Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2027 › 19 Disemba
Kalenda Ọtọdọks · 6 Disemba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 19 Disemba 2027
Sọnde · Olu 1
Mmemme na ndị nsọ
Sọnde nke 26 mgbe Pentikọọsụ gasịrị
Obubu ọnụ Ọmụmụ
E kwere azụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
31Nʼọnụ onye ezi omume ka mkpụrụ amamihe si abịa, ma ire na-ekwu okwu nduhie ka a ga-eme ka o dere duu. 32Egbugbere ọnụ onye ezi omume mara ihe na-eweta ihuọma, ma ọnụ ndị ajọ omume bụ naanị okwu nduhie. 11:1Ihe ọtụtụ aghụghọ bụ arụ nʼihu Onyenwe anyị ma ihe ọtụtụ zuru ezu na-anata ihuọma nʼebe ọ nọ. 2Nganga bịa, nlelị a na-eso ya, ma onye dị umeala nʼobi na-amụta ihe. 3Eziokwu nke ndị ziri ezi nʼobi na-edu ha; ma omume gbagọrọ agbagọ nke ndị aghụghọ nʼala ha nʼiyi. 4Akụnụba gị agaghị azọpụta gị nʼụbọchị ikpe; ọ bụ naanị ezi omume na-anapụta site nʼọnwụ. 5Ezi omume nke ndị na-enweghị ịta ụta na-eme ka ụzọ ha zie ezi, ma ajọ omume nke ndị na-emebi iwu na-akwada ha. 6Ezi omume nke onye ziri ezi na-azọpụta ya; ma ọchịchọ ọjọọ nke ndị na-aghọ aghụghọ ka a ga-eji jide ha. 7Mgbe onye ajọ omume nwụrụ, olileanya ya niile alala nʼiyi, ihe niile ọ na-ele anya inweta site nʼike ya alaakwala nʼiyi. 8Chineke na-azọpụta ndị ezi omume site na nsogbu ha, ma ndị ajọ omume ka ọ na-ahapụ ka ha daba nʼime ya. 9Okwu ọjọọ ka onye ajọ omume ji emebi onye agbataobi ya. Ma site nʼihe ọmụma ka onye ezi omume ga-eji dọpụta ndụ ya. 10Ọganihu nke onye ezi omume na-atọ mmadụ niile ụtọ, otu aka ahụ kwa, ọnwụ onye ajọ omume na-atọ mmadụ niile ụtọ. 11A na-esite na ngọzị nke ndị ziri ezi bulie obodo elu, ma a nʼala ya nʼiyi site nʼokwu ọnụ ndị ajọ omume. 12Ikwu okwu nleda megide onye agbataobi gị bụ nzuzu; ma onye ahụ nwere nghọta na-agba nkịtị.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
Ọ dịghị na nsụgharị a
Oziọma ofufe ụtụtụ nke 4
1Nʼụbọchị mbụ nke izu ụka, nʼezigbo isi ụtụtụ, ha weere mmanụ otite ahụ ha tinyere ọtụtụ ụda nke ha kwadoro gawa nʼili ahụ. 2Ha chọpụtara na e nupụla nkume e ji dochie nʼọnụ ili ahụ. 3Ma mgbe ha banyere nʼime ya, ha ahụghị ahụ Onyenwe anyị Jisọs. 4Dị ka ha nọ na mgbagwoju anya banyere nke a, nʼotu ntabi anya, ha hụrụ mmadụ abụọ yi uwe na-egbu ka amụma guzo ha nso. 5Ha kpudoro ihu ha nʼala nʼihi oke egwu, ma mmadụ abụọ ahụ gwara ha, “Gịnị mere unu ji na-achọ onye dị ndụ nʼetiti ndị nwụrụ anwụ? 6Ọ nọkwaghị nʼebe a, o biliela nʼọnwụ, chetakwanụ ihe ọ gwara unu mgbe unu na ya nọ na Galili sị, 7‘A ghaghị inyefe Nwa nke Mmadụ nʼaka ndị mmehie, a ga-akpọgidekwa ya nʼobe ma nʼụbọchị nke atọ ọ ga-esi nʼọnwụ bilie.’ ” 8Mgbe ahụ ha chetara okwu ya. 9Mgbe ha sitere nʼili ahụ lọghachi, ha kọọrọ mmadụ iri na otu ahụ na ndị ọzọ niile ihe ndị a. 10Ọ bụ Meri Magdalin, na Joana, na Meri nne Jemis na ụmụ nwanyị ndị ọzọ so ha kọọrọ ndị na-eso ụzọ ya ihe a. 11Ma ha ekweghị ihe ha gwara ha, nʼihi na okwu ha dị ha ka ọ bụ ihe efu. 12Ma otu ọ dị, Pita gbaara ọsọ ruo nʼili ahụ, hulata ala hụ ka akwa ozu ndị ahụ tọgbọọrọ onwe ha; ọ lara na-atụgharị uche nʼime onwe ya ihe ihe ndị a pụtara.
Akwụkwọ ozi
8Nʼihi nʼoge gara aga, unu bụ ọchịchịrị, ma ugbu a, unu bụ ìhè nʼime Onyenwe anyị. Na-ebinụ ndụ ka ụmụ nke ìhè 9(nʼihi na a na-ahụ mkpụrụ nke ìhè nʼihe niile dị mma, na ihe ziri ezi, na eziokwu). 10Gbalịanụ ịchọpụta ihe na-amasị Onyenwe anyị. 11Unu etinyela aka nʼọrụ ọchịchịrị nke na-adịghị amị mkpụrụ ọbụla, kama gbaanụ ha nʼanwụ. 12Ọ bụ ihe ihere ikwu okwu banyere ihe ndị a na-eme na nzuzo. 13Mgbe a gbara ihe ọbụla nʼanwụ, ọ na-apụta ìhè nke ọma. Nʼihi na ihe ọbụla e mere ka ọ pụta ìhè nke ọma bụ ìhè. 14Nke a mere na e kwuru, “Bilie gị onye na-arahụ ụra. Site nʼọnwụ bilie. Kraịst ga-emekwa ka ihe ya mụkwasị gị.” 15Kpachapụnụ anya otu unu si ebi ndụ unu. Unu ebila ndụ dị ka ndị nzuzu, kama bienụ ndụ dị ka ndị maara ihe. 16Jirinụ ohere niile unu nwere rụọ ọrụ ọma, nʼihi na ụbọchị ndị a dị njọ. 17Unu emela dị ka ndị na-enweghị uche, kama gbalịanụ ịchọpụta ihe Onyenwe anyị chọrọ ka unu mee, 18Unu aṅụbigala mmanya oke nʼihi na ọ na-eduba na ndụ ịla nʼiyi. Kama jupụtanụ na Mmụọ Nsọ, 19werenụ abụ ọma, na abụ nke ime mmụọ na-ekwe ukwe nʼetiti onwe unu. Werekwanụ obi unu niile na-abụrụ Onyenwe anyị abụ dị ụtọ.
Akwụkwọ ozi (maka Onye nsọ Nikolas)
17Ka unu na-ekwenyere ndị ndu unu, dokwaanụ onwe unu nʼokpuru ha. Nʼihi na ọrụ ha bụ ịhụ maka mkpụrụobi unu dịka ndị ga-aza azịza. Meenụ nke a ka ha were ọṅụ na-eje ozi ha, ma ọ bụghị site nʼobi mwute nʼihi na nke a agaghị abara unu uru. 18Na-ekperenụ anyị ekpere, nʼihi na o doro anyị anya na anyị nwere akọnuche dị ọcha na-achọkwa ibi ndụ nwere ugwu nʼụzọ niile. 19Ana m arịọsị unu ya ike, ka unu mee nke a, ka m nwee ike ịlọghachikwute unu ọsịịsọ. 20Ugbu a ka Chineke nke udo, onye ahụ sitere nʼọbara ọgbụgba ndụ ebighị ebi ahụ kpọghachite Onyenwe anyị Jisọs, Onye ọzụzụ atụrụ ukwuu ahụ, site nʼọnwụ, 21mee ka unu zuo oke nʼezi ihe ọma niile ọbụla, nke ga-enyere unu aka ime ihe ọ na-achọ. Ka ọ rụpụta nʼetiti anyị ihe ndị ahụ niile na-atọ ya ụtọ site na Jisọs Kraịst, onye otuto niile dịrị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen.
Oziọma
12Mgbe ọ banyere nʼotu obodo nta, ndị ekpenta iri sitere nʼebe dị anya zute ya. 13Ha tiri mkpu nʼoke olu sị, “Jisọs nna anyị ukwuu, mere anyị ebere.” 14Mgbe ọ hụrụ ha, ọ sịrị ha, “Gaanụ gosi ndị nchụaja onwe unu.” Dị ka ha na-aga, e mere ka ha dị ọcha. 15Mgbe otu nʼime ha chọpụtara na a gwọọla ya, ọ laghachiri azụ, jiri oke olu na-eto Chineke. 16Ọ dara nʼala nʼụkwụ ya, kelee ya. Ọ bụ onye Sameria. 17Jisọs jụrụ sị, “Ọ bụghị mmadụ iri ka e mere ka ha dị ọcha, ebeekwanụ ka itoolu ndị ọzọ nọ? 18Ọ bu naanị onye mba ọzọ a lọghachiri inye Chineke otuto?” 19Mgbe ahụ, ọ sịrị ya, “Bilie, laa, okwukwe gị agwọọla gị.”
Oziọma (maka Onye nsọ Nikolas)
17Ya na ha rịdatara ga nʼebe ala dị larịị. Igwe ndị na-eso ụzọ ya na oke igwe mmadụ sitere na Judịa, na Jerusalem nakwa obodo dị na nsọtụ mmiri nke Taịa na Saịdọn. 18Ndị bịara ịnụrụ okwu ya na ka a gwọọ ha ọrịa ha. A gwọkwara ọtụtụ ndị mmụọ na-adịghị ọcha na-esogbu. 19Igwe mmadụ ahụ gbalịrị ịmetụ ya aka, nʼihi na ike dị ukwuu si ya nʼahụ na-apụ na-agwọ ha niile. 20O weliri anya lee ndị na-eso ụzọ ya, sị ha, “Ngọzị na-adịrị unu bụ ndị ogbenye, nʼihi na alaeze Chineke bụ nke unu. 21Ngọzị na-adịrị unu ndị agụụ na-agụ ugbu a, nʼihi na afọ ga-eju unu. Ngọzị na-adịrị unu ndị na-ebe akwa ugbu a, nʼihi na unu ga-achị ọchị. 22Ngọzị na-adịrị unu mgbe ndị mmadụ na-akpọ unu asị, mgbe ha na-achụpụ unu, na-akparị unu, na-ajụ aha unu, nʼihi Nwa nke Mmadụ. 23“Ṅụrịanụ ọṅụ ma wuliekwanụ elu nʼihi ọṅụ nʼụbọchị ahụ, nʼihi na ụgwọ ọrụ unu dị ukwuu nʼeluigwe. Nʼihi na otu a ka ndị nna nna ha mesoro ndị amụma.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 6 Disemba na kalenda nzukọ bụ 19 Disemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike