Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2026 › 9 Ọktoba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 9 Ọktoba 2026
Fraịdee · Izu nke 27 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Fraịdee nke izu nke 27 nke Oge Nkịtị
Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Onye nsọ Denis, Bishọp, na ndị otu ya, Ndị nwụrụ nʼihi okwukwe · Ncheta a na-ahọrọ
Onye nsọ Jọn Leonardi, Onye ụkọchukwu · Ncheta a na-ahọrọ
Onye nsọ Jọn Henri Newman, Onye ụkọchukwu na Onye nkuzi nke Chọọchị · Ncheta a na-ahọrọ
Obubu ọnụ na nchegharị
Ụbọchị nchegharị
Fraịdee ọ bụla bụ ụbọchị nchegharị; ọgbakọ ndị bishọp ọ bụla na-ekpebi otú a ga-esi debe ya: izere anụ ma ọ bụ omume nchegharị ọzọ. Obubu ọnụ na-ejikọ ndị dị afọ 18 ruo 59, izere anụ site nʼafọ 14.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
7Matanụ nke a, na ọ bụ ndị nwere okwukwe bụ ụmụ Ebraham. 8Dị ka ọ dị nʼAkwụkwọ nsọ, nʼoge ahụ dị nʼihu, nke bụ ugbu a, Chineke ga-agụ ndị mba ọzọ dị ka ndị ezi omume, site nʼokwukwe ha nwere nʼime ya. Nʼihi nke a, o buru ụzọ zie Ebraham oziọma ahụ nʼoge gara aga sị, “A ga-agọzikwa agbụrụ niile nọ nʼụwa site na gị.” 9Ya mere, ndị dabeere nʼokwukwe bụkwa ndị na-eso Ebraham, nwoke okwukwe ahụ eketa ngọzị. 10Ma ndị niile na-ele anya na a ga-azọpụta ha nʼihi na ha debere iwu niile, ka ọbụbụ ọnụ na-adakwasị. Nʼihi na e deela ya nʼakwụkwọ nsọ sị, “Onye a bụrụ ọnụ ka ọ bụ, bụ onye ọbụla na-edebeghị ọ bụladị otu nʼime iwu niile e dere nʼakwụkwọ iwu.” 11Ugbu a, ọ bụ ihe pụtara ìhè na ọ dịghị onye ọbụla a na-agụ nʼonye ezi omume nʼihu Chineke, nʼihi na o debere iwu. Nʼihi na, “Onye ezi omume ga-esite nʼokwukwe dị ndụ.” 12Ma iwu ahụ adabereghị nʼokwukwe, kama, iwu kwuru sị, “Mmadụ ahụ na-eme ihe iwu kwuru bụ onye ga-enwe ndụ site na ha.” 13Ma Kraịst agbapụtala anyị site nʼọbụbụ ọnụ ahụ nke idebe iwu gaara ewetara anyị. Ọ ghọrọ ọbụbụ ọnụ nʼihi anyị. Nʼihi na e deela ya nʼakwụkwọ nsọ, “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke a kwụbara nʼelu osisi.” 14Ọ dị otu a ka ngọzị ahụ e nyere Ebraham bụrụkwa nke ndị mba ọzọ site na Kraịst Jisọs. Ka anyị niile site nʼokwukwe nata nkwa ahụ, bụ Mmụọ Nsọ. 15Ụmụnna m, ka m were ihe nlere anya site na ndụ a na-adị kwa ụbọchị kọwaa okwu a: Dị ka mmadụ na-enweghị ike iwepụ maọbụ ịtụkwasị ihe nʼọgbụgba ndụ e mere ka o guzosie ike, otu a ka ọ dịkwa nʼọnọdụ a. 16Ọ bụ Ebraham ka e kwere nkwa ya na mkpụrụ ya. Akwụkwọ nsọ asịghị, “nʼọtụtụ mkpụrụ,” kama, ọ sịrị, “ma nye mkpụrụ gị,” ya bụ otu onye, onye bụ Kraịst. 17Ihe m na-akọwa bụ nke a: Iwu ahụ e mere ka ọ malite ịdị narị afọ anọ na iri atọ (430) site na mgbe e kwere nkwa ahụ, emeghị ka ọgbụgba ndụ ahụ Chineke mere ka ọ dịrị hapụ iguzokwa, o mekwaghị ka nkwa ahụ bụrụ ihe e wezugara ewezuga.
Abụ Ọma nzaghachi
1Toonu Onyenwe anyị! Aga m eji obi m niile jaa Onyenwe anyị mma nʼime nzukọ ndị ụzọ ha ziri ezi na nʼime ọgbakọ ukwuu. 2Ọrụ niile Onyenwe anyị na-arụ dị ukwuu; ndị niile na-enwe mmasị na ha na-atụgharị uche nʼime ha. 3Ọrụ ya jupụtara nʼebube na ịma mma, ezi omume ya na-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi. 4O meela ka e cheta ọrụ ebube ya niile; Onyenwe anyị bụ onye amara na onye ọmịiko. 5Ọ na-egboro ndị na-atụ egwu ya mkpa ihe oriri; ọ na-echetakwa ọgbụgba ndụ ya ruo mgbe ebighị ebi. 6O gosila ndị ya ike nke ọrụ ya niile, site nʼinye ha ala niile nke ndị mba ọzọ.
Oziọma
15Ma ụfọdụ nʼime ha sịrị, “Ọ bụ site nʼike Belzebub eze ndị mmụọ ọjọọ ka o ji achụpụ mmụọ ọjọọ.” 16Ndị ọzọ, iji nwalee ya, sị ya gosi ha ihe ịrịbama nke si nʼeluigwe. 17Ma ebe ọ bụ na ọ maara ihe ha na-eche, ọ sịrị ha, “Alaeze ọbụla kewaranụ megide ibe ya, ga-atọgbọrọ nʼefu, ezinaụlọ ọbụla nke kewakwara megide ibe ya ga-adakpọ. 18Ọ bụrụ na ekwensu ekewa megide onwe ya, alaeze ya ọ ga-esi aṅaa guzosie ike? Unu na-asị na m na-achụpụ mmụọ ọjọọ site nʼike Belzebub. 19Ugbu a, ọ bụrụ na m sitere nʼike Belzebub na-achụpụ mmụọ ọjọọ, ọ bụ site nʼike onye ka ụmụ unu ji na-achụpụ ha? Ya mere, ha ga-abụ ndị ikpe unu. 20Ma ọ bụrụ na m ji ike mkpịsịaka Chineke na-achụpụ mmụọ ọjọọ, mgbe ahụ alaeze Chineke abịarutela nʼebe unu nọ. 21“Mgbe nwoke siri ike ji ngwa agha chekwa obi ya, ihe o nwere ga-adịgidere ya nʼudo. 22Ma ọ bụrụ na onye ọzọ ka ya ike alụso ya ọgụ merie ya, ọ ga-anara ya ngwa agha niile bụ ihe ntụkwasị obi ya, kesakwaa ihe ọ kwatara nʼụlọ dike ahụ. 23“Onye ọbụla na-adịnyeghịrị m na-emegide m. Onye ọ bụlakwa na-adịghị eso m ekpokọta, na-ekposa ekposa. 24“Mgbe ọbụla mmụọ na-adịghị ọcha sị nʼime mmadụ pụọ, ọ na-ejegharị nʼala kpọrọ nkụ na-achọgharị ebe izuike. Ọ bụrụ na ọ chọtaghị ya, mgbe ahụ, ọ ga-asị, ‘Aga m alaghachi nʼụlọ m hapụrụ.’ 25Mgbe ọ lọghachiri, ọ ga-achọpụta na a zachaala ya dozie ya nke ọma. 26Mgbe ahụ, ọ ga-apụ ga chọta mmụọ ọjọọ asaa ọzọ ndị dị njọ karịa ya. Ha niile na-abata biri nʼime onye ahụ, mee ka ọnọdụ ya dị njọ karịa ka ọ dị na mbụ.”
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Denis, Bishọp, na ndị otu ya, Ndị nwụrụ nʼihi okwukwe
- Onye nsọ Jọn Leonardi, Onye ụkọchukwu
- Onye nsọ Jọn Henri Newman, Onye ụkọchukwu na Onye nkuzi nke Chọọchị
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde A, afọ ụbọchị izu II.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike