Bible Explorer Nweta ngwa

Nyochaa › Ụzọ njem › Njem mbụ nke Sọl

Ụzọ njem

Njem mbụ nke Sọl

Damaskọs, Jerusalem, Tasọs na Antiọk · Ebe nkwụsị 8 · ≈ 2,150 km nʼahịrị kwụ ọtọ

Osimiri MediterenịaSaiprọsSILISIAJerusalemDamaskọsSizariaTasọsAntiọk100 km12456

© OpenStreetMap contributors

Ebe nkwụsị

  1. JerusalemỌrụ 9:2rịọ ya ka o nye ya akwụkwọ ozi nke ọ ga-eji jekwuru ndị ụlọ nzukọ ndị Juu dị na Damaskọs, nke ọ ga-abụ ọ hụ onye ọbụla na-eso Ụzọ ahụ ma ha bụ nwoke ma ha bụ nwanyị, ka ọdọkpụrụ ha nʼagbụ, kpụgaa Jerusalem.
  2. DamaskọsỌrụ 9:8Sọl si nʼala bilie, ma nʼagbanyeghị nʼanya ya meghere emeghe, ọ dịghị ihe o nwere ike ịhụ. Nke a mere na ha sekpụrụ ya nʼaka dubata ya na Damaskọs.
  3. JerusalemỌrụ 9:26Mgbe o rutere Jerusalem, ọ gbalịrị ịdịnyere ndị na-eso ụzọ Jisọs nọ nʼebe ahụ, ma ha tụrụ egwu. Ha ekwenyeghị na ọ ghọọla ezi onye na-eso ụzọ Jisọs dịka ha.
  4. SizariaỌrụ 9:30Mgbe ndị kwere ekwe nụrụ banyere nzube ha, ha duuru ya gaa Sizaria site nʼebe ahụ zipụ ya ka ọ laa obodo Tasọs.
  5. TasọsỌrụ 9:30Mgbe ndị kwere ekwe nụrụ banyere nzube ha, ha duuru ya gaa Sizaria site nʼebe ahụ zipụ ya ka ọ laa obodo Tasọs.
  6. AntiọkỌrụ 11:26Mgbe ọ chọpụtara ya, o duuru ya bịa nʼAntiọk. Ihe ha ka otu afọ, ka ha na-ezukọ nʼụlọ chọọchị na-akụziri ọtụtụ igwe mmadụ ihe. Ọ bụ nʼime Antiọk ka e buru ụzọ kpọọ ndị na-eso ụzọ ya ndị Kraịst.
  7. JerusalemỌrụ 12:25Mgbe ha rụchara ọrụ ha, Banabas na Sọl si Jerusalem lọghachi. Ha kpọọrọ Jọn onye a na-akpọkwa Mak nʼije ha.
  8. AntiọkỌrụ 13:1Ndị amụma na ndị nkuzi ụfọdụ nọkwa na nzukọ dị nʼAntiọk. Ụfọdụ nʼime ha bụ Banabas na Simiọn onye a na-akpọ nwoke ojii, na Lusiọs onye Sirini, na Manaen (onye azụlitekọrọ ya na eze Herọd), na Sọl.

Ahịrị na-ejikọ ebe nkwụsị n’usoro ederede. Ebe ahịrị na-eso ala, ọ bụ ụzọ e chere na ha gara dịka otu ọkà mmụta si wughachi ya; ebe ndị ọzọ ọ kwụ ọtọ — amaghị ụzọ ahụ. Anya dị n’etiti ebe nkwụsị bụ ahịrị kwụ ọtọ. Ahịrị kpụkọrọ: n’ụgbọ mmiri. Ndị na-adịghị ike: ebe ahụ ejighị n’aka.

Ntụpọ ọ bụla bụ ebe kachasị ike ịbụ; ntụpọ na-acha mmịrị mmịrị pụtara na amaghị nke ọma ebe ọ bụ. Ebe a na-amaghị ebe ha dị anọghị na maapụ.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · UBS Bible Routes, Dr Leen Ritmeyer © United Bible Societies 2023, CC BY-SA 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike