Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2027 › 22 Ọktoba
Kalenda Ọtọdọks · 9 Ọktoba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 22 Ọktoba 2027
Fraịdee · Izu nke 18 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 8
Mmemme na ndị nsọ
Holy Apostle James the son of Alphæus (1st C)
Ụbọchị obubu ọnụ
Obubu ọnụ: ya na mmanụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
18Ma kpeenụ ekpere nʼime Mmụọ nʼoge niile na ụdị ekpere na arịrịọ niile. Nọọnụ na njikere mgbe niile ma nọgidekwanụ na-ekpere ndị nsọ niile ekpere oge niile. 19Na-echetakwanụ m nʼekpere, ka e nye m ike nke mkwuwa okwu, m ga-eji na-ekwupụta ihe omimi nke oziọma na-atụghị egwu ọbụla, 20nke m ji maka ya bụrụ onye nnọchite anya nọ na mkpọrọ. Kperenụ m ekpere ka m kwupụta ya nʼatụghị egwu ọbụla dị ka m kwesiri ikwu. 21Ugbu a, iji mee ka unu mara otu m dị na ihe m na-eme, Taịkikọs, nwanna m hụrụ nʼanya na nwaodibo kwesiri ntụkwasị obi nʼime Onyenwe anyị ga-akọrọ unu ihe niile. 22Ana m ezitere ya unu nʼihi nke a, ka o mee ka unu mata ọnọdụ anyị nakwa ka ọ gbaa unu ume. 23Ka udo na ịhụnanya, tinyere okwukwe nke sitere na Chineke Nna na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịịrị unu ụmụnna. 24Ka amara dịnyere ndị niile ji ịhụnanya na-adịghị anwụ anwụ hụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nʼanya.
Oziọma
31Ọ gara nʼihu sị ha, “Ma gịnị ka m ga-eji tụnyere ndị bi nʼọgbọ a? Gịnị ka ha yiri? 32Ha dị ka ụmụntakịrị nọ nʼọma ahịa na-akpọ ibe ha oku na-asị, “ ‘Anyị gburu unu ọja, ma unu adịghị ete egwu. Anyị bụrụ abụ ịkwa ozu, ma unu ebeghị akwa.’ 33Nʼihi na Jọn omee baptizim bịara na-erighị achịcha maọbụ ṅụọ ihe ọṅụṅụ ma unu sịrị, ‘Mmụọ ọjọọ bi nʼime ya.’ 34Nwa nke Mmadụ bịara na-eri ihe oriri na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ, ma unu sịrị, ‘Lee, onye oke oriri na onye oke aṅụmaṅụ, enyi ndị ọna ụtụ na ndị mmehie.’ 35Ma e sitela nʼụmụ ya niile nwapụta amamihe nʼonye ziri ezi.”
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 9 Ọktoba na kalenda nzukọ bụ 22 Ọktoba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike