Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2027 › 10 Disemba

Kalenda Ọtọdọks · 27 Novemba (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 10 Disemba 2027

Fraịdee · Izu nke 25 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 7

Mmemme na ndị nsọ

Icons of the Mother of God: “Znamenie” of Novgorod and “Znamenie”, the Kursk-Root

Obubu ọnụ Ọmụmụ

Obubu ọnụ: nri esiri esi na-enweghị mmanụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

2Te 3:6–18

6Ụmụnna, nke a bụ iwu anyị na-enye unu site nʼaha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. Ka unu zere onye ọbụla kpọrọ onwe ya onye kwere ekwe nʼime unu na-ebi ndụ umengwụ na onye na-adịghị eso ozizi nke unu natara nʼaka anyị. 7Nʼihi na unu maara nke ọma nʼime onwe unu na unu kwesiri ịgbaso omume anyị. O nweghị mgbe ọbụla unu hụrụ anyị ka anyị na-agagharị hapụ ọrụ anyị kwesiri ịrụ. 8O nweghị onye ọbụla anyị riri nri ya nke anyị na-ebughị ụzọ kwụọ ya ụgwọ. Kama anyị rụsịrị ọrụ ike, dọgbukwaa onwe anyị nʼọrụ ehihie na abalị, ka anyị ghara ịbụ ibu arọ nye onye ọbụla. 9Ọ bụghị na anyị enweghị ikike ịnara unu ihe oriri, kama ọ bụ ka anyị kuziere unu site nʼomume anyị ihe unu ga na-eṅomi. 10Ọ bụladị mgbe anyị na unu nọ, anyị nyere unu iwu a sị, “Onye ọbụla na-agaghị ọrụ ya erila nri.” 11Ma anyị anụla na ụfọdụ nʼetiti unu na-anọ nkịtị na-arụghị ọrụ ọbụla, kama ndị dị otu a na-agagharị, na-etinye anya nʼihe na-agbasaghị ha. Ha anaghị arụ ọrụ ọbụla. 12Anyị na-enye ndị a iwu, na-adụsịkwa ha ọdụ ike site nʼaha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, si ha wetuo obi ha ala rụsie ọrụ ha ike. Ka ha riekwa nri ha ji aka ha rụpụta. 13Otu ọ dị ụmụnna, unu ekwela ka ike ịrụ ọrụ ọma gwụ unu. 14Ma ọ bụrụ na ndị ọbụla adịghị erube isi nye ihe anyị kwuru nʼime akwụkwọ ozi a, hụbanụ ndị dị otu a ama ma kwụsịkwa iso ha nwekọ ihe ọbụla, ka ihere mekwa ha. 15Nʼagbanyeghị nke a, unu agụkwala ha dị ka ndị iro unu, kama nyenụ ha ndụmọdụ dị ka ụmụnna. 16Ugbu a, ka Onyenwe anyị, onye udo na-esi nʼaka ya abịa tụkwasịrị unu udo ya mgbe niile, nʼime ọnọdụ ọbụla unu nọ nʼime ya. Onyenwe anyị nọnyekwara unu. 17Mụ onwe m bụ Pọl ji aka m depụta ekele a, nke m na-ekele unu niile. Nke a bụ ihe e ji arịba akwụkwọ niile m dere ama. Otu a ka m si ede ihe. 18Ka amara Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịnyere unu niile.

Oziọma

Luk 19:12–28

12Ọ sịrị, “Otu nwoke a mụrụ nʼọnọdụ dị elu gara obodo dị anya ka echie ya eze, ka ọ lọtakwa ma e mesịa. 13Ya mere, ọ kpọrọ ndị ohu ya iri nye ha mkpụrụ ego iri sị ha, ‘Werenụ ego ndị a zụọ ahịa ruo mgbe m ga-alọta.’ 14“Ma ndị ọ na-achị kpọrọ ya asị, ha zipụkwara ndị ụkwụ ozi nʼazụ ya na-asị, ‘Anyị achọkwaghị ka onye a chịa anyị.’ 15“Mgbe ọ natachara ikike ịbụ eze, ọ lọghachiri, kpọọ ndị ohu ya ahụ o nyere ego mgbe ọ na-apụ, ka ha bịa pịaziere ya ego ole ha ritere nʼuru. 16“Onye nke mbụ bịara sị, ‘Onyenwe m e jiri m mkpụrụ ego ị nyere m rite uru mkpụrụ ego iri ọzọ.’ 17“Nna ya ukwu sịrị ya, ‘I mere nke ọma, ezi odibo. Nʼihi na i gosiri onwe gị onye kwesiri ntụkwasị obi nʼihe dịkarịsịrị nta, ị ga-achị mba iri.’ 18“Onye nke abụọ bịara sịkwa, ‘Onyenwe m, otu mkpụrụ ego gị amụtala mkpụrụ ego ise ọzọ.’ 19“Ọ sịrị ya, ‘Ị ga-achị obodo ise.’ 20“Onye nke ọzọ bịakwara sị, ‘Onyenwe m, lee mkpụrụ ego gị. Ekechiri m ya nʼakwa, zoo ya. 21Atụrụ m egwu gị, nʼihi na ị bụ onye afọ tara mmiri, bụrụkwa onye na-ewe ihe na-abụghị nke gị, na-aghọrọkwa mkpụrụ ị na-akụghị.’ 22“Ọ sịrị ya, ‘Ọ bụ okwu si gị nʼọnụ ka m ga-eji kpee gị ikpe, gị bụ ohu ọjọọ! I maara na afọ tara m mmiri, matakwa na m na-ewe ihe na-abụghị nke m, na-aghọrọkwa mkpụrụ m na-akụghị? 23Gịnị mere na i wereghị ego m tinye nʼụlọakụ? Nke ọ ga-abụ mgbe m lọtara, m ga-anara ya na ọmụrụnwa ya.’ 24“Mgbe ahụ, ọ gwara ndị guzo nʼebe ahụ, ‘Napụtanụ ya mkpụrụ ego ahụ, were ya nye onye ji mkpụrụ ego iri.’ 25“Ha sịrị ya, ‘Nna anyị ukwu, o nwelarị mkpụrụ ego iri.’ 26“Ọ zara, ‘Asị m unu, onye ọbụla nwere ihe ka a ga-enyekwa ihe ọzọ, ma onye na-enweghị ihe ka a ga-anapụ ọ bụladị ihe ahụ o nwere. 27Ma ndị iro m ahụ, ndị na-achọghị ka m bụrụ eze ha, kpụpụtanụ ha nʼebe a, gbukwaanụ ha nʼihu m.’ ” 28Mgbe ọ kwusiri nke a, ọ gakwara nʼihu nʼije ya ịga Jerusalem.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 27 Novemba na kalenda nzukọ bụ 10 Disemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike