Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2026 › 19 Ọktoba
Kalenda Ọtọdọks · 6 Ọktoba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 19 Ọktoba 2026
Mọnde · Izu nke 21 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 3
Mmemme na ndị nsọ
Holy and Glorious Apostle Thomas (1st C)
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
10Ana m aṅụrị ọṅụ dị ukwuu nʼime Onyenwe anyị nʼihi na unu mechara malite iche echiche ọzọ banyere m. Unu bu m nʼobi nʼeziokwu ma unu enwetaghị ohere izipụta ya. 11Ọ bụghị na m nọ nʼọnọdụ oke mkpa na ụkọ. Nʼihi na amụtala m otu m ga-esi jiri ọṅụ nọrọ nʼọnọdụ ọbụla. 12Amụtala m otu m ga-esi nọrọ mgbe ihe siri ike na mgbe ihe bara ụba. Amụtakwala m otu m ga-esi nwee afọ ojuju nʼọnọdụ ọbụla, maọbụ mgbe m na-anọ agụụ, maọbụ mgbe m rijuru afọ, maọbụ mgbe m nwere ihe dị ukwuu maọbụ nʼoge ụkọ. 13Nʼihi na apụrụ m ime ihe niile site nʼinyeaka onye na-enye m ike. 14Ma unu mere nnọọ nke ọma inyere m aka nʼọnọdụ nsogbu nke m nọ nʼime ya. 15Unu onwe unu ndị Filipai maara na mbido nke oziọma a, mgbe m hapụrụ Masidonia, na o nweghị nzukọ ọzọ nyere m aka nʼinye maọbụ ịnabata onyinye, ma e wezuga unu. 16Ọ bụladị mgbe m nọ na Tesalonaịka, unu ziteere m onyinye ihe karịrị otu ugbo, inyere m aka na mkpa m. 17Ọ bụghịkwa na m chọrọ onyinye unu, kama ana m achọ ka mkpụrụ unu ga-amịta baa ụba, bara unu uru. 18Ugbu a, enweela m ihe niile na-akpa m mkpa, nʼezie, enweela m karịa ihe na-akpa m. Onyinye unu nyere m, nke Epafroditọs wetara, egboola mkpa m niile. Onyinye ndị a dị ka aja na-esi isi ụtọ a chụụrụ Chineke, nke ọ na-anabatakwa nke ọma. 19Ọ bụ Chineke m ga-egboro unu mkpa unu niile, site nʼụlọakụ ebube ya nke eluigwe, nʼihi Kraịst Jisọs. 20Ka otuto dịrị Chineke anyị, bụ Nna anyị, ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen. 21Keleere m ndị nsọ niile nʼime Kraịst Jisọs. Ụmụnna ndị mụ na ha nọ na-ekelekwa unu. 22Ndị nsọ niile nọ nʼebe a na-ekele unu, karịsịa ndị nọ nʼụlọ Siza. 23Ka amara Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịnyere mmụọ unu. Amen.
Akwụkwọ ozi (maka Onyeozi Tọmọs)
9Ọ na-adị m nnọọ ka Chineke o weere anyị bụ ndị ozi mee anyị ndị dịkarịsịrị ala, ndị a na-echeta naanị mgbe ihe niile na-agwụsị agwụsị, dịka ndị a mara ikpe ọnwụ. Nʼihi na-akpọpụtara anyị nʼihu ọha mmadụ mee anyị ihe nlere anya nye ụmụ mmadụ na ndị mmụọ ozi. 10Anyị aghọọla ndị nzuzu nʼihi Kraịst, ma unu onwe unu bụ ndị maara ihe nʼime Kraịst. Anyị bụ ndị na-adịghị ike ma unu dị ike. Anyị bụ ndị a jụrụ ajụ na ndị a na-eleda anya, ma unu bụ ndị a na-asọpụrụ. 11Tutu ruo ugbu a, anyị na-ebu ọnụ nọrọkwa nʼakpịrị ịkpọ nkụ. Anyị enweghị ezigbo uwe anyị ji achụ oyi. Ndị mmadụ na-emeso anyị mmeso ọjọọ, ma anyị enweghị ebe obibi nke aka anyị. 12Aka anyị ka anyị ji arụpụtara onwe anyị ihe anyị na-eri. Mgbe ndị mmadụ na-abụ anyị ọnụ, anyị na-agọzi ha. Mgbe ha na-ata anyị ahụhụ, anyị nọ na-enwe ndidi. 13Anyị na-eji okwu dị nro na-azaghachi ndị na-ekwujọ anyị. Tutu ruo ugbu a, a na-emeso anyị mmeso dịka anyị bụ unyi ndị ụwa na-azachapụ, dịka ihe a jụrụ ajụ nʼanya ndị ụwa. 14Anaghị m edere unu ihe ndị a ka ihere mee unu, kama ana m ede ya ịdụ unu ọdụ, na ịdọ unu aka na ntị, dịka ụmụ m hụrụ nʼanya. 15Ọ bụ ezie na unu nwere ọtụtụ ndị nche, ma unu enweghị karịa otu nna. Nʼihi na ọ bụ m bụ nna unu nʼime Kraịst Jisọs, site nʼoziọma ahụ m wetaara unu. 16Ya mere, ana arịọ m unu, ka unu na-eṅomi ndụ m.
Oziọma
24“Ma ahụhụ na-adịrị unu ndị ọgaranya, nʼihi na unu eketala nkasiobi unu. 25Ahụhụ na-adịrị ndị afọ juru ugbu a, nʼihi na agụ ga-agụkwa unu. Ahụhụ na-adịrị ndị na-achị ọchị ugbu a, nʼihi na unu ga-eru ụjụ, bee akwa. 26Ahụhụ na-adịrị unu mgbe ndị mmadụ niile na-ekwu okwu ọma gbasara unu, nʼihi na otu a ka ndị bụ nna ha mesoro ndị amụma ụgha.” 27“Ma a na m agwa unu ndị na-ege m ntị: hụnụ ndị iro unu nʼanya, mekwaaranụ ndị kpọrọ unu asị ihe ọma. 28Gọzienụ ndị na-abụ unu ọnụ, ma kpekwaaranụ ndị na-akparị unu ekpere. 29Ọ bụrụ na onye ọbụla a maa gị ụra nʼotu ntị, tụgharịara ya ntị gị nke ọzọ. Ọ bụrụkwa na onye ọbụla anara gị uwe ahụ gị, nyekwa ya uwe ime ahụ gị. 30Nye onye ọbụla rịọrọ gị ihe. Ọ bụrụkwa na mmadụ ewere ihe bụ nke gị, agala ịnapụta ya.
Oziọma (maka Onyeozi Tọmọs)
19Nʼuhuruchi nke ụbọchị ahụ, bụ ụbọchị mbụ nke izu ụka, mgbe ndị na-eso ụzọ ya zukọtara nʼime otu ụlọ. Ha mechiri ụzọ niile nʼihi egwu ndị Juu. Jisọs batara guzo nʼetiti ha sị ha, “Udo dịrị unu!” 20Mgbe o kwusiri nke a, o gosiri ha aka ya na akụkụ ya. Ọṅụ juru ndị na-eso ụzọ ya obi nʼihi na ha ahụla Onyenwe anyị. 21Ọzọkwa, Jisọs sịrị ha, “Udo dịrị unu! Dị ka Nna m si zite m, otu a ka m na-eziga unu.” 22Mgbe o kwuchara nke a, o kusara ha ume sị ha, “Naranụ Mmụọ Nsọ. 23Ọ bụrụ na unu agbaghara onye ọbụla mmehie ya, a ga-agbaghara ya, ọ bụrụkwa na unu ajụ ịgbaghara ha, agaghị agbaghara ha.” 24Ma Tọmọs (onye a na-akpọ Didimọs), otu nʼime ndị ozi iri na abụọ ahụ, anọghị ya mgbe Jisọs bịara. 25Ya mere, ndị ọzọ na-eso ụzọ ya gwara ya, “Anyị ahụla Onyenwe anyị!” Ma ọ sịrị ha, “Ọ bụ naanị mgbe m jiri anya m hụ ebe ahụ ntu kpọpuru ya aka, tinye mkpịsịaka m nʼapa ntu ndị ahụ, ma tinyekwa aka m nʼakụkụ ya ebe ahụ a mara ya ùbe, ka m ga-ekwere.” 26Mgbe abalị asatọ gasịrị, ndị na-eso ụzọ ya zukọtara ọzọ. Ugbu a Tọmọs nọkwa nʼetiti ha. Nʼagbanyeghị na e mechisịrị ụzọ niile, Jisọs batara guzo nʼetiti ha sị ha, “Udo dịrị unu.” 27Mgbe ahụ ọ sịrị Tọmọs, “Rụnye mkpịsịaka gị nʼebe a, leekwa aka m abụọ. Wepụta aka gị tinyekwa nʼakụkụ m. Abụla onye na-enweghị okwukwe, kama kwere.” 28Tọmọs zara sị ya, “Onyenwe m na Chineke m!” 29Ma Jisọs sịrị ya, “I kweere nʼihi na ị hụla m? Ma ngọzị dịrị ndị na-ahụghị ma kwere.” 30Ọ dị ọtụtụ ihe ịrịbama ndị ọzọ Jisọs rụrụ nʼihu ndị na-eso ụzọ ya. Ma edeghị ha nʼime akwụkwọ a. 31Ma e dere ihe ndị a niile ka unu kwere na Jisọs bụ Kraịst, Ọkpara Chineke. Nʼihi na ọ bụ site nʼikwere ka unu ga-eji nweta ndụ ọhụrụ site nʼaha ya.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 6 Ọktoba na kalenda nzukọ bụ 19 Ọktoba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike