Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2027 › 10 Novemba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 10 Novemba 2027
Wenezdee · Izu nke 32 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Wenezdee nke izu nke 32 nke Oge Nkịtị
Ncheta · Agba ofufe: ọcha
Onye nsọ Leo Onye Ukwu, Pope na Onye nkuzi nke Chọọchị · Ncheta
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
Ọ dịghị na nsụgharị a
Abụ Ọma nzaghachi
3Kperenụ ndị na-adịghị ike na ndị na-enweghị nna ikpe ziri ezi; hụnụ na ndị ogbenye na ndị a na-emegbu nwetara ihe ruuru ha. 4Gbapụtanụ ndị na-adịghị ike na ndị nọ na mkpa; napụta ha site nʼaka ndị ajọ omume. 6“Asịrị m, ‘Unu bụ “chi,” unu niile bụ ụmụ ndị ikom nke Onye kachasị ihe niile elu.’ 7Ma unu ga-anwụ ọnwụ dịka mmadụ ndị ọzọ; unu ga-ada dịka ndị ọchịchị ọzọ.”
Oziọma
11Ka ọ na-aga Jerusalem, o sitere nʼụzọ dị nʼagbata Sameria na Galili. 12Mgbe ọ banyere nʼotu obodo nta, ndị ekpenta iri sitere nʼebe dị anya zute ya. 13Ha tiri mkpu nʼoke olu sị, “Jisọs nna anyị ukwuu, mere anyị ebere.” 14Mgbe ọ hụrụ ha, ọ sịrị ha, “Gaanụ gosi ndị nchụaja onwe unu.” Dị ka ha na-aga, e mere ka ha dị ọcha. 15Mgbe otu nʼime ha chọpụtara na a gwọọla ya, ọ laghachiri azụ, jiri oke olu na-eto Chineke. 16Ọ dara nʼala nʼụkwụ ya, kelee ya. Ọ bụ onye Sameria. 17Jisọs jụrụ sị, “Ọ bụghị mmadụ iri ka e mere ka ha dị ọcha, ebeekwanụ ka itoolu ndị ọzọ nọ? 18Ọ bu naanị onye mba ọzọ a lọghachiri inye Chineke otuto?” 19Mgbe ahụ, ọ sịrị ya, “Bilie, laa, okwukwe gị agwọọla gị.”
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Leo Onye Ukwu, Pope na Onye nkuzi nke Chọọchị
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike