Nyochaa › Ụzọ njem › Njem Ịlaịja
Ụzọ njem
Njem Ịlaịja
Site nʼiyi Kerit ruo Horeb na Jọdan · Ebe nkwụsị 13 · ≈ 1,210 km nʼahịrị kwụ ọtọ
Ebe nkwụsị
- 1
Gilead1Ez 17:1Ugbu a, Ịlaịja onye Tishbe, onye si obodo Tishbe, nke dị nʼala Gilead, sịrị Ehab, “Eji m aha Onyenwe anyị Chineke Izrel dị ndụ, onye m na-efe na onye m na-ejere ozi na-agwa gị na igirigi agaghị ada, mmiri agaghị ezo ọzọ nʼafọ ndị a na-abịa karịa ma ọ bụghị naanị site nʼokwu ọnụ m!”
- 2
Kerit1Ez 17:5O mere ihe Onyenwe anyị gwara ya ka o mee. Ọ gara nʼakụkụ iyi nta Kerit nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Jọdan nọrọ nʼebe ahụ.
- 3
Zarefat1Ez 17:10Ịlaịja biliri jee Zarefat. Mgbe o ruru ọnụ ụzọ ama e si abanye obodo ahụ, ọ hụrụ otu nwanyị di ya nwụrụ ka ọ nọ na-achịkọta nkụ. Ịlaịja kpọrọ ya oku sị ya, “Biko, kutere m ntakịrị mmiri nʼiko ka m ṅụọ.”
- 4
Ugwu Kamel1Ez 18:20Ehab zigara ozi kpọkọta ndị Izrel niile, na ndị amụma ahụ niile. Ha niile bịakwara nʼugwu Kamel.
- 5
Kishọn1Ez 18:40Mgbe ahụ, Ịlaịja nyere ha iwu sị, “Jidenụ ndị amụma Baal niile. Unu ekwekwala ka otu onye nʼime ha laa.” Ha jidekwara ha niile. Ịlaịja dukwaara ha niile gaa na ndagwurugwu iyi Kishọn, gbuo ha nʼebe ahụ.
- 6
Jezril1Ez 18:46Ma ike Onyenwe anyị bịakwasịrị Ịlaịja. Ọ fanyere ọnụ uwe mwụda ya na belịt o kere nʼukwu, gbapụ ọsọ buru Ehab ụzọ gbaruo obodo Jezril.
- 7
Bịasheba1Ez 19:3Ịlaịja tụrụ egwu, gbapụ ọsọ, nʼihi ichebe ndụ ya. Mgbe ọ bịaruru Bịasheba, dị na Juda, ọ hapụrụ nwokorobịa na-ejere ya ozi nʼebe ahụ.
- 8
Horeb1Ez 19:8Ịlaịja biliri rie ihe, ṅụọkwa mmiri. Nri ahụ nyere ya ike ije ije iri ụbọchị anọ ọzọ, ehihie na abalị, tutu ruo mgbe ọ bịaruru nʼugwu Horeb nke bụ ugwu Chineke.
- 9
Damaskọsa kọghị na ha rutere1Ez 19:15Onyenwe anyị sịrị ya, “Sikwa ụzọ i si bịa laghachi, gaa nʼọzara Damaskọs. Mgbe i ruru ebe ahụ, tee Hazael mmanụ ịbụ eze Aram.
- 10
Gilgal2Ez 2:1O ruo mgbe Onyenwe anyị chọrọ ị kpọrọ Ịlaịja laa nʼeluigwe site nʼoke ifufe, Ịlaịja na Ịlaisha nọ nʼụzọ sitere Gilgal.
- 11
Betel2Ez 2:2Ịlaịja sịrị Ịlaisha, “Nọdụ nʼebe a, nʼihi na Onyenwe anyị ziri m ozi ka m gaa Betel.” Ma Ịlaisha zara sị ya, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, na dịka gị onwe gị nọkwa na-adị ndụ, agaghị m ahapụ gị.” Ya mere, ha abụọ sooro gaa Betel.
- 12
Jeriko2Ez 2:4Mgbe ahụ, Ịlaịja sịrị ya, “Ịlaisha, nọdụ nʼebe a, nʼihi na Onyenwe anyị ziri m ozi ka m gaa Jeriko.” Ma ọ zara, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, na dịka gị onwe gị nọkwa na-adị ndụ, agaghị m ahapụ gị.” Ya mere ha abụọ sokwaara ruo Jeriko.
- 13
Jọdan2Ez 2:6Mgbe ahụ, Ịlaịja sịrị ya, “Nọdụ nʼebe a, nʼihi na Onyenwe anyị ziri m ka m jee Jọdan.” Ma ọ zara, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, na dịka gị onwe gị nọkwa na-adị ndụ, agaghị m ahapụ gị.” Ya mere, ha abụọ sooro na-eje.
Ahịrị na-ejikọ ebe nkwụsị nʼusoro ederede — amaghị ụzọ ndị ahụ nʼonwe ha. Ahịrị kpụrụ akpụ: site nʼụgbọ mmiri. Na-acha mmịrị mmịrị: amaghị nke ọma ebe ọ dị.
Ntụpọ ntụpọ: ebe njem ahụ na-aga — ederede ekwughị na ha rutere ebe ahụ; ahịrị ahụ na-aga nʼihu site nʼebe nkwụsị gara aga.
Ntụpọ ọ bụla bụ ebe kachasị ike ịbụ (OpenBible.info); ntụpọ na-acha mmịrị mmịrị pụtara na amaghị nke ọma ebe ọ bụ. Ebe a na-amaghị ebe ha dị anọghị na maapụ.
Ebe ha dị: OpenBible.info Bible Geocoding Data (CC BY 4.0).
Ọdịdị ala: Natural Earth (ihe nke ọha).