Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2027 › 16 Novemba

Kalenda Ọtọdọks · 3 Novemba (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 16 Novemba 2027

Tiuzdee · Izu nke 22 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 4

Mmemme na ndị nsọ

Martyrs Akepsimos the Bishop, Joseph the Presbyter and Haiphal the Deacon of Persia (4th C)

Obubu ọnụ

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

Kọl 2:20–3:3

20Ebe ọ bụ na unu esorola Kraịst nwụọ nʼebe ozizi na amamihe niile nke na-achị ụwa nọ, gịnị mekwaranụ unu ji ka na-ebi ndụ dị ka a ga-asị na unu bụ nke ụwa, gịnị mere unu ji na-edo onwe unu nʼokpuru iwu ya dị iche? 21“Ejidela nke a aka, edetụla nke a ire, ebitụkwala nke a aka”? 22Iwu ndị a niile na-ekwu banyere ihe ndị ga-ala nʼiyi mgbe a na-etinye ha nʼọrụ, ha sitere nʼiwu na ozizi nke mmadụ. 23Nʼezie, iwu ndị a yiri ihe e ji amamihe guzobe, nʼihi ụzọ o si akwali mmụọ mmadụ nʼife ofufe dị ka ọ chọrọ, na iweda onwe nʼala, na ịta anụ ahụ ahụhụ. Ma ha abaghị uru o bụla iji ha gbochie agụụ ọjọọ nke anụ ahụ. 3:1Ya mere, ebe e mere ka unu bụrụ ndị so Kraịst bilie nʼọnwụ, tụkwasịnụ obi unu nʼihe dị nʼeluigwe ebe Kraịst nọ nʼakụkụ aka nri Chineke. 2Ka echiche gbasara eluigwe ju unu obi. Unu atụfukwala oge ichegbu onwe unu banyere ihe dị nʼụwa. 3Nʼihi na unu anwụọla. E zokwara ndụ unu nʼime Chineke site na Kraịst.

Oziọma

Luk 11:34–41

34Anya bụ oriọna nke anụ ahụ. Ọ bụrụ na anya gị dị mma, ahụ gị niile ga-ejupụta nʼìhè. Ọ bụrụkwanụ na anya gị dị njọ, ị ga-anọ nʼọchịchịrị. 35Ya mere, lezie anya ka ị mara ka ìhè dị nʼime gị, ọ bụghị ọchịchịrị. 36Nʼihi nke a, ọ bụrụ na ahụ gị niile ejupụta nʼìhè, ọ bụrụkwa na akụkụ ọbụla agbaghị ọchịchịrị, mgbe ahụ, ahụ gị niile ga-ejupụta nʼìhè dị ka mgbe ìhè oriọna na-achakwasị gị nʼahụ.” 37Mgbe ọ na-ekwu okwu, otu onye Farisii kpọrọ ya ka ọ bịa soro ya rie nri. Ọ banyere nọrọ nʼoche nri. 38O juru onye Farisii ahụ anya na mgbe ọ bidoro iri nri ọ kwọghị aka ya tupu ya ebido. 39Ma Onyenwe anyị sịrị ya, “Unu ndị Farisii na-asacha azụ iko mmiri na efere, mee ka ọ dị ọcha, ma ime unu jupụtara nʼanya ukwu na nʼihe ọjọọ dị iche iche. 40Ndị nzuzu! Ọ bụ na ọ bụghị onye ahụ mere azụ iko mekwara ime ya? 41Kama werenụ ihe ndị ahụ dị nʼime rụọ ọrụ ebere, ihe niile ga-adịkwara unu ọcha.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 3 Novemba na kalenda nzukọ bụ 16 Novemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike