Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2027 › 11 Disemba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 11 Disemba 2027
Satọdee · Izu nke 2 nke Advent
Mmemme na ndị nsọ
Satọdee nke izu nke 2 nke Advent
Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: odo odo
Onye nsọ Damasọs nke Mbụ, Pope · Ncheta a na-ahọrọ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
Ọ dịghị na nsụgharị a
Abụ Ọma nzaghachi
1Abụ Ọma nke dịrị onyeisi Abụ. Ọ bụ olu abụ eji ekwe “Okoko lili nke Ọgbụgba Ndụ” Abụ Ọma nke Asaf. Nụrụ olu anyị, O Onye ọzụzụ atụrụ nke Izrel, gị onye na-edu Josef dịka igwe atụrụ. Gị onye na-anọdụ dịka eze, nʼetiti cherubim, nwupụta Ìhè 2nʼihu Ifrem, Benjamin na Manase. Kpọtee ịdị ike gị, bịa zọpụta anyị. 14Lọghachikwute anyị, O Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile. Si nʼeluigwe ledata anya ma hụ! Letakwa osisi vaịnị a, 15mgbọrọgwụ nke aka nri gị kụrụ, ọkpara nke ị zụlitere nye onwe gị. 17Ka aka gị dịkwasị nwoke ahụ nọ nʼaka nri gị, nwa nke mmadụ onye ị zụlitere nye onwe gị. 18Mgbe ahụ, anyị agaghị esikwa nʼebe ị nọ laghachi azụ; tutee anyị, anyị ga-akpọkukwa aha gị.
Oziọma
10Ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya sị, “Gịnị mere ndị ozizi iwu ji na-ekwu na Ịlaịja aghaghị ibu ụzọ bịa?” 11Ọ zara sị, “Ọ bụ ezie, Ịlaịja na-abịa, ọ ga-emekwa ka ihe niile dị ka ọ dị na mbụ. 12Ma Ịlaịja abịalarị, ma ndị mmadụ amataghị ya. Kama ndị mmadụ emeela ya ihe ọjọọ dị iche iche. Otu a kwa ka mụ onwe m bụ Nwa nke Mmadụ ga-esi ahụ ahụhụ site nʼaka ha.” 13Mgbe ahụ ndị na-eso ụzọ ya ghọtara na ọ bụ Jọn omee baptizim ka ọ na-ekwu banyere ya.
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Damasọs nke Mbụ, Pope
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde C, afọ ụbọchị izu II.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike