Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2026 › 8 Ọktoba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 8 Ọktoba 2026
Tọọzdee · Izu nke 27 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Tọọzdee nke izu nke 27 nke Oge Nkịtị
Ụbọchị izu · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
1Ndị nzuzu a kpọrọ onwe ha ndị Galeshịa! Onye napụrụ unu akọnuche unu? Nʼihu unu ka a nọ kọwaa nʼụzọ doro anya mkpọgide nʼobe a kpọgidere Jisọs Kraịst. 2Ọ bụ naanị otu ihe ka m chọrọ ịmata nʼaka unu. Unu natara Mmụọ Nsọ site nʼịrụ ọrụ iwu chọrọ, ka ọ bụ site na nkuzi nke okwukwe? 3Ọ ga-abụ na unu aghọọla ndị na-enweghị uche? Unu malitere site nʼike Mmụọ Nsọ, ma ugbu a unu na-akwụsịzi nʼike nke anụ ahụ? 4Unu tara ọtụtụ ahụhụ dị otu a nʼefu, ọ bụrụ nʼezie na ọ bụ nʼefu? 5Mmụọ nsọ ahụ Chineke nyere unu na ọrụ ebube ọ rụrụ nʼetiti unu, o mere ha nʼihi iwu unu debere, ka ọ bụ nʼihi na unu nụrụ ma kwerekwa oziọma?
Abụ Ọma nzaghachi
69O welielara anyị Onye nzọpụta site nʼụlọ odibo ya bụ Devid. 70(Dị ka o kwuru na mgbe ochie, site nʼọnụ ndị amụma ya dị nsọ). 71Na ọ ga-azọpụta anyị site nʼaka ndị iro anyị na sitekwa nʼaka ndị niile kpọrọ anyị asị. 72O meere ndị nna nna anyị ha ebere site nʼicheta ọgbụgba ndụ ya dị nsọ. 73Iyi nke ọ ṅụụrụ nna anyị bụ Ebraham, kwekwa nkwa: 74Na ọ ga-anapụta anyị site nʼaka ndị iro anyị, nyekwa anyị ike ife ya ofufe na-atụghị egwu. 75Nʼịdị nsọ na ezi omume nʼihu ya ụbọchị niile nke ndụ anyị.
Oziọma
5Ọ sịrị ha, “Onye nʼime unu nwere enyi, ga-agakwuru ya nʼetiti abalị sị ya, ‘Enyi m, biko gbazinye m ogbe achịcha atọ, 6nʼihi na otu enyi m bịara nʼụlọ m, ma enweghị m nri ọbụla nʼụlọ m nke m ga-enye ya.’ 7Ma ọ ga-esi nʼime ụlọ zaghachi sị, ‘Enyela m nsogbu, emechiela m ụzọ, mụ na ụmụ m alakpuola, enweghị m ike ibili ugbu a inye gị ihe ọbụla.’ 8Agwa m unu, ọ bụ ezie na ọ gaghị ebili nye ya ihe ọbụla nʼihi na ọ bụ enyi ya, kama nʼihi nsogbu ya, ọ ga-ebili nye ya ihe ọbụla dị ya mkpa. 9“Ya mere, agwa m unu, rịọọnụ, unu ga-arịọta, chọọnụ, unu ga-achọta, kụọkwanụ aka, a ga-emeghekwara unu ụzọ. 10Nʼihi na onye na-arịọ na-arịọta, onye na-achọ na-achọta, onye na-akụ aka nʼụzọ ka a ga-emeghekwara ụzọ. 11“Onye nʼime unu bụ nna, ka nwa ya ga-arịọ ya azụ, o nye ya agwọ? 12Maọbụ rịọọ ya akwa, ọ ga-enye ya akpị? 13Ọ bụrụ na unu bụ ndị ọjọọ, maara otu esi enye ụmụ unu onyinye dị mma, karịa nke a, Nna unu nke bi nʼeluigwe aghaghị inye ha Mmụọ Nsọ bụ ndị niile na-arịọ ya.”
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde A, afọ ụbọchị izu II.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike