Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2027 › 9 Disemba
Kalenda Ọtọdọks · 26 Novemba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 9 Disemba 2027
Tọọzdee · Izu nke 25 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 7
Mmemme na ndị nsọ
Venerable Alypios the Stylite of Adrianopolis († 640)
Obubu ọnụ Ọmụmụ
Obubu ọnụ: ya na mmanụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
13Anyị kwesiri inye Chineke ekele mgbe niile nʼihi unu ụmụnna ndị Onyenwe anyị hụrụ nʼanya. Nʼihi na Chineke esitelarị na mmalite họpụta unu ka unu bụrụ ndị a zọpụtara site nʼọrụ ido nsọ nke Mmụọ Nsọ na site nʼokwukwe unu nʼeziokwu ahụ. 14Nʼihi nke a, ọ kpọrọ unu site nʼoziọma anyị ka unu nweta otuto nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. 15Ya mere, ụmụnna, nọgidenụ nʼozizi ahụ anyị mere ka unu mụta site nʼozizi anyị ziri unu, maọbụ na akwụkwọ anyị deere unu. 16Ka Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nʼonwe ya, na Chineke Nna anyị, onye hụrụ anyị nʼanya, site nʼamara ya nye anyị agbamume dị ebighị ebi na ezi olileanya, 17gbaa obi unu ume, ma mee ka unu guzosie ike nʼịrụ ọrụ na ikwukwa ihe niile dị mma. 3:1Nʼikpeazụ, ụmụnna, na-ekperenụ anyị ekpere ka ozi Onyenwe anyị gaa nʼihu na-agbasa ruo ebe niile ma bụrụ ihe a na-asọpụrụ, dị ka ọ gbasara nʼetiti unu. 2Ka e nwee ike napụta anyị nʼaka ndị ajọ mmadụ, nʼihi na ọ bụghị mmadụ niile nwere okwukwe. 3Ma Onyenwe anyị kwesiri ntụkwasị obi, ọ ga-echebe unu ma gbaakwa unu ume ka unu hapụ ịdaba nʼaka ajọ onye ahụ. 4Anyị nwere nchekwube nʼime Onyenwe anyị na unu na-eme ma ga-anọgidekwa na-eme ihe niile anyị nyere unu nʼiwu. 5Ka Onyenwe anyị duzie obi unu ịghọta ịhụnanya Chineke ya na ụdị ntachiobi Kraịst nwere.
Oziọma
31Jisọs kpọpụrụ mmadụ iri na abụọ ahụ na-eso ụzọ ya nʼakụkụ, gwa ha sị, “Anyị na-aga Jerusalem, ihe niile ndị amụma dere banyere Nwa nke Mmadụ ga-emezu. 32A ga-arara ya nyefee ya nʼaka ndị mba ọzọ. Ha ga-akwa ya emo, mee ya ihe ihere, bụkwaa ya ọnụ mmiri asụ. 33Ha ga-apịa ya ihe, gbukwaa ya; ma nʼụbọchị nke atọ, ọ ga-esite nʼọnwụ bilie ọzọ.” 34Ma ha aghọtaghị ihe ọbụla nʼokwu ndị a. E mere ka nkọwa okwu ndị a bụrụ ihe e zoro ezo nʼebe ha nọ, ha aghọtakwaghị ihe o kwuru.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 26 Novemba na kalenda nzukọ bụ 9 Disemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike