Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2027 › 12 Disemba

Kalenda Ọtọdọks · 29 Novemba (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 12 Disemba 2027

Sọnde · Olu 8

Mmemme na ndị nsọ

Sọnde nke 25 mgbe Pentikọọsụ gasịrị

Obubu ọnụ Ọmụmụ

E kwere azụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Oziọma ofufe ụtụtụ nke 3

Mak 16:9–20

9Mgbe Jisọs biliri nʼọnwụ nʼisi ụtụtụ nʼụbọchị mbụ nke izu, onye mbụ o gosiri onwe ya bụ Meri Magdalin, onye ahụ o siri nʼahụ ya chụpụ mmụọ ọjọọ asaa. 10Ọ lara gaa kọrọ ndị ya na ha na-anọ na mbụ, bụ ndị nọrịị na-ebe akwa ma na-erukwa ụjụ. 11Mgbe ha nụrụ na ọ dị ndụ, na ọ hụkwala ya, ha ekweghị. 12Mgbe ihe ndị a gasịrị, o gosiri mmadụ abụọ nʼime ha onwe ya nʼụdị ọzọ, mgbe ha na-abanye nʼime obodo. 13Ndị a laghachiri bịa kọọrọ ndị nke ọzọ ma ha ekwetakwaghị. 14Emesịa, Jisọs gosiri ndị na-eso ụzọ ya iri na otu ahụ onwe ya, mgbe ha nọkọrọ na-eri nri. Ọ baara ha mba nʼihi enweghị okwukwe ha nakwa mkpọchi obi ha, nʼihi na ha jụrụ ikwenye nʼihe ndị ọzọ hụrụ ya gwara ha mgbe e mesịrị ka ọ si nʼọnwụ bilite. 15Ọ gwara ha sị, “Gaanụ nʼime ụwa niile kwusaara ihe niile e kere eke oziọma. 16Onye ọbụla kweerenụ na onye e mekwara baptizim ka a ga-azọpụta. Ma a ga-ama onye ọbụla na-ekwereghị ikpe. 17Ihe ịrịbama ndị a ga-esokwa ndị kwerenụ. Site nʼaha m, ha ga-achụpụ mmụọ ọjọọ; kwuokwa okwu nʼasụsụ ọhụrụ dị iche iche. 18Ha ga-eji aka ha abụọ atụtụlie agwọ, ṅụọkwa nsi ma ọ gaghị emerụ ha ahụ ma otu. Ha ga-ebikwasị ndị ọrịa aka, ahụ ga-adịkwa ha mma.” 19Mgbe Onyenwe anyị Jisọs gwasịrị ha okwu ndị a, e weliri ya elu, baa nʼeluigwe, ebe ọ nọdụ ala nʼakụkụ aka nri Chineke. 20Ha pụrụ kwusaa oziọma nʼebe niile. Onyenwe anyị nọnyekwaara ha, mee ka okwu ya guzosie ike site nʼihe ịrịbama dị iche iche nke na-eso ya.

Akwụkwọ ozi

Efe 4:1–6

1Ya mere, mụ onwe m bụ onye mkpọrọ nke Onyenwe anyị, na-arịọ unu ka unu bie ndụ kwesiri ọkpụkpọ nke a kpọrọ unu. 2Werekwanụ obi dị umeala niile na ịdị nwayọọ, na ndidi na-anagide ibe unu nʼịhụnanya. 3Nọọnụ nʼudo nʼetiti onwe unu gbalịakwanụ ime ka ịdị nʼotu unu dịgide nʼime Mmụọ Nsọ. 4E nwere otu ahụ na otu Mmụọ, dị ka e siri kpọọ unu nʼotu olileanya nke dịịrị ọkpụkpọ a kpọrọ unu. 5Otu Onyenwe anyị dị, otu okwukwe na otu baptizim. 6Ọ bụkwa naanị otu Chineke dị onye bụ Nna ihe niile na onye na-achị ihe niile, na onye na-arụ ọrụ ya nʼime ihe niile, na-ebikwa nʼime ihe niile.

Oziọma

Luk 13:10–17

10Nʼụbọchị izuike ndị Juu, ọ banyere nʼime otu ụlọ ekpere na-ezi ihe. 11Otu nwanyị nọkwa nʼebe ahụ, onye mmụọ nrịa nrịa mere ka ahụ ghara ị dị ya ike afọ iri na asatọ. Ọ na-ehu ehu, o nwekwaghị ike iguzo ọtọ kwem. 12Mgbe Jisọs hụrụ ya, ọ kpọrọ ya sị ya, “Nwanyị emeela ka i nwere onwe gị site nʼọrịa gị.” 13Mgbe o bikwasịrị ya aka, ngwangwa, o guzooro kwem malite na-eto Chineke. 14Ma onyendu ụlọ ekpere ahụ were iwe nke ukwuu nʼihi na Jisọs gwọrọ ọrịa nʼụbọchị izuike. Ọ gwara igwe mmadụ ahụ okwu sị, “E nwere ụbọchị isii nʼime izu ụka mgbe mmadụ kwesiri ịrụ ọrụ. Ya mere, bịanụ ka a gwọọ unu nʼụbọchị ndị a, ọ bụghị nʼụbọchị izuike.” 15Ma Onyenwe anyị zara ya sị, “Unu ndị ihu abụọ! Ọ dị onye nʼime unu na-adịghị atọpụ oke ehi ya maọbụ ịnyịnya ibu ya, site nʼụlọ anụmanụ, kpụpụ ya ebe ọ ga-aṅụ mmiri nʼụbọchị izuike? 16O kwesighị ka a tọpụ nwanyị a bụ ada Ebraham nʼagbụ ekwensu kere ya ogologo afọ iri na asatọ, nʼụbọchị izuike, mee ka o nwere onwe ya?” 17Mgbe o kwuru nke a, ihere mere ndị iro ya niile, ma ndị mmadụ nọ nʼebe ahụ ṅụrịrị ọṅụ nʼihi ọrụ ebube niile ọ na-arụ.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 29 Novemba na kalenda nzukọ bụ 12 Disemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike