Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2027 › 26 Ọktoba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 26 Ọktoba 2027

Tiuzdee · Izu nke 30 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Tiuzdee nke izu nke 30 nke Oge Nkịtị

Ụbọchị izu · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Rom 8:18–25

18Nʼikwu eziokwu, ahụhụ niile anyị na-ata ugbu a erughị ihe a ga-eji tụnyere ebube niile a ga-ekpughe nʼime anyị. 19Ihe niile e kere eke ji oke agụụ na-eche mgbe a ga-egosipụta ndị bụ ụmụ Chineke. 20Nʼihi na e tinyere ihe e kere eke nʼọnọdụ ihe na-abaghị uru, ma ọ bụghị site nʼọchịchọ nke onwe ya, kama nʼọchịchọ nke onye ahụ tinyere ya nʼọnọdụ ahụ nʼime olileanya, 21na otu ụbọchị na ha ga-enwere onwe ha site nʼagbụ nke ire ure, sorokwa keta oke nʼebube ahụ ga-abụ nke ụmụ Chineke. 22Anyị maara na ruo ugbu a, ihe niile e kere eke na-asụ ude nʼihi ihe mgbu ha nọ nʼime ya, dịka ihe mgbu nke ọmụmụ nwa. 23Ọ bụghị naanị nke a, ma anyị onwe anyị, ndị nwere mkpụrụ mbụ nke Mmụọ Nsọ, na-asụkwa ude nʼime onwe anyị, na-echesi ike mgbe a ga-akpọbata anyị dịka ụmụ, mgbe a ga-agbapụta anụ ahụ anyị. 24Nʼihi na a zọpụtara anyị site nʼolileanya dị otu a. Ma olileanya a na-ahụ anya abụghị olileanya. Onye na-enwe olileanya mgbe ihe ọ na-ele anya ya dị ya nʼaka? 25Ma ọ bụrụ na olileanya anyị dabeere nʼihe ahụ anyị na-enwetabeghị, anyị ga-eji ndidi chere tutu ihe ahụ erute anyị aka.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 126:1–6

1Abụ nrigo. Mgbe Onyenwe anyị kpọghachitere ndị e mere ka ha lọta na Zayọn, anyị dị ka ndị na-arọ nrọ. 2Ọchị juru anyị ọnụ, abụ ọṅụ jukwara anyị ire. Mgbe ahụ, e kwukwara ya na mba niile sị, “ Onyenwe anyị emeerela ha ọtụtụ ihe dị ukwuu.” 3Onyenwe anyị emeerala anyị ọtụtụ ihe dị ukwuu, obi anyị jupụtakwara nʼọṅụ. 4Nyeghachi anyị akụnụba anyị, o Onyenwe anyị, dịka mmiri iyi na-asọ nʼala Negev. 5Ndị niile na-eji anya mmiri na-arụ ọrụ ịkụ mkpụrụ ga-emesịa jiri abụ ọṅụ wee ihe ubi ahụ. 6Onye ji ịkwa akwa buru mkpụrụ ubi ọ ga-agha na-aga, ga-emesịa jiri abụ ọṅụ na-alọghachi azụ, mgbe ha bu ukwu ọka ha.

Oziọma

Luk 13:18–21

18Ya mere, ọ na-ekwu sị, “Gịnị ka alaeze Chineke yiri? Gịnịkwa ka m ga-eji tụnyere ya? 19O yiri mkpụrụ mọstaadị nke mmadụ kụrụ nʼubi ya a gbara ogige. O toro ghọọ osisi, nke ụmụ nnụnụ na-ezukwa ike nʼalaka ya.” 20Ọzọ, ọ sịrị, “Gịnị ka m ga-eji tụnyere alaeze Chineke? 21Ọ dị ka ihe na-eko achịcha nke nwanyị gwakọtara na ọtụtụ atọ nke ụtụ ọka, tutu ruo mgbe o koro ụtụ ọka ahụ niile.”

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike