Bible Explorer

Nyochaa › Ndị Eze na Ihe E Mere nʼakụkụ ibe ha › Ndị eze Juda

Ndị Eze na Ihe E Mere nʼakụkụ ibe ha · Ndị eze Juda

Atalaya na nwata nwoke ahụ bụ Joash

2Ez 11:1–21 · 2Ih 22:10–12; 23:1–21

2 Ndị Eze

2Ez 11:1–21

1Mgbe Atalaya nne Ahazaya hụrụ na nwa ya nwoke anwụọla, ọ gara nʼihu bido igbu ndị niile a mụrụ nʼụlọ eze.

2Ma Jehosheba, bụ nwa nwanyị eze Jehoram, ma bụrụkwa nwanne nwanyị Ahazaya, kuuru Joash nwa Ahazaya, zopu ya site nʼetiti ụmụ ndị ikom eze, bụ ndị a chọrọ igbu egbu. O zoro ya na nwanyị na-elekọta ya anya nʼime ụlọ ndina, ka Atalaya hapụ ịhụ ya, nke a mere na-egbughị ya.

3Ya na nwanyị na-elekọta ya anya nọgidere na nzuzo nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị, afọ isii, oge ahụ niile Atalaya na-achị nʼala ahụ.

4Nʼafọ nke asaa, Jehoiada, ziri ozi kpọọ ndị ọchịagha na-achị narị ndị agha, ndị Karị na ndị nche oku, mee ka ha bịakwute ya nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. Ya na ha gbara ndụ, o mekwara ka ha ṅụọ iyi nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. Mgbe ahụ, o gosiri ha nwa eze.

5O nyere ha iwu, sị, “Nke a bụ ihe unu ga-eme, unu bụ ndị nọ nʼotu atọ ga-abịa ọrụ nʼụbọchị izuike, nke otu ụzọ nʼime unu na-eche ụlọeze nche,

6otu ụzọ nʼime ụzọ atọ ga-anọ nʼọnụ ụzọ Sua, ebe otu ụzọ ga-anọ nʼọnụ ụzọ ama, nʼazụ ndị na-eche nche nʼụlọnsọ ukwu Chineke.

7Ma unu bụ otu abụọ ndị kwesiri ịga ezumike site nʼọrụ unu nʼụbọchị izuike, ga-eguzo na nche nʼụlọnsọ ukwu nʼihi eze.

8Doonụ onwe unu gburugburu eze, onye ọbụla nʼime unu jide ihe agha nʼaka ya. Onye ọbụla nke na-abịa nso ahịrị unu, ka e gbuo ya. Nọrọnụ eze nso ebe ọbụla ọ gara, mgbe ọ na-apụ nʼezi na mgbe ọ na-aba nʼime.”

9Ndị ọchịagha ndị a na-achị narị ndị agha mere dịka Jehoiada, onye nchụaja nyere nʼiwu. Onye ọbụla kpọrọ ndị ikom ya, ma ndị na-emechi ọrụ, ma ndị na-abata ịrụ ọrụ nʼụbọchị izuike, bịakwute Jehoiada, bụ onye nchụaja.

10O nyere ndị ọchịagha ahụ ùbe na ọta niile, ndị bụrịị nke eze Devid, ndị dị nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.

11Onye ọbụla na ndị nche ahụ ji ngwa agha nʼaka ya, ha guzoro onwe ha, nọdụ eze gburugburu, na nso ebe ịchụ aja na ụlọnsọ ukwu, site nʼakụkụ ndịda ruo nʼakụkụ ugwu nke ụlọnsọ ukwu ahụ.

12Jehoiada kpọpụtara nwa eze, kpube ya okpueze nʼisi, o nyere ya otu akwụkwọ nke ihe ọgbụgba ndụ ahụ, chie ya eze. Ha tekwara ya mmanụ ịbụ eze. Ndị niile nọ nʼebe ahụ kụrụ aka, tie mkpu, sị, “Ka eze dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi!”

13Mgbe Atalaya nụrụ mkpọtụ nke ndị nche na ndị mmadụ na-eme, ọ gakwuru ndị ahụ nọ nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.

14O lepụrụ anya, ma lee eze, ka o guzo nʼakụkụ ogidi, dịka omenaala mmemme ịchị eze si dị. Ndịisi na ndị na-afụ opi nọ nʼakụkụ eze. Ndị niile nke ala ahụ nọkwa na-aṅụrị ọṅụ na-afụ opi. Atalaya dọwara uwe ya, sị, “Nnupu isi megide eze! Nke a bụ nnupu isi megide ọchịchị!”

15Jehoiada, bụ onye nchụaja nyere ndịisi ọchịagha na-achị narị ndị agha, bụ ndị na-elekọta usuu ndị agha, iwu sị ha, “Sitenụ nʼebe ahụ kpọpụta ya nʼetiti ahịrị unu, onye ọbụla nke gbasoro ya, werenụ mma agha gbuo onye ahụ.” Nʼihi na onye nchụaja sịrị, “Agaghị egbu ya nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị.”

16Ya mere, ha jidere ya, mgbe o rutere nʼụzọ ebe ịnyịnya si abata nʼogige ụlọeze, ebe ahụ ka ha nọ gbuo ya.

17Jehoiada mere ka ọgbụgba ndụ dị nʼetiti Onyenwe anyị na eze, na ndị mmadụ, na ha ga-abụ ndị nke Onyenwe anyị. O mekwara ka ọgbụgba ndụ dịrị nʼetiti eze na ndị ahụ.

18Ndị niile nke ala ahụ gara nʼụlọ nchụaja Baal kwatuo ya. Ha tidasịrị ebe nchụaja na arụsị niile dị nʼebe ahụ mee ka ọ darisịa, gbukwaa Matan onye nchụaja Baal nʼihu ebe ịchụ aja ahụ. Mgbe ahụ, Jehoiada onye nchụaja, debekwara ndị nche ka ha lekọta ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.

19Ọ kpọọrọ ndị ọchịagha na-achị narị ndị agha, ha na ndị Karị, na ndị nche, ha na ndị ala ahụ niile, ha niile dupụtara eze site nʼụlọnsọ Onyenwe anyị site nʼọnụ ụzọ ndị nche banye nʼụlọeze. Eze were ọnọdụ ya nʼelu ocheeze.

20Ndị ala ahụ niile ṅụrịrị ọṅụ nke ukwuu, obodo ahụ dakwara jụụ, nʼihi na e ji mma agha gbuo Atalaya nʼụlọeze.

21Joash gbara afọ asaa mgbe ọ malitere ịbụ eze.

2 Ihe E Mere

2Ih 22:10–12; 23:1–21

22:10Mgbe Atalaya, nne Ahazaya hụrụ na nwa ya nwoke anwụọla, ọ gara nʼihu bido igbu ndị niile a mụrụ nʼụlọ eze, bụ ndị ezinaụlọ eze Juda.

22:11Ma Jehosheba, bụ nwa nwanyị eze Jehoram, kuuru Joash nwa Ahazaya zopu ya site nʼetiti ụmụ eze, bụ ndị a chọrọ igbu egbu. O zoro ya na nwanyị na-elekọta ya anya nʼime ụlọ ndina. Nʼihi na Jehosheba, bụ nwa nwanyị eze Jehoram, bụ nwanne Ahazaya, ma bụrụkwa nwunye Jehoiada onye nchụaja, ya mere o jiri zonarị Atalaya nwantakịrị ahụ, ka ọ ghara igbu ya.

22:12Ya na ha nọgidere na nzuzo nʼime ụlọnsọ Chineke, afọ isii, oge ahụ niile Atalaya na-achị nʼala ahụ.

23:1Nʼafọ nke asaa, Jehoiada gosiri ịdị ike nke obi ya. Ya na ndị ọchịagha na-achị narị ndị agha gbara ndụ. Ndị a bụ: Azaraya nwa Jeroham, Ishmel nwa Jehohanan, Azaraya nwa Obed, Maaseia nwa Adaya na Elishafat nwa Zikri.

23:2Ha pụrụ gaa akụkụ niile nke ala Juda kpọkọta ndị Livayị na ndịisi ezinaụlọ Izrel site nʼobodo niile. Mgbe ha bịarutere Jerusalem,

23:3ọgbakọ ahụ niile na eze gbara ndụ nʼụlọnsọ ukwu Chineke. Mgbe ahụ, Jehoiada sịrị ha, “Nwa eze ga-achị dịka Onyenwe anyị kwere na nkwa banyere agbụrụ Devid.

23:4Ugbu a, nke a bụ ihe unu ga-eme: Otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nke ndị nchụaja na ndị Livayị, bụ ndị ga-abịa ọrụ nʼụbọchị izuike ga-abụ ndị ga-eche ọnụ ụzọ niile nche.

23:5Otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nke ọzọ ga-anọ nʼụlọeze, ebe otu ụzọ ga-anọ nʼọnụ ụzọ Ntọala. Ndị ọzọ niile ga-anọ gburugburu mpụta ụlọnsọ Onyenwe anyị.

23:6Ọ dịghị onye ọbụla ga-abata nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị karịa naanị ndị nchụaja na ndị Livayị ndị nọ ọrụ, ha ga-abata nʼihi ha bụ ndị edoro nsọ, ma ndị ọzọ niile ga-edebe iwu Onyenwe anyị, ghara ịbata.

23:7Ndị Livayị ga-edo onwe ha gburugburu eze, onye ọbụla ga e jide ihe agha nʼaka ya. Onye ọbụla batara nʼime ụlọnsọ ahụ ka a ga-egbu. Nọrọnụ eze nso, ebe ọbụla ọ gara, mgbe ọ na-apụ nʼezi na mgbe ọ na-aba nʼime.”

23:8Ndị Livayị na ndị ikom Juda niile mere dịka Jehoiada, onye nchụaja nyere nʼiwu. Onye ọbụla kpọọrọ ndị ikom ya, ma ndị na-abata ịrụ ọrụ nʼụbọchị izuike ma ndị na-emechi ọrụ. Nʼihi na Jehoiada onye nchụaja ezipụghị otu ọbụla nʼime ndị ọrụ ahụ niile.

23:9O nyere ndị ọchịagha ahụ na-elekọta narị ndị agha, ùbe na ọta ukwu na ọta nta niile, ndị bụrịị nke eze Devid, bụ ndị dị nʼụlọnsọ Chineke.

23:10O guzobere ndị ikom niile ahụ, onye ọbụla ji ngwa agha ya nʼaka ya, nọdụ eze gburugburu na nso ebe ịchụ aja na ụlọnsọ ukwu ahụ. Site nʼakụkụ ndịda ruo nʼakụkụ ugwu nke ụlọnsọ ukwu ahụ.

23:11Jehoiada na ụmụ ya ndị ikom kpọpụtara nwa eze, kpube ya okpueze nʼisi, ha nyere ya otu akwụkwọ nke ihe ọgbụgba ndụ ahụ, chie ya eze. Ha tekwara ya mmanụ ịbụ eze, tie mkpu sị, “Ka eze dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi!”

23:12Mgbe Atalaya nụrụ mkpọtụ ndị mmadụ, ndị na-agba ọsọ na-eto eze, ọ gakwuru ha nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.

23:13O lepụrụ anya, ma lee eze, ka o guzo nʼakụkụ ogidi ya dị na mbata. Ndịisi na ndị na-afụ opi nọ nʼakụkụ eze, ndị niile nke ala ahụ nọkwa na-aṅụrị ọṅụ na-afụ opi. Ndị ọbụ abụ jikwa iti egwu na-edu nʼabụ otuto. Mgbe ahụ, Atalaya dọwara uwe ya, sị, “Nke a bụ nnupu isi megide eze! Nke a bụ nnupu isi megide ọchịchị!”

23:14Jehoiada, bụ onye nchụaja zipụrụ ndị ọchịagha na-achị narị ndị agha, bụ ndị na-elekọta usuu ndị agha, sị ha, “Sitenụ nʼetiti ahịrị ahụ kpụpụta ya nʼetiti ahịrị unu, onye ọbụla nke gbasoro ya, werenụ mma agha gbuo onye ahụ.” Nʼihi na onye nchụaja sịrị, “Ka egbula ya na ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.”

23:15Ya mere, ha jidere ya mgbe o rutere na mbata nke ọnụ ụzọ ịnyịnya nʼogige ụlọeze, ebe ahụ ka ha gburu ya.

23:16Jehoiada mere ka ọgbụgba ndụ dị, na ya, na ndị mmadụ, na eze, ga-abụ ndị nke Onyenwe anyị.

23:17Ndị niile ahụ gara nʼụlọ nchụaja Baal kwatuo ya. Ha tidasịrị ebe nchụaja na arụsị niile dị nʼebe ahụ, gbukwaa Matan onye nchụaja Baal nʼihu ebe ịchụ aja ahụ.

23:18Mgbe ahụ, Jehoiada nyefere nlekọta nke ụlọnsọ ukwuu Onyenwe anyị nʼaka ndị nchụaja bụ ndị Livayị, bụ ndị Devid nyere ọrụ ịchụ aja nsure ọkụ nke Onyenwe anyị nʼime ụlọnsọ, dịka e dere ya nʼiwu Mosis, nʼiji ọṅụ na ịbụ abụ dịka Devid nyere nʼiwu.

23:19O debekwara ndị nche nʼọnụ ụzọ ama ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, igbochi ka onye ọbụla nke na-adịghị ọcha nʼụzọ ọbụla ghara ịbanye.

23:20Ọ kpọọrọ ndị ọchịagha na-achị narị ndị agha, na ndị a na-asọpụrụ, na ndị na-achị achị, na ndị ala ahụ niile, dupụta eze site nʼụlọnsọ Onyenwe anyị. Ha bara nʼụlọeze site nʼọnụ ụzọ ama nke dị Elu, mee ka eze nọkwasị nʼelu ocheeze.

23:21Ndị ala ahụ niile ṅụrịrị ọṅụ nke ukwuu, obodo ahụ dakwara jụụ, nʼihi na e ji mma agha gbuo Atalaya nʼụlọeze.

Akara: okwu akụkọ ọ bụla nwere, na nsụgharị ị na-agụ. A naghị aka akara nʼokwu ndị a na-ahụkarị (“na”, “ọ”); okwu nʼụdị ọzọ nwere ike ọ gaghị enwe akara.

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · E ji aka họrọ akụkụ yiri ibe ha site nʼederede ma lelee ha megide ntụaka gafere OpenBible.info (CC BY). Naanị otu ihe mere ma ọ bụ otu okwu e kwuru ka a na-etinye nʼakụkụ ibe ha. OpenBible.info · CC BY