Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2027 › 26 Novemba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 26 Novemba 2027

Fraịdee · Izu nke 34 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Fraịdee nke izu nke 34 nke Oge Nkịtị

Ụbọchị izu · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Obubu ọnụ na nchegharị

Ụbọchị nchegharị

Fraịdee ọ bụla bụ ụbọchị nchegharị; ọgbakọ ndị bishọp ọ bụla na-ekpebi otú a ga-esi debe ya: izere anụ ma ọ bụ omume nchegharị ọzọ. Obubu ọnụ na-ejikọ ndị dị afọ 18 ruo 59, izere anụ site nʼafọ 14.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Dan 7:2–14

2“Mụ bụ Daniel hụrụ nʼime ọhụ m nʼabalị, elere m anya, hụ nʼihu m oke ifufe anọ nke eluigwe ka ha na-atụgharị oke osimiri. 3Anụ ọhịa anọ buru ibu si nʼime osimiri ahụ rịpụta. O nweghị nke yiri ibe ya. 4“Nke mbụ dị ka ọdụm, kama o nwere nku dịka ugo. Mgbe m nọ na-ele ya anya, a nyakapụrụ nku ya, welie ya, hapụ ya ka o guzo nʼelu ala nʼụkwụ ya abụọ dịka mmadụ. E nyekwara ya ụdị obi nke mmadụ nwere. 5“Anụ ọhịa nke abụọ yiri anụ ọhịa buru ibu a na-akpọ bịa (nʼasụsụ bekee). E weliri ya nʼotu akụkụ, ọ kpụkwa ọgịrịga atọ nʼọnụ ya, nʼetiti eze ya. A gwara ya, ‘Bilie, rie anụ ka o si dị gị mma.’ 6“Mgbe nke a gasịrị, ka m nọ na-ele anya, anụ ndọgbu ọzọ pụtara, anụ ọhịa ahụ yiri agụ, ma o nwere nʼazụ ya nku anọ dịka nke nnụnụ. O nwekwara isi anọ. E nyekwara ya ike ọchịchị. 7“Mgbe nke a gasịrị, nʼime ọhụ nke abalị, ahụrụ m anụ ọhịa nke anọ. Anụ ọhịa a na-eyi oke egwu, ọnụ apụghị ịkọwa ihe o yiri. Ọ bụkwa anụ ọhịa dị nnọọ ike, nke na-eji eze igwe ya dị ukwuu na-adọwasị ma na-etipịasịkwa ihe ọbụla, nke na-ejikwa ụkwụ ya azọgbu ihe ọbụla fọdụrụ. Ọ bụ anụ ọhịa gbara iche site nʼanụ ọhịa ndị ọzọ, bụrụkwa anụ nwere mpi iri. 8“Mgbe m nọ na-eche banyere mpi ndị a, na mberede mpi ntakịrị ọzọ sikwa nʼetiti ha pupụta. E si nʼukwu hopu mpi atọ nʼime mpi iri mbụ ahụ nʼihu ya. Mpi ntakịrị a nwere anya dịka mmadụ, na ọnụ na-ekwu okwu jupụtara nʼịnya isi. 9“Anọkwa m na-ele anya “hụ ka e doziri ocheeze, ebe Onye ahụ na-adị site na mbụ nọdụrụ. Uwe o yi na-acha nnọọ ezi ọcha dịka snoo, agịrị isi dị ya nʼisi na-acha ọcha dị ka ezi ogho ọcha. Ocheeze ya na-enwu ka ire ọkụ, ụkwụ igwe ya niile na-acha ọkụ. 10Iyi na-asọ ka ọkụ si nʼihu ya na-asọpụta. Puku kwụrụ puku na-agara ya ozi. Otu a kwa, nde kwụrụ nde ndị mmadụ guzo nʼihu ya. Ndị ikpe nọdụrụ ala, asaghekwara akwụkwọ dị iche iche. 11“Mgbe m nọ na-ele anya, nʼihi okwu ịnya isi nke mpi ahụ na-ekwu, elegidere m anya tutu ruo mgbe e gburu anụ ọhịa ahụ, laa anụ ahụ ya nʼiyi, were ya nye ka a kpọọ ya ọkụ. 12(Gbasara ụmụ anụ ọhịa ndị ọzọ, a napụrụ ha ọchịchị ha, ma a hapụrụ ha ka ha dịrị ndụ gaa nʼihu nwantakịrị oge). 13“Nʼime ọhụ m nʼabalị, a hụrụ onye yiri nwa nke mmadụ, ka ọ nọ na-abịa nʼigwe ojii nke eluigwe. Onye a bịara nso nʼebe onye ahụ na-adị site na mbụ nọ. E dubatakwara ya nʼihu ya. 14E nyere ya ike ọchịchị, ebube na ike ịbụ eze; mba niile dị iche iche na ndị niile na-asụ asụsụ dị iche iche kpọrọ isiala nye ya. Ọchịchị ya bụ ọchịchị na-adị ruo mgbe ebighị ebi, nke na-agaghị agabiga. O nwekwaghị onye nwere ike ịkwatu alaeze ya.

Abụ Ọma nzaghachi

Ọ dịghị na nsụgharị a

Oziọma

Luk 21:29–33

29Ọ tụụrụ ha ilu a, “Leenụ osisi fiig na osisi ndị ọzọ niile anya. 30Mgbe ha bidoro ipupụta ahịhịa ọhụrụ, unu na-amata na ọkọchị adịla nso. 31Nʼụzọ dị otu a kwa, mgbe unu hụrụ ihe ndị a niile ka ha na-eme, matanụ na alaeze Chineke adịla nso. 32“Nʼezie agwa m unu, ọgbọ a agaghị agabiga tupu ihe ndị a niile emezuo. 33Eluigwe na ụwa ga-agabiga, ma okwu m enweghị ike ịgabiga.

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike