Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2027 › 26 Ọktoba

Kalenda Ọtọdọks · 13 Ọktoba (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 26 Ọktoba 2027

Tiuzdee · Izu nke 19 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 1

Mmemme na ndị nsọ

Martyrs Carpos, Papilus, Agathodoros and Agathonica, at Pergamun († 251)

Obubu ọnụ

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

Fil 1:8–14

8Chineke bụ onye akaebe m, otu agụụ unu niile si agụsi m ike site nʼịhụnanya nke Kraịst Jisọs. 9Nke a bụkwa ekpere m, ka ịhụnanya unu na-ahụrịta onwe unu na-ababiga ụba oke. Ka unu nwee ike ito eto, ruo nʼinwe mmazu na nghọta ihe niile. 10Ka unu nwee ike nwapụta ihe nke kachasị mma. Mgbe ahụ, unu ga-adị ọcha nʼenweghị ịta ụta ọbụla maka ụbọchị nke Kraịst. 11Ebe e mejupụtara unu na mkpụrụ nke ezi omume nke sitere na Jisọs Kraịst iji bulie Chineke elu ma nyekwa ya otuto. 12Ugbu a ụmụnna m, nke a bụ ihe m chọrọ ime ka unu ghọta, na nsogbu niile dakwasịrị m emeela ka ọrụ ikwusa oziọma na-aga nʼihu. 13Nʼihi na ọ pụtala ihe nye ndị nche nke ụlọeze ahụ na onye ọbụla ọzọ, na ọ bụ naanị nʼihi na m bụ onye na-eso Kraịst ka e ji tụọ m mkpọrọ. 14Site na mkpọrọ a a tụrụ m, e meela ka ọtụtụ ụmụnna anyị bụrụ ndị nwere ezi ntụkwasị obi nʼime Onyenwe anyị, nwekwa oke nkwuwa okwu, izisa oziọma ahụ na-atụghị egwu ọbụla.

Oziọma

Luk 8:1–3

1Mgbe ihe ndị a gasịrị, ọ gara nʼobodo ukwu niile na nʼobodo nta niile na-ekwusa ma na-ewetakwara ndị mmadụ oziọma nke alaeze Chineke. Ndị ozi iri na abụọ ahụ sokwa ya, 2na ụmụ nwanyị ụfọdụ ndị a chụpụrụ mmụọ ọjọọ site nʼime ha, gwọkwa ha nrịa nrịa: Meri Magdalin onye e sitere nʼime ya chụpụ mmụọ ọjọọ asaa, 3na Joana nwunye Chuza onye na-elekọta ụlọeze Herọd na akụ ya niile, na Suzana, na ọtụtụ ndị ọzọ ndị ji akụ ha na-enyere ha aka.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 13 Ọktoba na kalenda nzukọ bụ 26 Ọktoba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike