu nzuzu maọbụ njakịrị, kama ka e nwee inye ekele. 5Matanụ nke ọma na onye na-akwa iko, maọbụ onye rụrụ arụ, maọbụ onye anya ukwu, nʼihi na anya ukwu dị ka ikpere arụsị, enweghị ike ịbata nʼalaeze Kraịst na Chineke. 6Unu ekwela ka onye ọbụla jiri okwu efu duhie unu. Ọ bụ nʼihi omume ọjọọ ndị a ka iwe Chineke ji abịakwasị ndị na-anaghị erubere ya isi. 7Unu na ndị dị otu a enwela mmekọ. 8Nʼihi nʼoge gara aga, unu bụ ọchịchịrị, ma ugbu a, unu bụ ìhè nʼime Onyenwe anyị. Na-ebinụ ndụ ka ụmụ nke ìhè

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 1:1–4, 6

1Onye ihe na-agara nke ọma ka mmadụ ahụ bụ, onye na-adịghị aga ije na ndụmọdụ ndị na-emebi iwu; onye na-adịghị eguzokwa nʼụzọ ndị mmehie maọbụ soro nʼotu ndị nkwutọ. 2Kama ihe na-atọ ya ụtọ bụ ime ihe niile dị nʼiwu Onyenwe anyị. Ọ na-atụgharịkwa uche ya nʼiwu Onyenwe anyị ehihie na abalị, 3Ọ dị ka osisi a kụrụ nʼakụkụ iyi, nke na-amịpụta mkpụrụ ya nʼoge ya, nke ahịhịa ya na-adịghị akpọnwụ akpọnwụ. Ihe niile ọ na-eme na-agara ya nke ọma. 4Ma ndị ajọ omume adịghị otu a. Ha dị ka igbugbo ọka nke oke ifufe na-efesasị. 6Nʼihi na Onyenwe anyị na-eche ụzọ ndị ezi omume nche. Ma ụzọ ndị ajọ omume ga-eduba ha nʼịla nʼiyi.

Oziọma

Luk 13:10–17

10Nʼụbọchị izuike ndị Juu, ọ banyere nʼime otu ụlọ ekpere na-ezi ihe. 11Otu nwanyị nọkwa nʼebe ahụ, onye mmụọ nrịa nrịa mere ka ahụ ghara ị dị ya ike afọ iri na asatọ. Ọ na-ehu ehu, o nwekwaghị ike iguzo ọtọ kwem. 12Mgbe Jisọs hụrụ ya, ọ kpọrọ ya sị ya, “Nwanyị emeela ka i nwere onwe gị site nʼọrịa gị.” 13Mgbe o bikwasịrị ya aka, ngwangwa, o guzooro kwem malite na-eto Chineke. 14Ma onyendu ụlọ ekpere ahụ were iwe nke ukwuu nʼihi na Jisọs gwọrọ ọrịa nʼụbọchị izuike. Ọ gwara igwe mmadụ ahụ okwu sị, “E nwere ụbọchị isii nʼime izu ụka mgbe mmadụ kwesiri ịrụ ọrụ. Ya mere, bịanụ ka a gwọọ unu nʼụbọchị ndị a, ọ bụghị nʼụbọchị izuike.” 15Ma Onyenwe anyị zara ya sị, “Unu ndị ihu abụọ! Ọ dị onye nʼime unu na-adịghị atọpụ oke ehi ya maọbụ ịnyịnya ibu ya, site nʼụlọ anụmanụ, kpụpụ ya ebe ọ ga-aṅụ mmiri nʼụbọchị izuike? 16O kwesighị ka a tọpụ nwanyị a bụ ada Ebraham nʼagbụ ekwensu kere ya ogologo afọ iri na asatọ, nʼụbọchị izuike, mee ka o nwere onwe ya?” 17Mgbe o kwuru nke a, ihere mere ndị iro ya niile, ma ndị mmadụ nọ nʼebe ahụ ṅụrịrị ọṅụ nʼihi ọrụ ebube niile ọ na-arụ.

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde A, afọ ụbọchị izu II.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike