Nyochaa › Ndị Eze na Ihe E Mere nʼakụkụ ibe ha › Ọdịda Jerusalem
Ndị Eze na Ihe E Mere nʼakụkụ ibe ha · Ọdịda Jerusalem
E mere ka Jehoiakin nwere onwe ya
2Ez 25:27–30 · Jer 52:31–34
2Ez 25:27–3027Nʼafọ nke iri atọ na asaa, site na mgbe e mere ka Jehoiakin eze Juda gaa biri nʼala ọzọ, nʼafọ Awel-Maduk ghọrọ eze Babilọn, o mere ka Jehoiakin si nʼụlọ mkpọrọ pụta nwere onwe ya. Ọ bụ nʼụbọchị nke iri abụọ na asaa nke ọnwa iri na abụọ ka o mere nke a.
28Ọ gwara ya okwu ọma, nye ya oche ọnọdụ ya dị elu karịa nke ndị eze ndị ọzọ ya na ha nọ na Babilọn.
29Nʼihi nke a, Jehoiakin gbanwere uwe mkpọrọ ya, wezuga ya. Sitekwa nʼoge ahụ, tutu ruo mgbe ọ nwụrụ, ya na eze na-erikọ nri.
30Site nʼụbọchị ruo nʼụbọchị, eze Babilọn na-enye Jehoiakin oke ihe ruru ya kwa ụbọchị niile nke ọ dị ndụ.
Jer 52:31–3431Nʼafọ nke iri atọ na asaa, site na mgbe e mere ka Jehoiakin eze Juda gaa biri nʼala ọzọ, nʼafọ Awel-Maduk ghọrọ eze Babilọn. Mgbe ahụ, o mere ka Jehoiakin eze Juda, si nʼụlọ mkpọrọ pụta, nwere onwe ya. O mere nke a nʼụbọchị iri abụọ na ise nke ọnwa iri na abụọ.
32Ọ gwara ya okwu ọma, nyekwa ya ọnọdụ ugwu dị elu karịa ọnọdụ ndị eze ndị ọzọ niile ha na ya nọ na Babilọn.
33Nʼihi nke a, Jehoiakin gbanwere uwe mkpọrọ ya, wezuga ya. Sitekwa nʼoge ahụ tutu ruo mgbe ọ nwụrụ, ya na eze na-erikọ nri.
34Site nʼụbọchị ruo nʼụbọchị, eze Babilọn na-enye Jehoiakin oke ihe ruru ya kwa ụbọchị niile nke ọ dị ndụ, ruokwa nʼụbọchị ọnwụ ya.
Akara: okwu akụkọ ọ bụla nwere, na nsụgharị ị na-agụ. A naghị aka akara nʼokwu ndị a na-ahụkarị (“na”, “ọ”); okwu nʼụdị ọzọ nwere ike ọ gaghị enwe akara.
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · E ji aka họrọ akụkụ yiri ibe ha site nʼederede ma lelee ha megide ntụaka gafere OpenBible.info (CC BY). Naanị otu ihe mere ma ọ bụ otu okwu e kwuru ka a na-etinye nʼakụkụ ibe ha. OpenBible.info · CC BY