Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2027 › 17 Ọktoba
Kalenda Ọtọdọks · 4 Ọktoba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 17 Ọktoba 2027
Sọnde · Olu 8
Mmemme na ndị nsọ
Sọnde nke 17 mgbe Pentikọọsụ gasịrị
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Oziọma ofufe ụtụtụ nke 6
36Mgbe ha ka na-ekwu banyere nke a, ya onwe ya guzooro nʼetiti ha sị ha, “Udo dịrị unu.” 37Oke egwu tụrụ ha, obi lọkwara ha mmiri nʼihi na ha chere na ha ahụla mmụọ. 38Ma ọ sịrị ha, “Gịnị mere ụjọ ji atụ unu, gịnị mere unu ji nwee obi abụọ? 39Leenụ m anya nʼaka na nʼụkwụ. Ọ bụ mụ onwe m! Metụnụ m aka ka unu hụrụ, nʼihi na mmụọ adịghị enwe anụ ahụ na ọkpụkpụ dị ka unu hụrụ m nwere.” 40Mgbe o kwuchara nke a, o gosiri ha aka ya na ụkwụ ya. 41Ma dị ka o siiri ha ike ikwere nʼihi ọṅụ na oke mgbagwoju anya, ọ sịrị ha, “Ọ dị ihe oriri unu nwere ebe a?” 42Ha nyere ya otu ntakịrị azụ a mịkpọrọ amịkpọ. 43Ma ọ naara ya rie ya nʼihu ha. 44Mgbe ahụ, ọ sịrị ha, “Okwu ndị a ka m gwara unu mgbe mụ na unu nọ, na ihe niile e dere nʼiwu Mosis na ndị Amụma na nʼAbụ Ọma banyere m ga-emezucha.” 45Mgbe ahụ, o meghere akọnuche ha ka ha ghọta akwụkwọ nsọ. 46Ọ sịrị ha, “Nke a bụ ihe e dere na, Kraịst ahụ ga-ahụ ahụhụ ma sitekwa nʼọnwụ bilie nʼụbọchị nke atọ. 47Na a ga-ekwusa nchegharị na mgbaghara mmehie site nʼaha ya nye mba niile, malite na Jerusalem. 48Unu bụ ndị akaebe nke ihe ndị a. 49Ma lee, agaje m izitere unu ihe ahụ Nna m kwere na nkwa. Ya mere, nọrọnụ nʼime obodo ruo mgbe a ga-eyikwasị unu ike nke si nʼelu.” 50O duuru ha garuo na Betani, chilie aka ya abụọ elu gọzie ha. 51Dị ka ọ na-agọzi ha, ọ sitere nʼebe ha nọ pụọ, e weliri ya elu, baa nʼeluigwe. 52Mgbe ahụ, ha fere ya ofufe jiri oke ọṅụ laghachi na Jerusalem. 53Ha nọgidere nʼụlọnsọ ukwu ahụ na-eto Chineke oge niile.
Akwụkwọ ozi
16Gịnị bụ ihe jikọtara ụlọnsọ Chineke na arụsị? Nʼihi na anyị onwe anyị bụ ụlọnsọ Chineke dị ndụ. Dịka Chineke kwuru, “M ga-ebi nʼime ha. Jegharịakwa nʼime ha. M ga-abụkwa Chineke ha, ma ha onwe ha ga-abụkwa ndị nke m.” 17Ya mere, “Sinụ nʼetiti ha pụta. Nọpụkwanụ iche nʼebe ha nọ. Otu a ka Onyenwe anyị kwuru. Unu emetụkwala ihe ọbụla rụrụ arụ aka. Mụ onwe m ga-akpọbatakwa unu.” 18Ma, “Aga m abụrụ unu Nna, unu onwe unu ga-abụkwara m ụmụ m ndị ikom na ndị inyom. Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.” 7:1Ya mere, ndị enyi m, ebe anyị nwere nkwa ndị a niile, ka anyị debe onwe anyị ọcha nʼime ihe niile ọbụla nke na-emerụ ahụ anyị na mmụọ anyị. Ka anyị mezuo ịdị nsọ nʼịtụ egwu Chineke.
Oziọma
31Dịka unu si chọọ ka ndị mmadụ mesoo unu, sitekwanụ otu a na-emeso ha. 32“Ọ bụrụ naanị ndị hụrụ unu nʼanya ka unu na-ahụ nʼanya, gịnị ga-abụ uru unu? Nʼihi na ọbụladị ndị mmehie, ọ bụ ndị hụrụ ha nʼanya ka ha na-ahụkwa nʼanya. 33Ọ bụrụkwa naanị ndị na-emere unu ihe ọma ka unu na-emere ihe ọma, gịnị ga-abụ uru unu? Nʼihi na ndị mmehie na-enyekwara ndị na-enyere ha aka aka. 34Ọ bụrụkwa na unu agbazinye naanị ndị nwere ike ịkwụghachi unu ihe, gịnị ga-abụ uru unu? Nʼihi na ndị mmehie na-agbazinyekwa ndị mmehie ibe ha na-atụ anya ka a kwụghachikwa ha nʼozuzu oke. 35Hụnụ ndị iro unu nʼanya, na-emekwa ezi ihe nye ha, gbazinyenụ ndị nọ na mkpa ihe ha chọrọ, na-eleghị anya na ha ga-akwụghachi unu. Mgbe ahụ, ụgwọ ọrụ unu ga-adị ukwuu, unu ga-egosikwa na unu bụ ụmụ nke Onye kachasị ihe niile elu, nʼihi na ebere ya na-adịrị ndị ajọ omume na ndị na-enweghị mmụọ ekele nʼime ha. 36Nweenu obi ebere dị ka Nna unu si nwee obi ebere.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 4 Ọktoba na kalenda nzukọ bụ 17 Ọktoba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike