Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2026 › 20 Ọktoba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 20 Ọktoba 2026

Tiuzdee · Izu nke 29 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Tiuzdee nke izu nke 29 nke Oge Nkịtị

Ụbọchị izu · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Efe 2:12–22

12Nʼoge ahụ, ọ dịghị ihe jikọtara unu na Kraịst. E kewapụtara unu site na mmekọrịta nke Izrel, bụrụkwa ndị ọbịa nʼọgbụgba ndụ ahụ, na-enweghị olileanya na-enweghịkwa Chineke nʼime ụwa. 13Ma ugbu a nʼime Kraịst Jisọs, unu bụ ndị nọ nʼebe dị anya nʼoge gara aga, ka e mere ka unu bịaruo nso site nʼọbara Kraịst nke a wụsiri. 14Nʼihi na ya onwe ya bụ udo anyị, o mere ka ụzọ otu abụọ bụrụ otu ihe nʼime ahụ ya, site na ịkwatu mgbidi kewara ha na mgbe ochie, bụ mgbidi nke ịkpọ asị dị nʼetiti anyị. 15Ọ bụ nʼime anụ ahụ ya ka ọ mere ka iwu ahụ na ụkpụrụ ya niile ghara ịdị ire. Ebumnobi ya bụ i kee nʼime onwe ya otu onye ọhụrụ site na mmadụ abụọ ahụ, si otu a mee ka udo dịrị. 16Nʼụzọ dị otu a ka ọ ga-esi kpeziere anyị na Chineke site nʼobe ya, wetakwa nʼisi ngwụcha, iro dị nʼetiti ha abụọ. 17Ya mere, ọ bịara kwusaa udo nye unu ndị nọ ebe dị anya na unu ndị nọ nso, 18Nʼihi na anyị abụọ sitere nʼaka ya nweta nnabata anyị ịbịa nʼihu Nna site nʼotu Mmụọ ahụ. 19Matakwanụ ugbu a na unu abụkwaghị ndị mba ọzọ na ndị ọbịa. Unu esorola ndị nsọ bụrụ diala na ndị so nʼezinaụlọ Chineke, 20nke a rụkwasara nʼelu ntọala nke ndị ozi na ndị amụma, nke Kraịst Jisọs nʼonwe ya bụ nkume isi ntọala ya. 21Ọ bụkwa nʼime ya ka a na-ejikọta ụlọ ahụ niile nke ọma, na-aba ụba, too bụrụ ụlọnsọ, nʼime Onyenwe anyị. 22Onye a na-ewukọkwa unu onwe unu nʼotu nʼime ya, ka unu niile bụrụ ebe obibi Chineke nʼime Mmụọ.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 85:8–13

8Aga m ege ntị mara ihe Chineke, onye bụ Onyenwe anyị ga-ekwu; ọ na-ekwe ndị ya, ndị nsọ ya nkwa udo, ma ka ha ghara ịlọghachi na nzuzu. 9Nʼezie, nzọpụta ya dị nso ndị na-atụ egwu ya, ka ebube ya si otu a dịgide nʼala anyị. 10Ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi ezukọtala; ezi omume na udo esutula ọnụ. 11Ikwesi ntụkwasị obi ga-esite nʼala pupụta, ezi omume ga-esite nʼeluigwe ledata anya. 12Nʼezie, Onyenwe anyị ga-enye ihe dị mma, ala anyị ga-amịkwa mkpụrụ ubi ya. 13Ezi omume ga-aga nʼihu ya, idoziri ya ụzọ ọ ga-esi gaa.

Oziọma

Luk 12:35–38

35“Keenụ ajị nʼume, meenụ ka oriọna unu na-enwu enwu. 36Dịnụ ka ndị ohu na-echere nlọghachi nke nna ha ukwu, onye gara oriri agbamakwụkwọ, bụ onye ha ga-emeghere ụzọ ngwangwa mgbe ọ lọtara kụọ aka. 37Ndị ohu ahụ ga-abụ ndị a gọziri agọzi, bụ ndị onyenwe ha ga-ahụ na ha nọ na nche mgbe ọ ga-alọghachi. Nʼezie asị m unu na ọ ga-eke belịt ya nʼukwu ya, mekwa ka ha nọdụ ala na tebul iri ihe, ọ ga-abịakwa jere ha ozi. 38Ngọzị ga-adịrị ndị ohu ahụ onye nwe ha ga-ahụ ka ha nọ na njikere, ọ bụladị ma ọ lọghachiri nʼetiti abalị, maọbụ nʼezigbo isi ụtụtụ.

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde A, afọ ụbọchị izu II.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike