Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2027 › 17 Novemba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 17 Novemba 2027
Wenezdee · Izu nke 33 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Wenezdee nke izu nke 33 nke Oge Nkịtị
Ncheta · Agba ofufe: ọcha
Onye nsọ Elizabet nke Họngari, Onye okpukpe · Ncheta
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
Ọ dịghị na nsụgharị a
Abụ Ọma nzaghachi
1Ekpere Devid. O Onyenwe anyị, nụrụ arịrịọ m ziri ezi, nụrụkwa mkpu akwa m. Gee ntị nʼekpere m nʼihi na o siteghị nʼegbugbere ọnụ na-ekwu okwu aghụghọ. 5Nzọ ụkwụ m akpafubeghị site nʼụzọ gị, ụkwụ m agbụchapụghịkwa site nʼọnọdụ ya. 6Ana m akpọku gị, O Chineke, nʼihi na amaara m na ị ga-aza m; gee m ntị ma nụrụ ekpere m. 8Chebe m dịka mkpụrụ anya gị; zoo m na ndo nke nku gị, 15Ma mụ onwe m ga-ahụ ihu gị site nʼezi omume; mgbe m ga-ebili, afọ ga-eju m nke ọma, nʼihi na aga m ahụ gị ihu na ihu.
Oziọma
11Dị ka ha na-ege ya ntị nʼokwu a, ọ gara nʼihu tụọrọ ha ilu, nʼihi na ọ nọ Jerusalem nso, ha chekwara na o ruola mgbe alaeze Chineke ga-apụta ihe. 12Ọ sịrị, “Otu nwoke a mụrụ nʼọnọdụ dị elu gara obodo dị anya ka echie ya eze, ka ọ lọtakwa ma e mesịa. 13Ya mere, ọ kpọrọ ndị ohu ya iri nye ha mkpụrụ ego iri sị ha, ‘Werenụ ego ndị a zụọ ahịa ruo mgbe m ga-alọta.’ 14“Ma ndị ọ na-achị kpọrọ ya asị, ha zipụkwara ndị ụkwụ ozi nʼazụ ya na-asị, ‘Anyị achọkwaghị ka onye a chịa anyị.’ 15“Mgbe ọ natachara ikike ịbụ eze, ọ lọghachiri, kpọọ ndị ohu ya ahụ o nyere ego mgbe ọ na-apụ, ka ha bịa pịaziere ya ego ole ha ritere nʼuru. 16“Onye nke mbụ bịara sị, ‘Onyenwe m e jiri m mkpụrụ ego ị nyere m rite uru mkpụrụ ego iri ọzọ.’ 17“Nna ya ukwu sịrị ya, ‘I mere nke ọma, ezi odibo. Nʼihi na i gosiri onwe gị onye kwesiri ntụkwasị obi nʼihe dịkarịsịrị nta, ị ga-achị mba iri.’ 18“Onye nke abụọ bịara sịkwa, ‘Onyenwe m, otu mkpụrụ ego gị amụtala mkpụrụ ego ise ọzọ.’ 19“Ọ sịrị ya, ‘Ị ga-achị obodo ise.’ 20“Onye nke ọzọ bịakwara sị, ‘Onyenwe m, lee mkpụrụ ego gị. Ekechiri m ya nʼakwa, zoo ya. 21Atụrụ m egwu gị, nʼihi na ị bụ onye afọ tara mmiri, bụrụkwa onye na-ewe ihe na-abụghị nke gị, na-aghọrọkwa mkpụrụ ị na-akụghị.’ 22“Ọ sịrị ya, ‘Ọ bụ okwu si gị nʼọnụ ka m ga-eji kpee gị ikpe, gị bụ ohu ọjọọ! I maara na afọ tara m mmiri, matakwa na m na-ewe ihe na-abụghị nke m, na-aghọrọkwa mkpụrụ m na-akụghị? 23Gịnị mere na i wereghị ego m tinye nʼụlọakụ? Nke ọ ga-abụ mgbe m lọtara, m ga-anara ya na ọmụrụnwa ya.’ 24“Mgbe ahụ, ọ gwara ndị guzo nʼebe ahụ, ‘Napụtanụ ya mkpụrụ ego ahụ, were ya nye onye ji mkpụrụ ego iri.’ 25“Ha sịrị ya, ‘Nna anyị ukwu, o nwelarị mkpụrụ ego iri.’ 26“Ọ zara, ‘Asị m unu, onye ọbụla nwere ihe ka a ga-enyekwa ihe ọzọ, ma onye na-enweghị ihe ka a ga-anapụ ọ bụladị ihe ahụ o nwere. 27Ma ndị iro m ahụ, ndị na-achọghị ka m bụrụ eze ha, kpụpụtanụ ha nʼebe a, gbukwaanụ ha nʼihu m.’ ” 28Mgbe ọ kwusiri nke a, ọ gakwara nʼihu nʼije ya ịga Jerusalem.
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Elizabet nke Họngari, Onye okpukpe
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike