Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2027 › 10 Novemba
Kalenda Ọtọdọks · 28 Ọktoba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 10 Novemba 2027
Wenezdee · Izu nke 21 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 3
Mmemme na ndị nsọ
Great Martyr Paraskeva (Piatnitsa) of Iconium (3rd C)
Ụbọchị obubu ọnụ
Obubu ọnụ: ya na mmanụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
18Ọ bụ ya bụ isi nke anụ ahụ ahụ bụ chọọchị. Ọ bụ ya bụ mmalite, onye mbụ a mụrụ nʼetiti ndị niile ga-esi nʼọnwụ bilie. Nke a mere ka ọ bụrụ onyeisi mbụ nʼime ihe niile. 19Nʼihi na ọ bụ nʼime ya ka ọ masịrị ozuzu oke ya ibi. 20Ọ bụ site na ya ka o ji mee ka ihe niile bịaghachikwute ya. E mere ka udo dịrị nʼetiti ya na ihe niile, maọbụ ihe dị nʼụwa, maọbụ nke dị na nʼeluigwe site na ọbara ọ wụsiri nʼelu obe. 21Unu onwe unu bụ ndị e mere ndị mba ọzọ site nʼebe Chineke nọ, na ndị iro nʼuche unu nʼihi ajọ omume niile unu. 22Ma ugbu a, o kpezierela unu site na-anụ ahụ Kraịst, sitekwa nʼọnwụ ya, iji chee unu nʼihu ya dịka ndị dị nsọ, na ndị na-enweghị ịta ụta, na ihe ebubo ọbụla megide ha. 23Ma ọ bụrụ na unu anọgide nʼokwukwe unu, bụrụ ndị gbara mgbọrọgwụ, ndị guzosiri ike, ndị na-ewezugaghị onwe ha site nʼolileanya ahụ dịrị unu nʼoziọma ahụ. Nke a bụ oziọma ahụ unu nụrụ, nke ekwusakwara nye ihe niile e kere eke nʼokpuru eluigwe, nke e mere mụ onwe m bụ Pọl, onyeozi ya.
Oziọma
9“Ya mere, agwa m unu, rịọọnụ, unu ga-arịọta, chọọnụ, unu ga-achọta, kụọkwanụ aka, a ga-emeghekwara unu ụzọ. 10Nʼihi na onye na-arịọ na-arịọta, onye na-achọ na-achọta, onye na-akụ aka nʼụzọ ka a ga-emeghekwara ụzọ. 11“Onye nʼime unu bụ nna, ka nwa ya ga-arịọ ya azụ, o nye ya agwọ? 12Maọbụ rịọọ ya akwa, ọ ga-enye ya akpị? 13Ọ bụrụ na unu bụ ndị ọjọọ, maara otu esi enye ụmụ unu onyinye dị mma, karịa nke a, Nna unu nke bi nʼeluigwe aghaghị inye ha Mmụọ Nsọ bụ ndị niile na-arịọ ya.”
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 28 Ọktoba na kalenda nzukọ bụ 10 Novemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike