Bible Explorer

Nyochaa › Ndị Eze na Ihe E Mere nʼakụkụ ibe ha › Ndị eze Juda

Ndị Eze na Ihe E Mere nʼakụkụ ibe ha · Ndị eze Juda

Ahazaya eze Juda

2Ez 8:25–29 · 2Ih 22:1–6

2 Ndị Eze

2Ez 8:25–29

25Nʼafọ nke iri na abụọ nke ọchịchị Joram nwa Ehab, bụ eze Izrel, ka Ahazaya nwa Jehoram, bụ eze Juda malitere ịchị.

26Ahazaya gbara iri afọ abụọ na abụọ mgbe ọ malitere ịbụ eze, ọ chịrị otu afọ na Jerusalem. Aha nne ya bụ Atalaya, nwa nwa Omri, eze Izrel

27O soro ụzọ niile nke ndị ezinaụlọ Ehab, mee ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị dịka ezinaụlọ Ehab mere, nʼihi na ọ lụrụ nwanyị si nʼezinaụlọ Ehab.

28Ahazaya sooro Joram nwa Ehab, gaa ibuso Hazael eze Aram agha na Ramọt Gilead. Ndị Aram merụrụ Joram ahụ.

29Ya mere, eze Joram lọghachitere na Jezril, ka a gwọọ ya mmerụ ahụ ndị Aram merụrụ ya na Ramọt, nʼagha nke ya na Hazael eze Aram lụrụ. Mgbe ahụ, Ahazaya nwa Jehoram eze Juda, gara Jezril ileta Joram nwa Ehab, nʼihi na e merụrụ ya ahụ.

2 Ihe E Mere

2Ih 22:1–6

1Ndị Jerusalem mere Ahazaya, nwa Jehoram nke nta, eze nʼọnọdụ ya, nʼihi na ndị na-apụnara mmadụ ihe nʼike, bụ ndị ha na ndị Arab so bata nʼụlọ ikwu ha, egbuolarị ụmụnne ya ndị okenye. Ya mere Ahazaya, nwa Jehoram bụ eze Juda malitere ịchị.

2Ahazaya gbara iri afọ abụọ na abụọ mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịrị otu afọ na Jerusalem. Aha nne ya bụ Atalaya nwa nwa Omri eze Izrel.

3Ya onwe ya sokwara ụzọ niile nke ndị ezinaụlọ Ehab, nʼihi na nne ya gbara ya ume ime ajọ omume.

4O mere ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị dịka ezinaụlọ Ehab mere nʼihi na ha ghọrọ ndị ndụmọdụ ya mgbe nna ya nwụsịrị, nke a wetara ọdịda ya.

5O gbasokwara ndụmọdụ ha, mgbe o sooro Joram nwa Ehab, bụ eze Izrel, ịga buso Hazael eze Aram agha na Ramọt Gilead. Ndị Aram merụrụ Joram ahụ,

6ya mere, ọ lọghachitere na Jezril ka a gwọọ ya mmerụ ahụ ha merụrụ ya na Ramọt, nʼagha nke ya na Hazael eze Aram lụrụ. Mgbe ahụ, Ahazaya nwa Jehoram, eze Juda gara Jezril ileta Joram nwa Ehab, nʼihi na e merụrụ ya ahụ.

Akara: okwu akụkọ ọ bụla nwere, na nsụgharị ị na-agụ. A naghị aka akara nʼokwu ndị a na-ahụkarị (“na”, “ọ”); okwu nʼụdị ọzọ nwere ike ọ gaghị enwe akara.

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · E ji aka họrọ akụkụ yiri ibe ha site nʼederede ma lelee ha megide ntụaka gafere OpenBible.info (CC BY). Naanị otu ihe mere ma ọ bụ otu okwu e kwuru ka a na-etinye nʼakụkụ ibe ha. OpenBible.info · CC BY