Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2026 › 10 Ọktoba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 10 Ọktoba 2026

Satọdee · Izu nke 27 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Satọdee nke izu nke 27 nke Oge Nkịtị

Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Ncheta Satọdee nke Nwaagbọghọ Meri Agọziri Agọzi · Ncheta a na-ahọrọ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Gal 3:22–29

22Ma akwụkwọ nsọ mechibidoro ihe niile nʼokpuru mmehie ka e nwee ike nye ndị kwere ekwe nkwa ahụ e kwere ha site nʼokwukwe nʼime Jisọs Kraịst. 23Ma tupu okwukwe abịa, e ji iwu na-eche anyị nche. Iwu nọ ọnọdụ dị ka ụlọ mkpọrọ ebe e tinyere anyị tutu ruo mgbe a ga-eme ka okwukwe pụta ìhè. 24Ya mere, iwu bụ onye nlekọta anyị, ruo mgbe Kraịst bịara, ka a gụọ anyị na ndị ezi omume site nʼokwukwe. 25Ma ebe ọ bụ na okwukwe abịala, anyị anọkwaghị nʼokpuru onye nlekọta ọzọ. 26Unu niile bụ ụmụ Chineke site nʼokwukwe nʼime Kraịst Jisọs. 27Nʼihi na ka unu niile ha, bụ ndị e mere baptizim nʼime Kraịst, abụrụla ndị yikwasịrị onwe ha Kraịst. 28E nwekwaghị onye Juu, maọbụ onye Griik, maọbụ ohu maọbụ onye nwe onwe ya; nwoke maọbụ nwanyị, nʼihi na unu niile bụ otu nʼime Kraịst Jisọs. 29Ọ bụrụ na unu bụ ndị nke Kraịst, mgbe ahụ unu bụkwa mkpụrụ Ebraham, ndị nketa dị ka nkwa ahụ si dị.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 105:2–7

2Bụkuo ya abụ, bụkuo ya abụ otuto; kwupụtanụ ọrụ ihe ịrịbama ya niile. 3Ṅụrianụ nʼime aha nsọ ya; ka obi ndị niile na-achọ Onyenwe anyị ṅụrịa. 4Na-achọnụ Onyenwe anyị na ike ya, chọọnụ ihu ya mgbe niile. 5Chetanụ ọrụ ebube niile nke ọ rụrụ, ihe ịrịbama ya niile na ikpe ziri ezi niile si nʼọnụ ya pụta, 6unu ụmụ ụmụ Ebraham, bụ ohu ya, unu ụmụ ụmụ Jekọb, ndị ọ họpụtara. 7Ya onwe ya bụ Onyenwe anyị Chineke anyị; ikpe ya dị nʼụwa niile.

Oziọma

Luk 11:27–28

27Mgbe ọ kpụ okwu a nʼọnụ, otu nwanyị sitere nʼime igwe mmadụ ahụ tie mkpu sị, “Ngọzị na-adịrị afọ mụrụ gị na ara nke e jiri zụọ gị.” 28Ma ọ sịrị, kama, “Ngọzị na-adịrị ndị na-anụ okwu Chineke, na-emekwa ha.”

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde A, afọ ụbọchị izu II.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike