Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2027 › 12 Disemba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 12 Disemba 2027

Sọnde · Izu nke 3 nke Advent

Mmemme na ndị nsọ

Sọnde nke 3 nke Advent

Sọnde · Agba ofufe: pinki

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Zef 3:14–17

14Bụọ abụ, gị nwaada Zayọn; tie mkpu, gị Izrel. Ṅụrịa ọṅụ, e, jiri obi gị niile ṅụrịa ọṅụ, gị nwaada Jerusalem. 15Nʼihi na Onyenwe anyị ewezugala ahụhụ dịrị gị, chụghachikwa ndị iro gị azụ. Onyenwe anyị, onye bụ Eze Izrel, nọ nʼetiti gị. Ị gaghị atụkwa egwu ihe ọjọọ ọzọ. 16Nʼụbọchị ahụ, ihe a ga-agwa Jerusalem ga-abụ, “Atụla egwu, gị Zayọn, ekwela ka aka gị daa mba. 17Onyenwe anyị bụ Chineke gị nọ nʼetiti gị, ọ bụ Dike nʼagha nke na-enye mmeri. Ọ ga-eji ọṅụ nwee mmasị na ahụ gị; nʼihi ịhụnanya ya, ọ gaghị abakwara gị mba, kama ọ ga-eji oke iti mkpu abụ ṅụrịa ọṅụ nʼebe ị nọ.”

Abụ Ọma nzaghachi

Aịz 12:2–6

2Nʼezie, Chineke bụ onye nzọpụta m; aga m atụkwasị ya obi, ụjọ agaghị atụkwa m. Onyenwe anyị, Onyenwe anyị ya onwe ya, bụ ike m bụrụkwa abụ m, ọ ghọrọla m onye nzọpụta.” 3Ị ga-eji ọṅụ dọrọ mmiri site nʼolulu mmiri nke nzọpụta. 4Nʼụbọchị ahụ, ị ga-ekwukwa sị, “Nyenụ Onyenwe anyị otuto, Kwupụtakwa aha ya; meenụ ka amata nʼetiti mba niile ihe niile ọ rụrụ; kwusaanụ na aha ya bu ihe e buliri elu. 5Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, nʼihi na o meela oke ihe dị ebube. Meekwanụ ka ụwa niile mara ihe ọ rụrụ. 6Ka ndị niile bi na Zayọn tie mkpu ọṅụ, bụkwaa abụ. Nʼihi na Onye nsọ nke Izrel. dị ukwuu, e, ọ dị ike nke ukwuu, bụ Onye ahụ na-ebi nʼetiti unu.”

Ihe ọgụgụ nke abụọ

Fil 4:4–7

4Na-aṅụrịnụ ọṅụ mgbe niile nʼime Onyenwe anyị. Ka m kwuokwa ya ọzọ, ṅụrịanụ ọṅụ! 5Meenụ ka mmadụ niile jiri anya ha hụ na unu bụ ndị obiọma nʼihe niile unu na-eme. Chetanụ na ọbịbịa Onyenwe anyị dị nso. 6Unu echegbula onwe unu banyere ihe ọbụla. Kama nʼihe niile, sitenụ nʼekpere na arịrịọ, ya na ekele, chee ihe niile na-akpa unu nʼihu Chineke. 7Udo Chineke, nke dị ukwuu karịa ihe ọbụla mmadụ nwere ike ịghọta, ga-eche echiche uche unu na obi unu nche nʼime Kraịst Jisọs.

Oziọma

Luk 3:10–18

10Ma igwe mmadụ ahụ jụrụ ya sị, “Gịnị ka anyị kwesiri ime?” 11Ọ zara ha sị, “Onye ọbụla nwere uwe abụọ, ya nye onye ọ na-adịghị nke o nwere otu. Onye nwere nri ya meekwa otu ahụ.” 12Ọ bụladị ndị ọna ụtụ bịakwara ka e mee ha baptizim. Ha sịrị ya, “Onye ozizi, gịnị ka anyị kwesiri ime?” 13Ọ sịrị ha, “Unu anatala karịa otu unu kwesiri ịnata.” 14Ndị agha bịakwara jụọ ya sị, “Gịnịkwa ka anyị kwesiri ime?” Ọ sịrị ha, “Unu ejikwala ike apụnara ndị mmadụ ego ha; unu ebokwala ndị mmadụ ebubo ụgha, ka afọ ju unu nʼụgwọ a na-akwụ unu.” 15Ndị mmadụ ji olileanya na-eche na-atulekwa nʼobi ha ma Jọn ọ bụ Kraịst ahụ. 16Ma Jọn zara sị ha, “Eji m mmiri na-eme unu baptizim, ma otu onye dị ike karịa m ga-abịa, onye m na-erughị ịtọpụ eriri akpụkpọụkwụ ya. Ọ ga-eji Mmụọ Nsọ na ọkụ mee unu baptizim. 17Ihe ịfụcha ọka ya dị nʼaka ya, iji zachaa ebe ịzọcha ọka ya nke ọma, ka e kponye ezi mkpụrụ ọka wiiti nʼime ọba, ma kpoba igbugbo ọka nʼime ọkụ nke a na-apụghị imenyụ emenyụ.” 18O ji ọtụtụ okwu ọzọ dị iche iche dụọ ha ọdụ ma kwusaakwara ha oziọma.

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde C, afọ ụbọchị izu II.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike