Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2027 › 11 Novemba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 11 Novemba 2027
Tọọzdee · Izu nke 32 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Tọọzdee nke izu nke 32 nke Oge Nkịtị
Ncheta · Agba ofufe: ọcha
Onye nsọ Matin nke Tours, Bishọp · Ncheta
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
Ọ dịghị na nsụgharị a
Abụ Ọma nzaghachi
89O Onyenwe anyị, okwu gị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi; ọ na-eguzosi ike nʼeluigwe. 90Ikwesi ntụkwasị obi gị na-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ; ọ bụ gị kere ụwa, ọ na-eguzosikwa ike. 91Ruo taa, iwu gị niile na-eguzosi ike, nʼihi na ihe niile na-ejere gị ozi. 130Mkpughepụ na nkọwa nke okwu gị na-enye ìhè; ọ na-eme ka ndị na-enweghị uche ghọta ihe. 135Mee ka ihuọma gị dịkwasị nʼahụ ohu gị. Kuziere m ụkpụrụ gị niile. 175Kwere ka m dịrị ndụ ka m nwee ike ito gị, ka iwu gị niile gbaa m ume.
Oziọma
20Ma mgbe ndị Farisii jụrụ ya sị, Olee mgbe alaeze Chineke ga-abịa? O kwuru, “Ọbịbịa alaeze Chineke agaghị a bụ nʼụzọ a ga-eji anya efu hụ ya. 21Ha agaghịkwa asị, ‘Lee, ọ nọ nʼebe a,’ maọbụ, ‘nʼebe ahụ,’ nʼihi nʼezie, alaeze Chineke nọ nʼetiti unu. ” 22Mgbe ahụ, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, “Oge na-abịa mgbe ọ ga-agụsi unu agụụ ike ịhụ otu nʼime ụbọchị nke Nwa nke Mmadụ, ma unu agaghị ahụ ya. 23Ha ga-asị unu, ‘Lee, nʼebe ahụ,’ maọbụ, ‘Lee, nʼebe a,’ unu agala, unu esokwala ha. 24Nʼihi na Nwa nke Mmadụ nʼụbọchị ya ga-adị ka amụma nke eluigwe nke na-enye ìhè na mbara eluigwe site nʼotu ebe ruo nʼebe nke ọzọ. 25Ma ọ ghaghị ibu ụzọ hụọ ọtụtụ ahụhụ, ọgbọ a ga-ajụkwa ya.
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Matin nke Tours, Bishọp
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike