Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2027 › 24 Novemba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 24 Novemba 2027

Wenezdee · Izu nke 34 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Wenezdee nke izu nke 34 nke Oge Nkịtị

Ncheta · Agba ofufe: uhie

Onye nsọ Andru Dung-Lac, Onye ụkọchukwu, na ndị otu ya, Ndị nwụrụ nʼihi okwukwe · Ncheta

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Dan 5:1–6, 13–14, 16–17, 23–28

1Eze Belshaza, kpọrọ puku ndịisi nọ nʼalaeze ya oriri, ebe ha nọ ṅụọ nnọọ mmanya dị ukwuu. 2Mgbe Belshaza na-aṅụ mmanya ya, ọ nyere iwu ka a chịtara ya iko ọlaedo na ọlaọcha nke nna ya bụ Nebukadneza si nʼụlọnsọ ukwu dị na Jerusalem chịkọta, ka eze na ndị a mara aha ha nʼalaeze ya, na ndị nwunye ya, na ndị iko ya jiri ha ṅụọ mmanya. 3Ya mere, a chịtara iko ọlaedo ndị e si nʼụlọnsọ ukwu Chineke dị na Jerusalem chịkọta. Eze na ndị a mara aha ha nʼalaeze ya na ndị nwunye ya na ndị iko ya jiri ha ṅụọ mmanya. 4Ha ṅụrụ mmanya tookwa chi nke ọlaedo na ọlaọcha na bronz, na igwe na osisi na nkume. 5Na mberede, ha hụrụ mkpịsịaka mmadụ ka ọ na-ede ihe nʼaja ụlọ nke ụlọeze ahụ ha nọ nʼime ya, na ncherita ihu ebe a dọbara iheọkụ. Eze nʼonwe ya hụrụ aka ahụ mgbe ọ na-ede ihe ahụ. 6Mgbe ahụ, ihu eze ahụ tụhịkọtara, gbarụọ nʼihi egwu. Oke ụjọ tụrụ ya. Ụkwụ ya makwara jijiji. Ikpere ya abụọ kụkọtara onwe ha. 13Ya mere, a kpọbatara Daniel nʼihu eze, eze sịrị Daniel, “Ọ bụ gị bụ Daniel, otu nʼime ndị Juda, ndị nna m dọtara nʼagha site na Juda? 14Anụla m na i nwere mmụọ nke chi niile nʼime gị, na ị bụkwa onye jupụtara na nghọta na amamihe. 16Agwara m na i nwere ike ịkọwa ihe ọbụla gbagwojuru anya. Ọ bụrụ na i nwee ike ịgụ ihe e dere nʼaja ma kọwakwara m ihe ọ pụtara, aga m eyikwasị gị uwe odo odo ndị eze, yinyekwa gị ihe olu ọlaedo nʼolu, meekwa ka i bụrụ onye ọchịchị nke atọ nʼalaeze m.” 17Daniel zara nʼihu eze, “Debere onwe gị onyinye gị, ma ọ bụkwanụ were ya nye onye ọzọ. Ma aga m agụrụ gị eze ihe ahụ e dere ma kọwakwara gị ihe ọ pụtara. 23Nʼihi na i lelịala Chineke nke eluigwe. Ị wepụtara iko ndị a e si nʼụlọnsọ ukwu ya chịpụta, ka gị na ndịisi alaeze gị, ndị nwunye ha na ndị iko unu, jiri ṅụọ mmanya, mgbe unu nọ na-eto chi niile nke e jiri ọlaọcha na ọlaedo, bronz na igwe, osisi na nkume kpụọ; chi nke na-adịghị ahụ ụzọ, maọbụ nụ ihe; chi nke na-amaghị ihe ọbụla. Ma unu enyeghị Chineke onye na-enye unu ume ndụ na onye ndụ gị na ọganihu gị dị nʼaka ya nsọpụrụ. 24Ọ bụ nke a mere o ji zite aka ahụ ị hụrụ, nke depụtara ozi a. 25“Nke a bụ ozi ahụ e dere: mene, mene, tekel, parsin 26“Ihe okwu ndị a pụtara bụ nke a: “Mene, Chineke agụkọọla ụbọchị ọchịchị gị, mee ka ha bịa na njedebe. 27“ Tekel, atụọla gị nʼime ihe ọtụtụ chọpụta na o nweghị ihe ọbụla ị bụ. 28“Parsin, ekewala alaeze gị nyefee ya nʼaka ndị Midia na Peshịa.”

Abụ Ọma nzaghachi

Ọ dịghị na nsụgharị a

Oziọma

Luk 21:12–19

12“Ma tupu ihe ndị a niile emezuo, ha ga-ejide unu, kpagbukwaa unu. Ha ga-enyefe unu nʼaka ọtụtụ ụlọ ekpere. Ha ga-atụkwa unu mkpọrọ. Ha ga-akpọpụkwa unu nʼihu ndị eze na ndị ọchịchị nʼihi aha m. 13Nke a ga-abụrụ unu ohere iji gbaa akaebe. 14Ma burunu ụzọ kpebie nʼobi unu na unu agaghị echegbu onwe unu maka ihe unu ga-aza. 15Nʼihi na aga m enye unu ụdị okwu na amamihe nke ndị na-ebo unu ebubo na-enweghị ike iguzogide maọbụ kwuo okwu megide. 16Ọ bụladị ndị mụrụ unu, ụmụnne unu ndị nwoke na ndị nwanyị, ndị ikwu unu na ndị enyi unu, ha ga-arara unu nye nʼaka ndị ọchịchị, ndị ga-egbukwa ụfọdụ nʼime unu. 17Mmadụ niile ga-akpọ unu asị nʼihi m. 18Ma otu agịrị isi dị nʼisi unu agaghị ala nʼiyi. 19Unu ga-azọpụta ndụ unu site na ntachiobi unu.

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike