Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2027 › 19 Disemba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 19 Disemba 2027

Sọnde · Izu nke 4 nke Advent

Mmemme na ndị nsọ

Sọnde nke 4 nke Advent

Sọnde · Agba ofufe: odo odo

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Mai 5:2–5

2“Ma gị onwe gị, Betlehem Efrata, ọ bụ ezie na ị bụ obodo dị nta nʼetiti ndị ikwu Juda niile, ma onye ahụ ga-achị Izrel ga-esi na gị pụta, bụ onye ahụ mmalite ya sitere na mgbe ochie, sitekwa na mgbe ebighị ebi gara aga.” 3Ya mere, a ga-arara ha nye tutu ruo mgbe onye ahụ ime na-eme mụpụtara nwa ya. Mgbe ahụ, ụmụnna ya niile ahụ fọdụrụ ga-alọghachikwuru ndị Izrel. 4Ọ ga-eguzo zụọ igwe ewu na atụrụ ya, site nʼike nke Onyenwe anyị, na site nʼịdị ukwuu nke aha Onyenwe anyị Chineke ya. Ndị ya ga-anọkwa na-enweghị nsogbu, nʼihi na ịdị ukwuu ya ga-eru na nsọtụ niile nke ụwa. 5Ọ ga-abụkwa udo anyị. Mgbe ndị Asịrịa ga-abata nʼala anyị nʼike, sikwa nʼebe niile e wusiri ike nke anyị na-agafe, anyị ga-ahọpụta ndị ọzụzụ atụrụ asaa, ọ bụladị ndịisi asatọ.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 80:1–2, 14–15, 17–18

1Abụ Ọma nke dịrị onyeisi Abụ. Ọ bụ olu abụ eji ekwe “Okoko lili nke Ọgbụgba Ndụ” Abụ Ọma nke Asaf. Nụrụ olu anyị, O Onye ọzụzụ atụrụ nke Izrel, gị onye na-edu Josef dịka igwe atụrụ. Gị onye na-anọdụ dịka eze, nʼetiti cherubim, nwupụta Ìhè 2nʼihu Ifrem, Benjamin na Manase. Kpọtee ịdị ike gị, bịa zọpụta anyị. 14Lọghachikwute anyị, O Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile. Si nʼeluigwe ledata anya ma hụ! Letakwa osisi vaịnị a, 15mgbọrọgwụ nke aka nri gị kụrụ, ọkpara nke ị zụlitere nye onwe gị. 17Ka aka gị dịkwasị nwoke ahụ nọ nʼaka nri gị, nwa nke mmadụ onye ị zụlitere nye onwe gị. 18Mgbe ahụ, anyị agaghị esikwa nʼebe ị nọ laghachi azụ; tutee anyị, anyị ga-akpọkukwa aha gị.

Ihe ọgụgụ nke abụọ

Hib 10:5–10

5Ya mere mgbe Kraịst bịara nʼụwa, ọ sịrị, “Aja na onyinye abụghị ihe ị chọrọ kama ị kwadoro ahụ nye m. 6Aja nsure ọkụ na aja a chụrụ maka mmehie, ha abụghị ihe dị ezi mma nye gị. 7Mgbe ahụ ka m sịrị, ‘Lee, abịala m Chineke m, ime ihe ị na-achọ. Nke a bụkwa ihe e dere banyere m nʼime akwụkwọ mpịakọta.’ ” 8O kwuru na mbụ, “Aja dị iche iche, na onyinye, na aja nsure ọkụ na aja mmehie adịghị atọ gị ụtọ, ha adịghịkwa amasị gị” (a chụrụ aja ndị a dịka iwu si dị). 9O kwukwara ọzọ, “Lee abịala m ime uche gị.” Ọ kagburu aja nke mbụ ahụ ma were aja nke abụọ dochie nʼọnọdụ ya. 10Site nʼime uche Chineke, e mere ka anyị dị nsọ site nʼaja Jisọs Kraịst ji onwe ya chụọ naanị otu ugboro.

Oziọma

Luk 1:39–45

39Nʼoge ahụ, Meri biliri gaa ọsịịsọ nʼotu obodo dị nʼugwu Juda. 40Nʼebe ahụ, ọ banyere nʼụlọ Zekaraya, kelee Elizabet. 41Mgbe Elizabet nụrụ ekele Meri, nwa nọ ya nʼafọ megharịrị ahụ. E mere ka Elizabet jupụta na Mmụọ nsọ. 42O tiri mkpu nʼoke olu sị, “Onye a gọziri agọzi ka ị bụ nʼetiti ụmụ nwanyị niile. Onye a gọziri agọzi ka nwa ahụ ị bu nʼafọ bụkwa. 43Onye kwanụ ka m bụ na ihuọma dị otu a kpọrọ m na nne Onyenwe m ga-abịa ileta m? 44Ngwangwa m nụrụ olu ekele gị, nwa nọ m nʼafọ wuliri elu nʼọṅụ. 45Ngọzị ga-adịrị onye ahụ kwere na Onyenwe anyị ga-emezu ihe o kweere ya na nkwa ime.”

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde C, afọ ụbọchị izu II.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike