Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2027 › 25 Novemba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 25 Novemba 2027
Tọọzdee · Izu nke 34 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Tọọzdee nke izu nke 34 nke Oge Nkịtị
Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Onye nsọ Katrin nke Aleksandria, Nwaagbọghọ na Onye nwụrụ nʼihi okwukwe · Ncheta a na-ahọrọ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
11Ndị iro ya gbakọtara hụ na Daniel na-ekpe ekpere na-arịọkwa Chineke arịrịọ. 12Ha jekwuru eze sị ya, “I chetakwara iwu ahụ i nyere, nke sị na onye ọbụla ekwesighị ịrịọ chi ọzọ maọbụ mmadụ arịrịọ ọbụla karịa gị, tutu iri ụbọchị atọ agafee, na onye ọbụla nupuru isi nʼiwu a ka a ga-atụba nʼolulu ọdụm?” Eze sịrị, “Ya bụ iwu ka dịkwa, dịka iwu ndị Midia na Peshịa nke e nweghị ike ịkagbu akagbu.” 13Mgbe ahụ, ha gwara eze, “Daniel, onye bụ otu nʼime ndị si Juda a dọtara nʼagha adịghị aṅa gị ntị, gị onye a na-asọpụrụ, maọbụ nye iwu ahụ i nyere bụ nke e dere nʼakwụkwọ. Ọ nọkwa na-ekpe ekpere ya ugbo atọ nʼụbọchị.” 14Obi jọrọ eze njọ nke ukwuu mgbe ọ nụrụ ihe ndị a. O kpebiri nʼobi ya ime ihe niile ịhụ na Daniel ataghị ahụhụ. Ya mere, ụbọchị ahụ niile, site nʼụtụtụ ruo nʼanyasị, ọ nọ na-eche otu ọ ga-esi mee nke a. 15Mgbe ahụ, ndị ikom ndị a bịakwutere eze sị ya, “Chetakwa, gị eze, na dịka iwu ndị Midia na Peshịa si dị, ọ dịghị iwu ọbụla eze nyere maọbụ ụkpụrụ nke e mere ka o guzosie ike ga-agbanwe.” 16Nʼikpeazụ, eze nyere iwu, ha kpụpụtara Daniel tụba ya nʼolulu ọdụm. Eze gwara Daniel, “Ka Chineke gị, onye ahụ ị na-efe mgbe niile, zọpụta gị.” 17E wetara nkume dị ukwuu jiri mechie ọnụ olulu ọdụm ahụ. Eze jikwa mgbaaka akara ya na mgbaaka ndịisi ọzọ kaa akara e ji nyachie ọnụ olulu ahụ. E mere nke a ka ọnọdụ Daniel hapụ ịgbanwe. 18Mgbe eze lọbatara nʼụlọeze ya, o dinara nʼihe ndina ya buo ọnụ, onweghịkwa nri ebutere ya. Nʼabalị ahụ, o nweghị ike rahụ ụra. 19Nʼìhè mbụ nke ụtụtụ, mgbe chị na-abọ, eze biliri mee ngwangwa, gaa nʼolulu ọdụm ahụ. 20Mgbe ọ bịaruru nso olulu ahụ, ọ kpọrọ Daniel oku nʼolu obi ntiwa sị, “Daniel, ohu Chineke dị ndụ, Chineke gị ahụ ị na-efe mgbe niile, o nwekwara ike ịzọpụta gị nʼaka ọdụm?” 21Ya mere, Daniel sịrị eze, “Eze, dịrị ndụ ruo mgbe niile! 22Chineke m zitere mmụọ ozi ka o mechie ọnụ ọdụm ndị a, ka ha si otu a hapụ inwe ike ịmetụ m aka, nʼihi na Chineke maara na aka m dị ọcha. Ọ makwaara na o nweghị ihe ọbụla m mere mejọọ gị.” 23Ọṅụ juru eze ahụ obi! O nyere iwu ka e si nʼime olulu ahụ dọpụta Daniel. Mgbe a kpọpụtara Daniel, o nweghị ihe ọbụla a hụrụ mere ya nʼahụ, nʼihi na ọ tụkwasịrị Chineke ya obi. 24Mgbe ahụ, eze nyere iwu ka e jide ndị ahụ boro Daniel ebubo. O nyere iwu ka a tụnye ha nʼolulu ọdụm ahụ, ha na ndị nwunye ha na ụmụ ha. Ọdụm ndị ahụ dị nʼime olulu ahụ jidere ndị ahụ dọrie ma ọkpụkpụ ha tupu ha adaruo ala. 25Emesịa, eze Daraiọs depụtara ozi a nʼakwụkwọ nye iwu ka a gụọra ya mmadụ niile, mba niile na asụsụ niile dị iche iche nʼelu ụwa. “Ka ọ dịrị unu na mma. 26“Ana m enye iwu na mmadụ niile nọ nʼalaeze m kwesiri ịtụ egwu na ịma jijiji nʼihu Chineke nke Daniel. “Nʼihi na ọ bụ Chineke dị ndụ, nke na-adịgide ebighị ebi. E nweghị ike ịla alaeze ya nʼiyi, ọ bụkwa onye ọchịchị ya na-enweghị ọgwụgwụ. 27Ọ na-agbapụta ndị ya, na-azọpụtakwa. Ọ na-eme ihe ịrịbama na-arụkwa ọrụ ebube nʼeluigwe na nʼụwa. Nʼihi na ọ gbapụtara Daniel site nʼike ọdụm.”
Abụ Ọma nzaghachi
Ọ dịghị na nsụgharị a
Oziọma
20“Mgbe unu hụrụ ka ndị agha gbara Jerusalem gburugburu, matanụ na oge e ji ala ya nʼiyi eruola. 21Nʼoge ahụ ka ndị nọ na Judịa gbalaga nʼugwu, ka ndị nọ nʼime obodo si na ya pụta, ka ndị na-anọghị nʼobodo gharakwa ịba nʼime ya. 22Nʼihi na oge a ga-abụ oge ịbọ ọbọ ka e mezuo ihe niile akwụkwọ nsọ kwuru. 23Ma ahụhụ ga-adịrị ndị dị ime, na ndị na-enye ụmụaka ara, nʼụbọchị ahụ! A ga-enwe oke ihe mgbu nʼala a, iwe ga-adakwasịkwa ụmụ mmadụ. 24Mma agha ga-egbu ha, mba niile ga-adọrọkwa ha nʼagha. Ndị mba ọzọ ga na-azọtọsị Jerusalem nʼụkwụ ruo mgbe oge nke ndị mba ọzọ ahụ zuru. 25“A ga-enwe ihe ịrịbama nʼanyanwụ, nʼọnwa, na kpakpando. Nʼelu ụwa, mba niile ga-anọ nʼoke ahụhụ na mgbagwoju anya dị ka oke osimiri na-eme mkpọtụ, ebili mmiri ga na-ebilikwa. 26Ndị mmadụ ga-adakwa mba nʼobi nʼihi ụjọ mgbe ha ghọtara ihe gaje ịbịakwasị ụwa, nʼihi na a ga-eme ka ike niile nke dị nʼeluigwe maa jijiji. 27Nʼoge ahụ, a ga-ahụ Nwa nke Mmadụ ka ọ na-abịa nʼike na ebube nʼigwe ojii. 28Mgbe ihe ndị a malitere ime, guzoronụ ọtọ welie isi unu elu, nʼihi na oge mgbapụta unu dị nso.”
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Katrin nke Aleksandria, Nwaagbọghọ na Onye nwụrụ nʼihi okwukwe
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike