Nyochaa › Ụzọ njem › Devid na-agba ọsọ
Ụzọ njem
Devid na-agba ọsọ
Ọ gbapụrụ Sọl, wee bụrụ eze na Hebrọn na Jerusalem · Ebe nkwụsị 13 · ≈ 420 km nʼahịrị kwụ ọtọ
Ebe nkwụsị
- Rema1Sa 19:18
Mgbe Devid gbara ọsọ gbalaga, ọ gakwuru Samuel na Rema, kọrọ ya ihe niile Sọl mere ya. Ya na Samuel gara biri na Naịọt.
- Nob1Sa 21:1
Devid jere nʼobodo Nob ịhụ Ahimelek, onye nchụaja. Ahimelek mara jijiji mgbe ọ hụrụ Devid. Ọ sịrị Devid, “Gịnị mere naanị gị ji bịa? Gịnị mere o nweghị onye so gị?”
- Gat1Sa 21:10
Nʼụbọchị ahụ, Devid gbapụrụ ọsọ site nʼebe Sọl nọ gbakwuru Akish eze ndị Gat.
- Adulam1Sa 22:1
Devid hapụrụ Gat gbaba nʼọgba nkume Adulam. Mgbe ụmụnne ya ndị ikom na ndị ezinaụlọ nna ya nụrụ nke a, ha jekwuru ya nʼebe ahụ.
- Mizpa1Sa 22:3
Devid sitere nʼebe ahụ jee Mizpa dị na Moab rịọọ eze obodo ahụ sị, “Biko, ị ga-ekwe ka nna m na nne m pụta bịa biri nʼetiti unu tutu ruo mgbe m matara ihe Chineke na-aga imere m?”
- Heret1Sa 22:5
Ma Gad onye amụma sịrị Devid, “Anọgidela nʼebe ahụ e wusiri ike, kama laghachi nʼala Juda.” Ya mere, Devid biliri gaa nʼoke ọhịa Heret.
- Keila1Sa 23:5
Ya mere, Devid na ndị agha ya gara Keila buso ndị Filistia agha. Ndị agha Devid gburu ọtụtụ ndị Filistia kpokọrọ igwe anụ ụlọ ha. Ha zọpụtakwara ndị Keila.
- Zif1Sa 23:14
Nʼoge a, Devid nọgidere nʼebe e wusiri ike dị nʼọzara, na nʼala ugwu ugwu nke ọzara Zif. Ụbọchị niile, Sọl chọgharịrị ya ma Chineke enyefeghị Devid nʼaka ya.
- Maon1Sa 23:24
Ha biliri buru Sọl ụzọ gawa Zif. Nʼoge a, Devid na ndị agha ya nọ nʼọzara Maon, nʼime Araba, na ndịda Jeshimọn.
- Ziklag1Sa 27:6
Akish nyere ya Ziklag, nʼihi ya, Ziklag bụ obodo ndị eze Juda ruo taa.
Ahịrị na-ejikọ ebe nkwụsị nʼusoro ederede — amaghị ụzọ ndị ahụ nʼonwe ha. Ahịrị kpụrụ akpụ: site nʼụgbọ mmiri. Na-acha mmịrị mmịrị: amaghị nke ọma ebe ọ dị.
Ntụpọ ọ bụla bụ ebe kachasị ike ịbụ (OpenBible.info); ntụpọ na-acha mmịrị mmịrị pụtara na amaghị nke ọma ebe ọ bụ. Ebe a na-amaghị ebe ha dị anọghị na maapụ.
Ebe ha dị: OpenBible.info Bible Geocoding Data (CC BY 4.0).
Ọdịdị ala: Natural Earth (ihe nke ọha).