Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2027 › 27 Ọktoba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 27 Ọktoba 2027
Wenezdee · Izu nke 30 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Wenezdee nke izu nke 30 nke Oge Nkịtị
Ụbọchị izu · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
26Otu aka ahụ, Mmụọ Nsọ na-enyere anyị aka nʼime adịghị ike anyị. Nʼihi na anyị amaghị ka esi ekpe ekpere dịka o kwesiri. Ma Mmụọ Nsọ nʼonwe ya ji ịsụ ude nke ọnụ apụghị ịkọ na-arịọrọ anyị arịrịọ. 27Chineke, onye na-enyocha obi mmadụ, amarala ihe Mmụọ Nsọ bụ nʼuche. Nʼihi na Mmụọ Nsọ na-arịọrọ ndị nsọ niile arịrịọ dịka Chineke si chọọ. 28Anyị maara na ihe niile na-arụkọta ọrụ maka ọdịmma ndị hụrụ Chineke nʼanya bụ ndị a kpọrọ dịka uche nsọ ya siri dị. 29Nʼihi na ndị ahụ ọ maararị ka ọ kakwara akara ka ha nwe ụdịdị nke Ọkpara ya, ka ọ bụrụ nwa e buru ụzọ mụọ nʼetiti ọtụtụ ụmụnna. 30Ma ndị ahụ ọ kara akara, ka ọ kpọkwara; ndị ọ kpọrọ, ka ọ gụrụ na ndị ezi omume; ndị ọ gụrụ na ndị ezi omume ka o nyekwara otuto.
Abụ Ọma nzaghachi
3Lekwasị m anya, ma zaa m, O Onyenwe anyị Chineke m. Nyeghachi m ìhè nke anya m ka m ghara ịnwụ; 4mgbe ahụ onye iro m ga-asị, “Emeriela m ya,” mgbe m ga-ada, ndị kpọrọ m asị ga-aṅụrịkwa ọṅụ. 5Ma atụkwasịrị m obi nʼịhụnanya gị nke na-enweghị ọgwụgwụ; mkpụrụobi m na-aṅụrị ọṅụ na nzọpụta gị. 6Aga m abụku Onyenwe anyị abụ, nʼihi na o mesoro m mmeso ọma.
Oziọma
22O jegharịrị nʼobodo ukwu na nʼobodo nta niile na-ezi ihe, ka ọ na-aga Jerusalem. 23Otu onye sịrị ya, “Onyenwe m, ndị a ga-azọpụta ha ga-adị ole na ole?” Ọ sịrị ha, 24“Gbalịsienụ ike banye site nʼọnụ ụzọ dị warawara, nʼihi na ana m a gwa unu na ọtụtụ ga-achọ ịbanye ma ha agaghị enwe ike. 25Ọ bụrụ na nna nwe ụlọ ebilie mechie ọnụ ụzọ, unu ga-eguzo na-ezi na-akụ aka nʼụzọ na-asị, ‘Onyenwe anyị meghere anyị ụzọ.’ “Na nzaghachi, ọ ga-asị, ‘Amaghị m ebe unu si bịa.’ 26“Nʼoge ahụ, unu ga-asị, ‘Anyị na gị rikọrọ, ṅụkọkwaa, ị kuzikwara nkuzi nʼogbe anyị.’ 27“Ma ọ ga-asị, ‘Amaghị m ebe unu siri bịa. Pụọnụ nʼihu m, unu ndị ajọ omume.’ 28“Ịkwa akwa na ịta ikikere eze ga-adịkwa mgbe unu ga-ahụ Ebraham, na Aịzik na Jekọb na ndị amụma niile ka ha nọ nʼalaeze Chineke; ma unu onwe unu abụrụ ndị a chụpụrụ nʼezi. 29Ndị mmadụ ga-esite nʼọwụwa anyanwụ, nakwa ọdịda anyanwụ, na nʼugwu na ndịda nke ụwa bịa nọdụ nʼoriri nʼime alaeze Chineke. 30Ma lee, ndị bu ụzọ ga-aghọ ndị ikpeazụ, ma ndị ikpeazụ ga-aghọ ndị bu ụzọ.”
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike