Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2027 › 11 Disemba
Kalenda Ọtọdọks · 28 Novemba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 11 Disemba 2027
Satọdee · Izu nke 25 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 7
Mmemme na ndị nsọ
Hieromartyr and Confessor Stephen the New of the Mount of St Auxentius († 767)
Obubu ọnụ Ọmụmụ
E kwere azụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
3Ka amara na udo nke sitere na Chineke Nna anyị, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịrị unu. 4Onye nyere onwe ya nʼihi mmehie anyị niile dị ka nzube Chineke bụ Nna anyị si dị, ịzọpụta anyị site nʼoge ọjọọ a nke anyị bi nʼime ya. 5Onye otuto dịịrị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen. 6O juru m anya, na unu esitela nʼebe onye ahụ kpọrọ unu site nʼamara Kraịst wezuga onwe unu, na-agbaso oziọma ọzọ, 7nke na-abụghị oziọma. O doro anya na ụfọdụ mmadụ na-etinye unu nʼọnọdụ mgbagwoju anya, mgbe ha na-agbalị ịgbanwe oziọma nke Kraịst. 8A sikwa na ọ bụ anyị onwe anyị maọbụ mmụọ ozi nke sitere nʼeluigwe bịara kwusaara unu oziọma ọzọ, nke dị iche na nke anyị bụrụ ụzọ kwusaara unu, ka onye dị otu a bụrụ onye abụrụ ọnụ. 9Dị ka anyị buru ụzọ kwuo ya na mbụ, ka m kwuokwa ya ọzọ: Ọ bụrụ na onye ọbụla na-ekwusara unu oziọma dị iche na nke ahụ unu nabatara, ka onye ahụ bụrụ onye a bụrụ ọnụ. 10Ugbu a, ana m agbalị ime ka m bụrụ onye ndị mmadụ maọbụ Chineke ga-anabata? Ka m na-agbalị ime ihe ga-atọ ndị mmadụ ụtọ? Nʼihi na a sị na m na-eme ihe na-atọ ndị mmadụ ụtọ, agaraghị m abụ ohu Kraịst.
Oziọma
19Lee! Enyela m unu ikike ịzọkwasị agwọ na akpị ụkwụ, na imegide ike niile nke onye iro; ọ dịghị ihe ọbụla ga-emerụ unu ahụ. 20Otu ọ dị, unu aṅụrịla ọṅụ nʼihi na mmụọ ọjọọ rubere unu isi, kama ṅụrịanụ ọṅụ nʼihi na e deela aha unu nʼeluigwe.” 21Nʼotu oge ahụ, o jupụtara nʼọṅụ nke Mmụọ Nsọ kwuo sị, “Nna, Onyenwe eluigwe na ụwa, ana m ekele gị nʼihi na ị zonarịrị ihe ndị a nʼebe ndị ọkachamara na ndị nwere amamihe nọ, ma ị kpughere ihe ndị a niile nye ụmụntakịrị. E, Nna, otu a ka o si masị uche gị ime ya.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 28 Novemba na kalenda nzukọ bụ 11 Disemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike