Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2027 › 13 Disemba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 13 Disemba 2027

Mọnde · Izu nke 3 nke Advent

Mmemme na ndị nsọ

Mọnde nke izu nke 3 nke Advent

Ncheta · Agba ofufe: uhie

Onye nsọ Lusi, Nwaagbọghọ na Onye nwụrụ nʼihi okwukwe · Ncheta

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Ọnụ 24:2–7, 15–17

2Mgbe Belam lepụrụ anya ọ hụrụ ụmụ Izrel dịka ha si maa ụlọ ikwu nʼebo nʼebo. Mgbe ahụ kwa, Mmụọ nke Chineke dakwasịrị ya. 3O buru amụma ndị a sị, “Okwu si nʼọnụ Belam nwa Beoa pụta, okwu onye ahụ anya ya saghere asaghe. 4Okwu onye ahụ na-anụ okwu Chineke onye na-ahụ ọhụ site nʼaka onye pụrụ ime ihe niile. Onye na-ada nʼala ma anya ya na-eghe oghe. 5“Lee ka ebe obibi gị si maa mma, gị Jekọb, ebe obibi gị niile, gị Izrel! 6“Dịka ndagwurugwu dị iche iche ka ha gbasapụrụ, dịka ubi a gbara ogige dị nʼakụkụ osimiri, dịka osisi aloos nke Onyenwe anyị kụrụ, dịka osisi sida dị nʼakụkụ mmiri. 7Mmiri ga-esi nʼite mmiri ha na-erupụta, mkpụrụ ha ga-enwekwa mmiri dị ukwuu. “Eze ha ga-adị ukwuu karịa Agag, a ga-ebulikwa alaeze ha elu. 15Ya mere Belam kwuru okwu ndị a: “Amụma Belam nwa Beoa, amụma nke onye ahụ anya ya nʼahụ ụzọ nke ọma, 16amụma onye ahụ nke na-anụ okwu Chineke, onye ihe ọmụma ya si nʼebe Onye kachasị ihe niile elu na-abịa. Onye na-ahụ ọhụ site nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile. Onye na-ada nʼala, ma anya ya abụọ ghekwa oghe. 17“Ana m ahụ ya, ma ọ bụghị ugbu a, ana m ele ya anya, ma ọ nọghị nso. Otu kpakpando ga-esi nʼime Jekọb zolie. Mkpara eze ga-esi nʼetiti Izrel bilie. Ọ ga-etipịa egedege ihu ndị Moab, na okpokoro isi ndị ikom Shet niile.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 25:4–9

4O Onyenwe anyị, zi m ụzọ gị niile, kuzikwaara m ụzọ gị niile. 5Duo m nʼeziokwu gị, kuzikwaara m ihe, nʼihi na ị bụ Chineke, onye Nzọpụta m, ụbọchị niile, olileanya m dị na gị. 6Cheta, Onyenwe anyị, oke obi ebere na ịhụnanya gị, nʼihi na ha na-adị siterị na mgbe ochie. 7Echetala mmehie m mere nʼokorobịa m, ya na nnupu isi m niile. Kama site nʼịhụnanya gị cheta m, Onyenwe anyị, nʼihi na onye dị mma ka ị bụ. 8Onye dị mma na onye ezi omume ka Onyenwe anyị bụ; ọ bụ ya mere ọ na-ezi ndị mmehie ụzọ ya. 9Ọ na-edu ndị dị umeala nʼobi nʼụzọ ziri ezi, na-ezikwa ha ụzọ nke ya.

Oziọma

Mat 21:23–27

23Mgbe Jisọs batara nʼogige ụlọnsọ ukwu ahụ, ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu bịakwutere ya ka ọ nọ na-akụzi ihe jụọ ya sị, “Olee ikike i ji na-eme ihe ndị a niile? Ọ bụ onye nyekwara gị ikike a?” 24Jisọs zara sị ha, “Aga m ajụkwa unu otu ajụjụ. Ọ bụrụ na unu azaa ya, aga m agwakwa unu onye nyere m ikike m ji eme ihe ndị a niile. 25Baptizim nke Jọn o sitere nʼeluigwe, ka ọ si nʼaka mmadụ?” Ha kparịtara ụka nʼetiti onwe ha na-asị, “Ọ bụrụ na anyị asị, ‘Na o si nʼeluigwe,’ ọ ga-asị anyị, ‘Ọ bụ gịnị mere unu na-ejighị kwenye na ya?’ 26Ma ọ bụrụ na anyị asị, ‘Na o sitere nʼaka mmadụ,’ anyị na-atụ igwe mmadụ ndị a egwu, nʼihi na mmadụ niile kwenyere na Jọn bụ onye amụma.” 27Ya mere ha zara Jisọs sị ya: “Anyị amaghị.” Jisọs zakwara ha sị, “Mụ onwe m agaghị agwakwa unu ikike m ji na-eme ihe ndị a.

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde C, afọ ụbọchị izu II.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike