Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2027 › 10 Disemba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 10 Disemba 2027

Fraịdee · Izu nke 2 nke Advent

Mmemme na ndị nsọ

Fraịdee nke izu nke 2 nke Advent

Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: odo odo

Nne anyị nke Loreto · Ncheta a na-ahọrọ

Obubu ọnụ na nchegharị

Ụbọchị nchegharị

Fraịdee ọ bụla bụ ụbọchị nchegharị; ọgbakọ ndị bishọp ọ bụla na-ekpebi otú a ga-esi debe ya: izere anụ ma ọ bụ omume nchegharị ọzọ. Obubu ọnụ na-ejikọ ndị dị afọ 18 ruo 59, izere anụ site nʼafọ 14.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Aịz 48:17–19

17Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, Onye mgbapụta unu, bụ Onye nsọ Izrel, “Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke gị, onye na-ezi unu ihe nʼihi ọdịmma unu, na-eduzikwa unu nʼụzọ unu kwesiri iso. 18A sịkwarị na unu ṅara ntị nʼiwu m niile, udo unu gaara na-eru dịka osimiri, ọdịmma unu adịkwa ka mmali nke ebili oke osimiri. 19Mkpụrụ gị gaara amụba dịka aja, ụmụ unu gaara a dị ka mkpụrụ ọkụkụ a na-enweghị ike ịgụta ọnụ, a gaghị ehichapụkwa aha ha, maọbụ bibie nʼihu ha.”

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 1:1–4, 6

1Onye ihe na-agara nke ọma ka mmadụ ahụ bụ, onye na-adịghị aga ije na ndụmọdụ ndị na-emebi iwu; onye na-adịghị eguzokwa nʼụzọ ndị mmehie maọbụ soro nʼotu ndị nkwutọ. 2Kama ihe na-atọ ya ụtọ bụ ime ihe niile dị nʼiwu Onyenwe anyị. Ọ na-atụgharịkwa uche ya nʼiwu Onyenwe anyị ehihie na abalị, 3Ọ dị ka osisi a kụrụ nʼakụkụ iyi, nke na-amịpụta mkpụrụ ya nʼoge ya, nke ahịhịa ya na-adịghị akpọnwụ akpọnwụ. Ihe niile ọ na-eme na-agara ya nke ọma. 4Ma ndị ajọ omume adịghị otu a. Ha dị ka igbugbo ọka nke oke ifufe na-efesasị. 6Nʼihi na Onyenwe anyị na-eche ụzọ ndị ezi omume nche. Ma ụzọ ndị ajọ omume ga-eduba ha nʼịla nʼiyi.

Oziọma

Mat 11:16–19

16“Gịnị ka m ga-eji tụnyere ndị bi nʼọgbọ a? Gịnị ka ha yiri? Ha dị ka ụmụntakịrị na-egwuri egwu nʼama, ndị na-asị ibe ha, 17“ ‘Anyị gburu unu ọja, ma unu ekweghị ete egwu. Anyị bụụrụ unu abụ ịkwa ozu, ma unu akwaghị akwa.’ 18Jọn bịara na-erighị achịcha maọbụ ihe ọṅụṅụ. Ha sịrị, ‘Mmụọ ọjọọ bi nʼime ya.’ 19Ma Nwa nke Mmadụ bịara na-eri ihe oriri, na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ. Ha sị, ‘Lee, onye oke oriri na onye oke aṅụmaṅụ abịala, enyi ndị ọna ụtụ na ndị mmehie.’ Ma amamihe na-esite nʼọrụ ya gosiri na ihe o mere dị mma.”

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde C, afọ ụbọchị izu II.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike